Levitikọs 27:1-34
27 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ekwe nkwa pụrụ iche+ inye Jehova mkpụrụ obi dị ka ọnụ ahịa e kpebiri si dị,
3 ọnụ ahịa a ga-ekpebi maka nwoke gbara malite n’afọ iri abụọ ruo afọ iri isii ga-abụ shekel ọlaọcha iri ise ma e jiri shekel ebe nsọ tụọ ya.
4 Ma ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị, ọnụ ọhịa a ga-ekpebi ga-abụ shekel iri atọ.
5 Ọ bụrụ na ọ gbara malite n’afọ ise ruo afọ iri abụọ, ọnụ ahịa a ga-ekpebi maka nwoke ga-abụ shekel iri abụọ, shekel iri maka nwaanyị.
6 Ọ bụrụ na ọ gbara malite n’otu ọnwa ruo afọ ise, ọnụ ahịa a ga-ekpebi maka nwoke ga-abụ shekel ọlaọcha ise,+ ọnụ ahịa a ga-ekpebi maka nwaanyị ga-abụ shekel ọlaọcha atọ.
7 “‘Ọ bụrụ na ọ gbara malite n’afọ iri isii gbagowe, ọ bụrụ na ọ bụ nwoke, ọnụ ahịa a ga-ekpebi ga-abụ shekel iri na ise, shekel iri maka nwaanyị.
8 Ma ọ bụrụ na ọ daa ogbenye nke na ọ gaghị akwụli ọnụ ahịa e kpebiri,+ ọ ga-eme ka onye ahụ guzo n’ihu onye nchụàjà, onye nchụàjà ga-ekwu ihe ọ ga-akwụ.+ Onye nchụàjà ga-ekwu ihe ọ ga-akwụ dabere n’ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụli.+
9 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ anụmanụ, ụdị nke mmadụ na-enye Jehova n’onyinye, nke ọ bụla o nyere Jehova ga-aghọ ihe dị nsọ.+
10 Ọ gaghị eji ọzọ dochie ya, ọ gaghịkwa eji nke dị njọ gbanwere ya ma ọ bụ jiri nke dị mma gbanwere ya. Ma ọ bụrụ na o jiri anụ ọzọ gbanwere anụ ahụ, anụ ahụ a gbanwere agbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, anụ ahụ e jikwa gbanwere ya ga-aghọ ihe dị nsọ.
11 Ọ bụrụ na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha,+ ụdị nke mmadụ na-agaghị enye Jehova n’onyinye,+ ọ ga-eme ka anụ ahụ guzoro n’ihu onye nchụàjà.+
12 Onye nchụàjà ga-ekwu ọnụ ahịa ya, ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ. Ihe ọ bụla onye nchụàjà kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya,+ ihe ahụ ka ọ ga-abụ.
13 Ma ọ bụrụ na o nwee ka o si chọọ ịgbara ya, mgbe ahụ ọ ga-atụkwasị otu ụzọ n’ụzọ ise+ nke ọnụ ahịa e kpebiri n’elu ọnụ ahịa ahụ e kpebiri.
14 “‘Ọ bụrụ na mmadụ edoo ụlọ ya nsọ ka ọ bụrụ ihe dị nsọ nye Jehova, onye nchụàjà ga-ekwu ọnụ ahịa ya, ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ.+ Ihe onye nchụàjà kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, ihe ahụ ka ọnụ ahịa ya ga-abụ.
15 Ma ọ bụrụ na onye ahụ doro ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-atụkwasị otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ole e kpebiri n’elu ego ole ahụ e kpebiri;+ ọ ga-aghọkwa nke ya.
16 “‘Ọ bụrụ na ihe mmadụ doro nsọ nye Jehova bụ ụfọdụ n’ime ala ubi bụ́ ihe nketa ya,+ a ga-ekwu ọnụ ahịa ya dabere ná mkpụrụ ole a pụrụ ịkụ na ya: ọ bụrụ na ọ bụ otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ homa,+ ọ ga-abụ mkpụrụ shekel ọlaọcha iri ise.
17 Ọ bụrụ na o doro ubi ya nsọ malite n’afọ Jubili,+ ọnụ ahịa ya ga-abụ dị ka ihe e kpebiri si dị.
18 Ọ bụrụ na ọ bụ mgbe afọ Jubili gasịrị ka o doro ubi ya nsọ, onye nchụàjà ga-agbakọrọ ya ọnụ ahịa ya dabere n’afọ ole fọdụrụ tupu afọ Jubili ọzọ eruo, a ga-esepụkwa ihe n’ọnụ ahịa e kpebiri.+
19 Ma ọ bụrụ na e nwee ka onye ahụ doro ubi ya nsọ si chọọ ịgbara ya, ọ ga-atụkwasị n’elu ya otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ole e kpebiri n’elu ego ole ahụ e kpebiri, ọ ga-aghọrịrị nke ya.+
20 Ọ bụrụ na ọ gbaraghị ya, e wee resị onye ọzọ ubi ahụ, a gaghị agbara ya agbara ọzọ.
21 Mgbe ubi ahụ ga-apụ n’aka ya n’afọ Jubili, ọ ga-aghọ ihe dị nsọ nye Jehova, dị ka ubi a raara nye.+ Ọ ga-aghọ nke onye nchụàjà.+
22 “Ọ bụrụ na o doro ubi ọ zụrụ azụ nke na-esoghị n’ala ubi bụ́ ihe nketa ya nsọ nye Jehova,+
23 onye nchụàjà ga-agbakọrọ ya ihe ga-abụ ọnụ ahịa ya ruo n’afọ Jubili, ọ ga-akwụ ọnụ ahịa ahụ e kpebiri n’ụbọchị ahụ.+ Ọ bụ ihe dị nsọ nye Jehova.+
24 N’afọ Jubili, ubi ahụ ga-alaghachi n’aka onye ọ zụrụ ya, bụ́ onye ala ahụ bụ ihe nketa ya.+
25 “‘Ọnụ ahịa ọ bụla a ga-ekwu ga-adabere na shekel ebe nsọ. Otu shekel ga-abụ gira iri abụọ.+
26 “‘Ọ bụ naanị anụmanụ e buru ụzọ mụọ, nke a mụrụ dị ka nwa mbụ nye Jehova,+ ka mmadụ na-agaghị edo nsọ. Ma ọ̀ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ, ọ bụ nke Jehova.+
27 Ọ bụrụ na o so n’anụ na-adịghị ọcha,+ o wee bụrụ na ọ ga-agbara ya dị ka ọnụ ahịa e kpebiri si dị, ọ ga-atụkwasị otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ n’elu ya.+ Ma ọ bụrụ na a gbaraghị ya, a ga-ere ya dị ka ọnụ ahịa e kpebiri si dị.
28 “‘Ma, ọ dịghị ụdị ihe ọ bụla a raara nye bụ́ ihe mmadụ raara nye Jehova maka mbibi+ n’ime ihe niile bụ́ nke ya, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ ma ọ̀ bụ ala ubi nke bụ́ ihe nketa ya, a ga-ere ere, ọ dịghịkwa ụdị ihe ọ bụla a raara nye a ga-agbara agbara.+ Ọ bụ ihe kasị nsọ nye Jehova.
29 Ọ dịghị onye a raara nye, bụ́ onye a ga-ebibi ebibi n’etiti ụmụ mmadụ, nke a ga-agbapụta agbapụta.+ A ghaghị igbu ya.+
30 “‘Otu ụzọ n’ụzọ iri ọ bụla+ nke ihe ala mepụtara, bụ́ mkpụrụ nke ala na mkpụrụ osisi, bụ nke Jehova. Ọ bụ ihe dị nsọ nye Jehova.
31 Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịgbara nke ọ bụla n’ime otu ụzọ n’ụzọ iri ya, ọ ga-atụkwasị otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ya n’elu ya.+
32 Ma n’otu ụzọ n’ime ụzọ iri ọ bụla nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na atụrụ, anụ ọ bụla na-agafe n’okpuru mkpara onye ọzụzụ atụrụ,+ nke iri ga-abụ ihe dị nsọ nye Jehova.
33 Ọ gaghị enyocha ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ, ọ gaghịkwa eji ọzọ gbanwere ya. Ma ọ bụrụ na ọ gbanwere ya, anụ ahụ na nke e ji gbanwere ya ga-aghọ ihe dị nsọ.+ A gaghị agbara ya agbara.’”
34 Iwu+ ndị a ka Jehova nyere Mozis n’Ugwu Saịnaị ka o nye ụmụ Izrel.+