Ndị Hibru 1:1-14
1 Chineke, onye si n’ọtụtụ ụzọ gwa nna nna anyị hà okwu ọtụtụ mgbe+ n’ogologo oge gara aga site n’ọnụ ndị amụma,+
2 agwawo anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a+ site n’ọnụ Ọkpara ya,+ onye ọ họpụtara ka ọ bụrụ onye nketa nke ihe niile,+ onye o sikwa n’aka ya mee+ usoro ihe dị iche iche.
3 Ọ bụ onyinyo nke ebube+ ya. O yikwara ya kpọmkwem.+ Ọ na-ejikwa okwu ya dị ike eme ka ihe niile na-adị;+ mgbe ọ sachapụsịrị mmehie anyị,+ ọ nọdụrụ ala n’aka nri+ nke Onye Ukwu ahụ n’ebe ndị dị elu.+
4 Ya mere, ọ kawo ndị mmụọ ozi mma,+ ebe o ketaworo aha+ mara mma karịa nke ha.
5 Dị ka ihe atụ, ònye n’ime ndị mmụọ ozi ka ọ gwatụworo, sị: “Ị bụ ọkpara m; mụ onwe m aghọwo nna gị taa”?+ Ònye n’ime ha ka ọ sịkwara: “Mụ onwe m ga-aghọ nna ya, ya onwe ya ga-aghọkwa ọkpara m”?+
6 Ma mgbe ọ na-akpọbata Nwa Mbụ ya+ n’elu ụwa mmadụ bi ọzọ, ọ sịrị: “Ka ndị mmụọ ozi niile nke Chineke+ kpọọrọ ya isiala.”+
7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi, sị: “O mere ka ndị mmụọ ozi ya bụrụ mmụọ, meekwa ka ndị ya na-ejere ọha mmadụ ozi bụrụ ire ọkụ.”+
8 Ma ọ sịrị Ọkpara ahụ: “Chineke bụ ocheeze gị ruo mgbe niile ebighị ebi,+ mkpanaka alaeze+ gị bụkwa mkpanaka nke izi ezi.+
9 Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị. Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji were mmanụ aṅụrị tee gị+ karịa ndị ibe gị.”+
10 Ọ sịkwara: “Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa ná mmalite, eluigwe niile bụkwa ọrụ aka gị.+
11 Ha onwe ha ga-ala n’iyi, ma gị onwe gị ga-anọgide mgbe niile; ha niile ga-akakwa nká dị ka uwe elu,+
12 ị ga-afụkọtakwa ha dị nnọọ ka ákwà mgbokwasị,+ dị ka uwe elu; a ga-agbanwekwa ha, ma ị ka bụ onye ị bụ, afọ ndụ gị agaghịkwa agwụ agwụ.”+
13 Ma ọ̀ bụ onye n’ime ndị mmụọ ozi ka ọ gwatụworo, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị”?+
14 Ọ̀ bụ na ha niile abụghị ndị mmụọ+ na-ejere ọha mmadụ ozi,+ ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa+ nzọpụta ozi?