Ndị Filipaị 1:1-30

1  Pọl na Timoti, ndị ohu+ Kraịst Jizọs, na-edetara unu ndị nsọ niile ha na Kraịst Jizọs dị n’otu bụ́ ndị nọ na Filipaị akwụkwọ,+ tinyere ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi:+  Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu.+  Ana m ekele Chineke m mgbe niile n’oge ọ bụla m chetara unu+  n’arịrịọ niile m na-arịọsi ike n’ihi unu niile,+ mgbe m ji ọṅụ na-arịọsi arịrịọ ike,  n’ihi ọrụ unu rụworo+ n’ịgbasa ozi ọma malite n’ụbọchị mbụ ruo ugbu a.  N’ihi na enwere m obi ike na onye malitere ọrụ ọma n’ebe unu nọ ga-arụzu+ ya ruo n’ụbọchị+ nke Jizọs Kraịst.  O ziri nnọọ ezi na m nwere echiche dị otú a banyere unu niile, n’ihi na ebu m unu n’obi,+ ebe unu niile bụ ndị mụ na ha na-eketakọ+ obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ, ma n’agbụ ụlọ mkpọrọ+ m ma n’ịkwado+ ozi ọma na iji iwu+ mee ka o guzosie ike.  N’ihi na Chineke bụ onye akaebe m banyere otú agụụ unu si na-agụsi m ike n’ụdị obi ọmịiko+ ahụ Kraịst Jizọs nwere.  Ihe m na-ekpe n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abawanye ụba,+ ka unu nweekwa ezi ihe ọmụma+ na nghọta zuru ezu;+ 10  ka unu wee chọpụta ihe ndị ka mkpa,+ ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ,+ gharakwa ịbụ ndị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ+ ruo ụbọchị nke Kraịst, 11  ka unu wee jupụta ná mkpụrụ ezi omume,+ nke si n’aka Jizọs Kraịst, iji wetara Chineke otuto na ịja mma.+ 12  Ma achọrọ m ka unu mara, ụmụnna m, na ihe mere m emewo ka ozi ọma+ na-aga n’ihu kama ime ka ọ ghara ịga n’ihu, 13  nke mere na Ndị Nche Eze niile na ndị niile ọzọ+ amarawo nke ọma+ banyere agbụ e kere+ m n’ihi Kraịst; 14  ebe agbụ ụlọ mkpọrọ m meworo ka ihe ka ọtụtụ n’ụmụnna n’ime Onyenwe anyị nwee obi ike, ha na-egosi obi ike karị n’ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.+ 15  N’eziokwu, ụfọdụ na-ekwusa Kraịst n’ihi anyaụfụ na ịma aka,+ ma ndị ọzọ ji ezi obi na-ekwusa ya.+ 16  Ndị nke abụọ a na-ekwusa Kraịst n’ihi ịhụnanya, n’ihi na ha maara na m dị njikere n’ebe a ịgbachitere+ ozi ọma ahụ; 17  ma ndị nke mbụ na-eme ya n’ihi esemokwu,+ ọ bụghị n’ebumnobi dị ọcha, n’ihi na ihe ha chọrọ bụ ịkpalitere m mkpagbu+ n’agbụ ụlọ mkpọrọ m. 18  Ọ̀ dị ihe o mere? Ọ dịghị, ọ bụ naanị na a na-ekwusa Kraịst+ n’ụzọ ọ bụla, ma ọ bụ n’aghụghọ+ ma ọ bụ n’eziokwu, ana m aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ya. N’eziokwu, m ga na-aṅụrị ọṅụ, 19  n’ihi na amaara m na nke a ga-eme ka a zọpụta m site n’arịrịọ unu na-arịọsi ike,+ sitekwa na mmụọ Jizọs Kraịst nke a ga-enye m,+ 20  dị ka m na-atụsi anya ike,+ dịkwa ka olileanya+ m nwere si dị, a gaghị emenye m ihere+ n’ụzọ ọ bụla, kama site n’oké nkwuwa okwu,+ a ga-eto Kraịst ugbu a site n’ahụ́ m,+ dị ka a na-eme mgbe niile n’oge gara aga, ma ọ bụ site ná ndụ ma ọ bụ site n’ọnwụ.+ 21  N’ihi na n’ebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst,+ ịnwụ anwụ+ bụkwa uru. 22  Ma ọ bụrụ na mụ anọgide dịrị ndụ n’anụ ahụ́, ọ bụ nke a bụ mkpụrụ nke ọrụ m ga-amịpụta+—ma ekwubeghị m nke m ga-ahọrọ. 23  Ihe abụọ ndị a na-enye m nsogbu;+ ma ihe m chọrọ bụ ntọhapụ na iso Kraịst nọrọ,+ n’ihi na, n’ezie, nke a ka nnọọ mma.+ 24  Otú ọ dị, ọ dị mkpa karị ka m nọgide n’anụ ahụ́ n’ihi unu.+ 25  Ya mere, ebe m nwere obi ike n’ihe a, amaara m na m ga-anọgide,+ m ga-anọnyekwara unu niile ka unu wee nwee ọganihu+ na ọṅụ nke na-abịa site n’okwukwe unu, 26  ka aṅụrị unu wee jubiga ókè n’ime Kraịst Jizọs n’ihi m site n’ọnụnọ m ga-anọ ọzọ n’etiti unu. 27  Ma na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị+ ozi ọma banyere Kraịst, ka m wee nụ ihe banyere unu, ma m̀ bịara hụ unu ma ọ̀ bụ na mụ anọghị ya, na unu guzosiri ike n’otu mmụọ, jiri otu mkpụrụ obi+ na-agbakọ mbọ maka okwukwe nke sitere n’ozi ọma, 28  gharakwa ịbụ ndị ndị na-emegide unu+ na-emenye ụjọ n’ụzọ ọ bụla. Ihe a bụụrụ ha ihe na-egosi na a ga-ebibi ha, ma bụrụ ihe na-egosi na a ga-azọpụta unu;+ ihe àmà a sikwa n’aka Chineke, 29  n’ihi na ọ bụ unu ka e nyere ihe ùgwù ahụ n’ihi Kraịst, ọ bụghị naanị ka unu nwee okwukwe+ n’ebe ọ nọ, kama ka unu taakwa ahụhụ+ n’ihi ya. 30  N’ihi na unu na-agba otu mgba ahụ unu hụrụ na m na-agba,+ nke unu nụkwara ugbu a na m na-agba.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji