Levitikọs 4:1-35
4 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
2 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi+ emehie n’amaghị ama+ site n’ime nke ọ bụla n’ime ihe Jehova nyere iwu ka a ghara ime:
3 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ onye nchụàjà, bụ́ onye e tere mmanụ,+ mehiere+ wee wetara ụmụ Izrel ikpe ọmụma, ọ ga-enye Jehova nwa oké ehi nke ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie o mere.+
4 Ọ ga-akpụta ehi ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ n’ihu Jehova ma bikwasị aka n’isi ehi ahụ,+ ọ ga-egbukwa ehi ahụ n’ihu Jehova.
5 Onye nchụàjà, bụ́ onye e tere mmanụ,+ ga-eweretụ ọbara ehi ahụ weta ya n’ime ụlọikwuu nzute;
6 onye nchụàjà ahụ ga-arụnye mkpịsị aka ya+ n’ọbara ahụ ugboro asaa wee fesa ọbara ahụ n’ala ugboro asaa+ n’ihu Jehova n’ihu ákwà mgbochi nke ebe nsọ ahụ.
7 Onye nchụàjà ga-etesa ọbara ahụ na mpi+ ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova, bụ́ nke dị n’ụlọikwuu nzute, ọ ga-awụsakwa nke fọdụrụ n’ọbara ehi ahụ n’ala+ ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ, bụ́ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.
8 “‘Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’ehi àjà mmehie ahụ, bụ́ abụba kpuchiri eriri afọ ya, abụba niile dị n’elu eriri afọ ya,+
9 tinyere akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha, ya bụ, abụba dị n’úkwù ya. Ọ ga-ewepụtakwa abụba dị n’elu imeju ya, ya na akụrụ ya.+
10 Ọ ga-abụ otu ihe ahụ n’ihe a na-ewepụta n’ehi àjà udo.+ Onye nchụàjà ga-esure ha n’ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ.+
11 “‘Ma akpụkpọ ehi ahụ na anụ ya dum, tinyere isi ya na ụkwụ ya na eriri afọ ya na nsị ya,+
12 ọ ga-ahụ na e bupụrụ ha dum ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu+ wee buga ha n’ebe dị ọcha, n’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara,+ ọ ga-atụkwasị ha n’elu nkụ kpọọ ha ọkụ.+ N’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara ka a ga-akpọ ha ọkụ.
13 “‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel dum emehie,+ ma ọgbakọ ahụ amaghị na ha mere ihe ahụ, bụ́ otu n’ime ihe niile Jehova nyere iwu ka a ghara ime bụ́ nke ha mere wee bụrụ ndị ikpe mara,+
14 e wee mata mmehie ha mere n’imebi otu n’ime iwu ndị a,+ ọgbakọ ahụ ga-eweta nwa ehi ka ọ bụrụ àjà mmehie, ha ga-eweta ya n’ihu ụlọikwuu nzute.
15 Ndị okenye nke nzukọ ahụ ga-ebikwasị aka n’isi ehi ahụ+ n’ihu Jehova, a ga-egbukwa ehi ahụ n’ihu Jehova.
16 “‘Onye nchụàjà, bụ́ onye e tere mmanụ,+ ga-eweretụ ọbara ehi ahụ weta ya n’ụlọikwuu nzute.+
17 Onye nchụàjà ga-arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ ugboro asaa wee fesa ya n’ala ugboro asaa n’ihu Jehova, n’ihu ákwà mgbochi.+
18 Ọ ga-etesa ọbara ahụ na mpi ebe ịchụàjà+ nke dị n’ihu Jehova, bụ́ nke dị n’ụlọikwuu nzute; ma ọ ga-awụsa nke fọdụrụ n’ime ọbara ahụ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ,+ bụ́ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.
19 Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’ehi ahụ, ọ ga-esurekwa ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà.+
20 Ọ ga-eme ehi ahụ dị ka o mere ehi àjà mmehie ahụ. Otú ahụ ka ọ ga-eme ya; onye nchụàjà ga-ekpuchiri ha mmehie ha,+ a ga-agbaghara ha ya.
21 Ọ ga-ahụ na e bupụrụ ehi ahụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu ma kpọọ ya ọkụ, dị nnọọ ka ọ kpọrọ ehi mbụ ahụ ọkụ.+ Ọ bụ àjà mmehie maka ọgbakọ ahụ.+
22 “‘Mgbe onyeisi+ mere mmehie, o wee mee otu n’ime ihe niile Jehova bụ́ Chineke ya nyere n’iwu ka a ghara ime+ wee bụrụ onye ikpe mara,
23 ma ọ bụ na e mere ka ọ mata iwu o mebiri,+ ọ ga-eweta nwa mkpi,+ nke ahụ́ dị mma, ka ọ bụrụ àjà ya.
24 Ọ ga-ebikwasị aka n’isi+ nwa mkpi ahụ wee gbuo ya n’ebe a na-egbu anụ àjà nsure ọkụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ àjà mmehie.+
25 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụta ọbara anụ àjà mmehie ahụ tee ya na mpi+ ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ, ọ ga-awụsakwa nke fọdụrụ n’ọbara ya n’ala ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ.
26 Ọ ga-esure abụba ya niile n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà dị ka e mere abụba àjà udo ahụ;+ onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya,+ a ga-agbaghara ya.
27 “‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi ọ bụla n’etiti ndị bi n’ala a emehie n’amaghị ama site n’ime otu n’ime ihe Jehova nyere iwu ka a ghara ime wee bụrụ onye ikpe mara,+
28 ma ọ bụ na e mere ka ọ mata mmehie o mere, mgbe ahụ, ọ ga-eweta obere nne+ ewu, nke ahụ́ dị mma, a ga-eji chụọ àjà maka mmehie o mere.
29 Ọ ga-ebikwasị aka n’isi+ anụ àjà mmehie ahụ wee gbuo anụ àjà mmehie ahụ n’otu ebe ahụ a na-egbu anụ àjà nsure ọkụ.+
30 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụta ọbara ya tee ya na mpi+ ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ, ọ ga-awụsakwa nke fọdụrụ n’ọbara ya n’ala ebe ịchụàjà.+
31 Ọ ga-ewepụta abụba ya niile,+ dị ka e wepụtara n’anụ àjà udo ahụ;+ onye nchụàjà ga-esure ya n’ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Jehova;+ onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, a ga-agbaghara ya.+
32 “‘Ma ọ bụrụ nwa atụrụ+ ka ọ ga-eweta ka ọ bụrụ àjà mmehie, ọ bụ nke nne ahụ́ dị mma+ ka ọ ga-eweta.
33 Ọ ga-ebikwasị aka n’isi anụ àjà mmehie ahụ wee gbuo ya dị ka àjà mmehie n’ebe a na-egbu anụ àjà nsure ọkụ.+
34 Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụta ọbara anụ àjà mmehie ahụ tee ya na mpi ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ,+ ọ ga-awụsakwa nke fọdụrụ n’ọbara ya n’ala ebe ịchụàjà.
35 Ọ ga-ewepụta abụba ya niile dị ka a na-ewepụta abụba nwa ebule àjà udo, onye nchụàjà ga-esurekwa ha n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, n’elu àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova;+ onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie o mere,+ a ga-agbaghara ya.+