Levitikọs 9:1-24
9 O wee ruo n’ụbọchị nke asatọ+ na Mozis kpọrọ Erọn na ụmụ ya nakwa ndị okenye Izrel.
2 O wee sị Erọn: “Kpụtara onwe gị otu nwa ehi maka àjà mmehie+ nakwa otu ebule maka àjà nsure ọkụ,+ ndị ahụ́ dị mma, chee ha n’ihu Jehova.+
3 Ma ị ga-agwa ụmụ Izrel, sị, ‘Kpụtanụ otu mkpi+ maka àjà mmehie, kpụtakwanụ otu nwa ehi na otu nwa ebule,+ ndị gbara otu afọ otu afọ, ndị ahụ́ dị mma, maka àjà nsure ọkụ,
4 kpụtakwanụ otu oké ehi na otu ebule maka àjà udo+ ka e were ha chụọ àjà n’ihu Jehova, tinyere àjà ọka*+ nke a gwara mmanụ, n’ihi na ọ bụ taa ka Jehova ga-apụta ìhè n’ihu unu.’”+
5 Ha wee were ihe Mozis nyere ha n’iwu bịa n’ihu ụlọikwuu nzute. Nzukọ ahụ dum wee bịaruo nso wee guzo n’ihu Jehova.+
6 Mozis wee sị: “Nke a bụ ihe Jehova nyere unu n’iwu ka unu mee, ka ebube Jehova wee pụta ìhè n’ihu unu.”+
7 Mozis wee sị Erọn: “Garuo nso n’ebe ịchụàjà ma chụọ àjà mmehie+ gị na àjà nsure ọkụ gị wee kpuchie mmehie+ gị na mmehie ụlọ gị; chụọkwara ndị Izrel àjà+ ha wee kpuchie mmehie ha,+ dị ka Jehova nyere n’iwu.”
8 Ozugbo, Erọn garuru nso n’ebe ịchụàjà wee gbuo nwa ehi àjà mmehie ahụ nke bụ́ maka onwe ya.+
9 Ụmụ Erọn wee butere ya ọbara ya,+ o wee rụnye mkpịsị aka ya n’ọbara+ ahụ tee ya na mpi ebe ịchụàjà ahụ,+ ọ wụsakwara nke fọdụrụ n’ọbara ahụ n’ala ebe ịchụàjà ahụ.
10 O wee suree abụba+ na akụrụ na abụba dị n’elu imeju nke anụ àjà mmehie ahụ n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà,+ dị ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
11 O wee kpọọ anụ ya na akpụkpọ ya ọkụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu.+
12 O wee gbuo anụ àjà nsure ọkụ ahụ, ụmụ Erọn wee bunye ya ọbara ya, o wee fesa ya gburugburu n’elu ebe ịchụàjà.+
13 Ha wee bunye ya anụ àjà nsure ọkụ ahụ a bọrisịrị abọrisị nakwa isi ya, o wee suree ha n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà.+
14 Ọ sakwara eriri afọ ya na ụkwụ ya wee suree ha n’ọkụ n’elu anụ àjà nsure ọkụ ahụ, n’elu ebe ịchụàjà.+
15 O wee malite ịchụrụ ụmụ Izrel àjà ha,+ o wee kpụrụ ewu àjà mmehie ahụ nke bụ́ maka ụmụ Izrel gbuo ya ma were ya chụọ àjà maka mmehie dị ka o mere na nke mbụ.
16 O wee kpụpụta anụ àjà nsure ọkụ ahụ ma mee ya dị ka e si eme ya.+
17 O wee weta àjà ọka ahụ,+ kpojuo ya aka ma suree ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ.+
18 E mesịa, o gburu oké ehi na ebule àjà udo+ ahụ ndị bụ́ maka ndị Izrel. Ụmụ Erọn wee bunye ya ọbara anụ ndị ahụ, o wee fesa ya gburugburu n’elu ebe ịchụàjà.+
19 Ma abụba+ oké ehi ahụ na ọdụ ebule ahụ nke bụ́ abụba abụba+ na abụba kpuchiri eriri afọ ya na akụrụ ya na abụba kpuchiri imeju ya,
20 ha tụkwasịrị abụba ndị ahụ n’elu obi anụ ndị ahụ,+ wee suree abụba ndị ahụ n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà.
21 Ma Erọn fegharịrị obi ha na ụkwụ aka nri ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova, dị ka Mozis nyere n’iwu.
22 Erọn wee chịlie aka ya chee ụmụ Izrel wee gọzie ha+ wee si n’ịchụ àjà mmehie ahụ na àjà nsure ọkụ ahụ na àjà udo ahụ gbadata.+
23 N’ikpeazụ, Mozis na Erọn banyere n’ụlọikwuu nzute wee pụta gọzie ndị Izrel.+
Ebube Jehova wee pụta ìhè n’ihu ha niile,+
24 ọkụ wee si n’ihu Jehova+ pụta malite irepịa àjà nsure ọkụ ahụ na abụba ndị ahụ dị n’elu ebe ịchụàjà. Mgbe ha niile hụrụ ya, ha malitere iti mkpu+ wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.