Levitikọs 23:1-44
23 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka+ bụ́ ndị unu ga-akpọsa+ bụ mgbakọ dị nsọ. Ndị a bụ ememme m ndị a ga na-eme n’oge a kara aka:
3 “‘Ụbọchị isii ka a ga-arụ ọrụ, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya,+ ọ bụ mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ ụbọchị izu ike nye Jehova n’ebe niile unu bi.+
4 “‘Ndị a bụ ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka,+ mgbakọ dị nsọ,+ ndị unu ga-akpọsa n’oge ha a kara aka:+
5 N’ọnwa mbụ, n’abalị iri na anọ n’ọnwa ahụ,+ ná mgbede, ka a ga-emere Jehova ememme ngabiga.+
6 “‘Abalị iri na ise n’ọnwa a bụ ụbọchị ememme achịcha na-ekoghị eko nke a na-emere Jehova.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa.+
7 N’ụbọchị mbụ ka unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.
8 Kama unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asaa, a ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.’”
9 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
10 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu batara n’ala ahụ m ga-enye unu, unu ewee wee ihe ubi ya, unu ga-ewetara onye nchụàjà otu ùkwù ọka* nke si n’ihe mbụ+ unu wetara n’ubi unu.
11 Onye nchụàjà ga-efegharị+ ùkwù ọka ahụ n’ihu Jehova iji nwetara unu ihu ọma. N’ụbọchị na-esote ụbọchị izu ike ka onye nchụàjà ga-efegharị ya.
12 N’ụbọchị unu ga-eme ka e fegharịa ùkwù ọka ahụ, unu ga-achụ nwa ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, n’àjà, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ a chụụrụ Jehova;
13 chụọkwa ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, n’àjà, ka ọ bụrụ àjà ọka ya, dị ka àjà na-esi ísì ụtọ nke e sureere Jehova n’ọkụ; chụọkwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya n’àjà ka ọ bụrụ àjà ihe ọṅụṅụ ya.
14 Unu atala achịcha ọ bụla ma ọ bụ ọka a ṅara n’ọkụ ma ọ bụ ọka ọhụrụ ruo n’ụbọchị ahụ, ruo mgbe unu wetara onyinye unu na-enye Chineke unu. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka n’ebe niile unu ga-ebi.
15 “‘Unu ga-agụpụtara onwe unu ụbọchị izu ike asaa+ malite n’ụbọchị na-esote ụbọchị izu ike ahụ, malite n’ụbọchị unu wetara ùkwù ọka àjà a na-efegharị efegharị. Ha ga-ezu ezu.
16 Unu ga-agụ ya ruo n’ụbọchị na-esote ụbọchị izu ike nke asaa ahụ, ụbọchị iri ise,+ unu ga-ewetakwara Jehova àjà ọka ọhụrụ.+
17 Unu ga-esi n’ebe obibi unu weta ogbe achịcha abụọ+ ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị. A ga-eji ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma mee ha. A ga-eji ihe na-eko achịcha mee ha,+ ka ha bụrụ mkpụrụ mbụ kara aka nye Jehova.+
18 Unu ga-ewetakwa ogbe achịcha ndị ahụ, ha na ebule asaa ahụ́ dị mma,+ ndị gbara otu afọ otu afọ, na otu nwa ehi na ebule abụọ. Ha ga-abụ àjà nsure ọkụ a chụụrụ Jehova, ha na àjà ọka ha na àjà ihe ọṅụṅụ ha dị ka àjà a na-esure n’ọkụ, ka ha bụrụ ihe na-esi ìsì ụtọ nye Jehova.
19 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà+ ka ọ bụrụ àjà mmehie, chụọkwa ụmụ ebule abụọ ndị gbara otu afọ otu afọ n’àjà, ka ha bụrụ àjà udo.+
20 Onye nchụàjà ga-efegharị ha,+ ha na ogbe achịcha ndị ahụ e ji mkpụrụ mbụ kara aka mee, ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova, ha na ebule abụọ ahụ. Ha ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ nke dịịrị onye nchụàjà.+
21 Unu ga-eme mkpọsa+ n’ụbọchị ahụ; unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Ọ dịghị ọrụ ọ bụla siri ike unu ga-arụ. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka n’ebe niile unu ga-ebi.
22 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu, unu ewerechala ihe dị n’ọnụ ọnụ ubi unu mgbe unu na-ewe ya, unu atụtụkọtala ihe unu wefọrọ n’ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị nọ n’ahụhụ+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
23 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
24 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘N’ọnwa nke asaa,+ n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, unu ga-ezu naanị ike, ụbọchị a ga-eji ụda opi na-echeta,+ ọ bụ mgbakọ dị nsọ.+
25 Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike, unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esure n’ọkụ.’”
26 Jehova gwakwara Mozis, sị:
27 “Otú ọ dị, abalị iri n’ọnwa nke asaa nke a ga-abụ ụbọchị mkpuchi mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ, unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́,+ chụọkwara Jehova àjà+ a na-esure n’ọkụ.
28 Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a, n’ihi na ọ bụ ụbọchị mkpuchi mmehie iji kpuchiere unu mmehie+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu;
29 n’ihi na mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emekpaghị onwe ya ahụ́ n’ụbọchị a, a ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya.+
30 Mkpụrụ obi ọ bụla nke rụrụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a, m ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+
31 Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla.+ Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka n’ebe unu ga-ebi.
32 Ọ bụ ụbọchị izu ike, nke unu ga-ezu naanị ike na ya,+ unu ga-emekpakwa+ mkpụrụ obi unu ahụ́ n’ụbọchị nke itoolu n’ọnwa ahụ, ná mgbede ya. Unu ga-edebe ụbọchị izu ike unu malite ná mgbede ruo ná mgbede.”
33 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
34 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa nke a bụ ụbọchị ememme ụlọ ndò a na-emere Jehova ruo ụbọchị asaa.+
35 Ụbọchị nke mbụ bụ mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.
36 Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ,+ unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esure n’ọkụ. Ọ bụ nzukọ ukwu. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.
37 “‘Ndị a bụ ememme a na-emere Jehova n’oge a kara aka+ bụ́ ndị unu ga-akpọsa dị ka mgbakọ dị nsọ,+ maka ịchụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ:+ àjà nsure ọkụ+ na àjà ọka+ nke àjà ahụ na àjà ihe ọṅụṅụ,+ dị ka usoro a na-agbaso kwa ụbọchị si dị,
38 ma e wezụga ụbọchị izu ike niile nke Jehova,+ wezụga onyinye unu,+ wezụga onyinye niile unu kwere ná nkwa,+ wezụgakwa onyinye afọ ofufo unu niile,+ bụ́ nke unu ga-enye Jehova.
39 Otú ọ dị, n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, mgbe unu chịkọtaworo ihe ala unu mepụtara, unu ga-eme ememme+ Jehova ruo ụbọchị asaa.+ Ụbọchị nke mbụ ga-abụ ụbọchị a ga-ezu naanị ike, ụbọchị nke asatọ ga-abụkwa ụbọchị a ga-ezu naanị ike.+
40 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-aghọrọ mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, gburukwa igu nkwụ+ na alaka nke osisi ndị wara alaka na osisi pọpla nke ndagwurugwu, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa.
41 Unu ga-eme ya dị ka ememme a na-emere Jehova ruo ụbọchị asaa n’afọ.+ Nke a bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka, unu ga-eme ya n’ọnwa nke asaa.
42 Ọ bụ n’ụlọ ndò ka unu ga-ebi ruo ụbọchị asaa.+ Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi n’ụlọ ndò,+
43 ka ọgbọ unu niile wee mara+ na ọ bụ n’ụlọ ndò ka m mere ka ụmụ Izrel biri mgbe m na-akpọpụta ha n’ala Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
44 Mozis wee gwa ụmụ Izrel banyere ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.