Levitikọs 24:1-23
24 Jehova wee gwa Mozis okwu, sị:
2 “Nye ụmụ Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ a sụpụtara ná mkpụrụ oliv, bụ́ mmanụ a na-agwaghị agwa, maka ihe na-enye ìhè,+ ka oriọna wee na-enwu ọkụ mgbe niile.+
3 Erọn ga na-adọba ya n’usoro n’ihu Jehova mgbe niile, n’ihu ákwà mgbochi nke Ihe Àmà ahụ, n’ụlọikwuu nzute, malite ná mgbede ruo ụtụtụ. Ọ bụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka ruo ọgbọ unu niile.
4 Ọ ga na-adọba oriọna+ ndị ahụ n’usoro n’ihe ndọba oriọna+ ahụ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee n’ihu Jehova mgbe niile.+
5 “Ị ga-ewere ntụ ọka* e gwere nke ọma mee achịcha iri na abụọ. A ga-eji ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa mee nke ọ bụla n’ime ha.
6 Ị ga-edebe ha n’ahịrị abụọ, isii ga-adị n’otu ahịrị,+ n’elu tebụl e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee n’ihu Jehova.+
7 Ị ga-atụkwasịkwa frankinsens a na-agwaghị agwa n’ahịrị nke ọ bụla, ọ ga-abụkwa achịcha ncheta,+ bụ́ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova.
8 Ọ ga na-edebe ya n’usoro kwa ụbọchị izu ike n’ihu Jehova mgbe niile.+ Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka n’etiti mụ na ụmụ Izrel.
9 Ọ ga-aghọ nke Erọn na ụmụ ya,+ ha ga-eri ya n’ebe dị nsọ,+ n’ihi na ọ bụ ihe kasị nsọ nye ya nke si n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, ka ọ bụrụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.”
10 E nwere otu nwa nwoke nke nwaanyị Izrel mụrụ, onye nna ya bụ onye Ijipt.+ Ọ banyere n’ebe ụmụ Izrel nọ. Nwa nwoke ahụ nwaanyị Izrel mụrụ na onye Izrel malitere ịlụ ọgụ+ n’ebe ha mara ụlọikwuu.
11 Nwa ahụ nwaanyị Izrel mụrụ malitere ikwulu aha+ Chineke na ịkọcha ya.+ Ha wee kpọta ya n’ihu Mozis.+ Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibraị, onye si n’ebo Dan.
12 Ha wee jichie+ ya ruo mgbe a gwara ha ihe doro anya, dị ka okwu Jehova si dị.+
13 Jehova wee gwa Mozis, sị:
14 “Kpọpụta onye ahụ kwuru okwu nkọcha ahụ ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu;+ ndị niile nụrụ mgbe o kwuru ya ga-ebikwasị ya aka+ n’isi, nzukọ a dum ga-atụkwa ya nkume.+
15 Ị ga-agwakwa ụmụ Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla akọchaa Chineke ya, ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.
16 Ya mere, a ghaghị igbu onye kwuluru aha Jehova.+ Nzukọ ahụ dum aghaghị ịtụ ya nkume. A ga-egbu ma onye mbịarambịa ma nwa afọ n’ihi ikwulu aha Chineke.+
17 “‘Ọ bụrụkwa na mmadụ egbuo mkpụrụ obi ọ bụla bụ́ mmadụ, a ghaghị igbu ya.+
18 Onye gburu mkpụrụ obi bụ́ anụ ụlọ ga-akwụ ụgwọ ya, a ga-eji mkpụrụ obi kwụọ ụgwọ mkpụrụ obi.+
19 Ọ bụrụkwa na mmadụ emee ka mmadụ ibe ya nwee nkwarụ, otú o mere onye ahụ ka a ga-eme ya.+
20 Ịgbaji ọkpụkpụ ga-alara ịgbaji ọkpụkpụ, anya alaara anya, ezé alaara ezé; ụdị nkwarụ o mere ka onye ahụ nwee ka a ga-eme ka o nwee.+
21 Onye gburu anụmanụ+ ga-akwụ ụgwọ ya,+ ma a ga-egbu onye gburu mmadụ.+
22 “‘Otu mkpebi ikpe ga-adịrị unu. Onye mbịarambịa na nwa afọ ga-abụ otu,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”+
23 Mgbe e mesịrị, Mozis gwara ụmụ Izrel okwu, ha wee kpọrọ onye ahụ kwuru okwu nkọcha kpọpụta ya ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu, ha wee tụọ ya nkume.+ Ụmụ Izrel wee si otú a mee nnọọ dị ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.