Maịka 4:1-13

4  Ọ ga-eru n’oge ikpeazụ+ na a ga-eme ka ugwu+ nke ụlọ+ Jehova guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile, a ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile;+ ndị dị iche iche ga-enubakwa n’ime ya.+  Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb;+ ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya,+ anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+  Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti ọtụtụ ndị,+ doziekwara+ mba dị iche iche dị ike, ndị dị n’ebe dị anya,+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+  Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji;+ n’ihi na ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuwo ya.+  N’ihi na ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya;+ ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị+ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+  “N’ụbọchị ahụ, m ga-achịkọta ndị na-ete ụkwụ;+ m ga-akpọkọtakwa ndị a chụsasịrị achụsasị,+ bụ́ ndị m nyere ntaramahụhụ,” ka Jehova kwuru.  M ga-emekwa ka ndị ahụ na-ete ụkwụ fọdụ,+ meekwa ka ndị ahụ a chịgara n’ebe dị anya bụrụ mba dị ike;+ Jehova ga-achịkwa ha dị ka eze n’Ugwu Zayọn, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.+  “Ma gị onwe gị, ụlọ nche nke ìgwè atụrụ, ugwu nke ada bụ́ Zayọn,+ ọ ga-erute n’ebe ị nọ, ee, alaeze mbụ ga-abịa,+ bụ́ alaeze nke ada bụ́ Jeruselem.+  “Gịnịzi mere i ji na-eti mkpu n’oké olu?+ Ọ̀ bụ na e nweghị eze nọ n’ime gị, ka onye ndụmọdụ gị ọ̀ nwụwo, nke mere ahụ́ ji na-afụ gị ụfụ dị ka nwaanyị na-amụ nwa?+ 10  Nọrọ n’oké ihe mgbu, gị ada bụ́ Zayọn, dị ka nwaanyị nke na-amụ nwa,+ n’ihi na ị ga-esi n’obodo pụọ, ị ga-ebikwa n’ọhịa.+ Ị ga-erukwa Babịlọn.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka a ga-anapụta gị.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova ga-agbapụta gị n’aka ndị iro gị.+ 11  “A ga-achịkọta ọtụtụ mba ibuso gị agha, bụ́ mba ndị ahụ na-asị, ‘Ka e metọọ ya, ka anya anyị legidekwa Zayọn.’+ 12  Ma ha onwe ha amaghị echiche Jehova, ha aghọtaghịkwa nzube ya;+ n’ihi na ọ ga-achịkọta ha dị ka ùkwù ọka* a ka gbutere egbute, nke e bu aga n’ebe nzọcha ọka.+ 13  “Bilie, zọchaa mkpụrụ, gị ada bụ́ Zayọn;+ n’ihi na m ga-agbanwe mpi gị ka ọ bụrụ ígwè, m ga-agbanwekwa akpụkpọ ụkwụ gị ka ọ bụrụ ọla kọpa, ị ga-egweri ọtụtụ ndị;+ ị ga-enyekwa Jehova uru na-ezighị ezi ha ritere dị ka ihe a machibidoro n’iwu,+ nyekwa ezi Onyenwe ụwa dum akụ̀ ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali