Levitikọs 21:1-24
21 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Gwa ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn okwu, sị ha, ‘Ka onye ọ bụla ghara imerụ onwe ya n’etiti ndị ya site n’imetụ mkpụrụ obi nwụrụ anwụ aka.+
2 Ma, ọ bụrụ onye ya na ya bụ otu ọbara, onye dị ya nso, nne ya na nna ya na nwa ya nwoke na nwa ya nwaanyị na nwanne ya nwoke
3 na nwanne ya nwaanyị, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye dị ya nso, onye na-enweghị nwoke na-alụ ya, o nwere ike imerụ onwe ya.
4 Ọ gaghị emerụ onwe ya n’ihi nwaanyị a lụ alụ n’etiti ndị ya wee mee onwe ya ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ.
5 Ha agaghị akwọcha isi ha,+ ha agaghịkwa akpụchapụ ọnụ ọnụ ajị agba ha,+ ha agaghịkwa akawa ahụ́ ha.+
6 Ha ga-adị nsọ nye Chineke ha,+ ha agaghịkwa emerụ aha Chineke ha,+ n’ihi na ọ bụ ha na-esure àjà Jehova ndị a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe oriri Chineke ha;+ ha ga-adị nsọ.+
7 Ha agaghị alụ akwụna+ ma ọ bụ nwaanyị e merụrụ emerụ; ha agaghịkwa alụ+ nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm,+ n’ihi na ọ bụ onye nchụàjà dị nsọ nye Chineke ya.
8 Doo ya nsọ,+ n’ihi na ọ bụ ya na-ewetara Chineke unu ihe oriri. Ọ ga-adị nsọ nye unu,+ n’ihi na mụ onwe m Jehova, onye na-edo unu nsọ, dị nsọ.+
9 “‘Ọ bụrụ na nwa nwaanyị nke onye nchụàjà emerụọ onwe ya site n’ịgba akwụna, ọ bụ nna ya ka ọ na-emerụ. A ga-akpọ ya ọkụ.+
10 “‘Ma onye bụ́ onyeisi nchụàjà n’etiti ụmụnne ya, bụ́ onye a ga-ete mmanụ n’isi,+ nke a ga-emekwa ka o nwee ikike iyi uwe+ onyeisi nchụàjà, agaghị ahapụ isi ya n’edozighị ya edozi,+ ọ gaghịkwa adọwa uwe ya.+
11 Ọ gaghị abịa n’ebe mkpụrụ obi ọ bụla nwụrụ anwụ dị.+ Ọ gaghị emerụ onwe ya n’ihi nna ya na nne ya.
12 Ọ gaghịkwa esi n’ebe nsọ pụọ, ọ gaghịkwa emerụ ebe nsọ nke Chineke ya,+ n’ihi na ihe àmà nke nraranye, bụ́ mmanụ Chineke ya ji ete mmadụ mmanụ,+ dị n’isi ya. Abụ m Jehova.
13 “‘Ya onwe ya ga-alụkwa nwaanyị na-amaghị nwoke.+
14 Ma ọ gaghị alụ nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm na nke e merụrụ emerụ, bụ́ akwụna, kama ọ ga-alụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke site n’etiti ndị ya.
15 Ọ gaghịkwa emerụ mkpụrụ ya n’etiti ndị ya,+ n’ihi na abụ m Jehova, onye na-edo ya nsọ.’”+
16 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
17 “Gwa Erọn, sị, ‘Ọ dịghị onye ọ bụla nwere nkwarụ+ n’ime mkpụrụ gị n’ọgbọ ha niile ga-abịa nso ịchụ ihe oriri Chineke ya n’àjà.+
18 Ọ bụrụ na e nwee onye nwere nkwarụ, ọ gaghị abịa nso: nwoke kpuru ìsì ma ọ bụ nke dara ngwọrọ ma ọ bụ nke nwere imi mpịa ma ọ bụ nke otu akụkụ ahụ́ ya dị oké ogologo,+
19 ma ọ bụ nwoke ụkwụ ya gbajiri agbaji ma ọ bụ nke aka ya gbajiri agbaji,
20 ma ọ bụ nke nwere mkpumkpu azụ ma ọ bụ onye ihe mere n’anya ma ọ bụ onye akpụkpa na-ata ma ọ bụ onye nwere ọkpụisi eri ngo ma ọ bụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.+
21 Nwoke ọ bụla nwere nkwarụ nke si ná mkpụrụ Erọn onye nchụàjà agaghị abịaru nso isure àjà Jehova ndị a na-esure n’ọkụ.+ O nwere nkwarụ. Ọ gaghị abịaru nso ịchụ ihe oriri Chineke ya n’àjà.+
22 O nwere ike iri ihe oriri Chineke ya site n’ihe ndị kasị nsọ+ na ihe ndị dị nsọ.+
23 Ma ọ gaghị abataru n’ákwà mgbochi ahụ,+ ọ gaghịkwa abịaru nso n’ebe ịchụàjà,+ n’ihi na o nwere nkwarụ;+ ọ gaghịkwa emerụ ebe nsọ+ m, n’ihi na abụ m Jehova, onye na-edo ha nsọ.’”+
24 Mozis wee gwa Erọn na ụmụ ya nakwa ụmụ Izrel niile ihe ndị a.