Levitikọs 20:1-27
20 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
2 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel nakwa onye ọ bụla n’ime ndị mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’Izrel, nke nyere Molek nwa ya ọ bụla,+ a ghaghị igbu ya. Ndị ala unu ga-eji nkume tụgbuo ya.
3 Mụ onwe m ga-eche ihu m megide onye ahụ, m ga-ebipụkwa ya n’etiti ndị ya,+ n’ihi na o nyewo Molek ụfọdụ n’ime ụmụ ya iji merụọ ebe nsọ m+ nakwa iji merụọ aha nsọ m.+
4 Ọ bụrụ na ndị ala unu amara ama leghara onye ahụ anya wee ghara igbu ya mgbe o nyere Molek nke ọ bụla n’ime ụmụ ya,+
5 mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eche ihu m megide onye ahụ na ezinụlọ ya,+ m ga-ebipụkwa ya n’etiti ndị ya, bipụkwa ndị niile sonyeere ya n’inwe mmekọ rụrụ arụ,+ bụ́ ndị ha na Molek nwere mmekọ rụrụ arụ.
6 “‘Ma mkpụrụ obi nke chigharịkwuuru ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ ka o wee soro ha nwee mmekọ rụrụ arụ, m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ wee bipụ ya n’etiti ndị ya.+
7 “‘Unu ga-edo onwe unu nsọ wee bụrụ ndị dị nsọ,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
8 Unu ga-edebe ụkpụrụ m ma na-eme ha.+ Abụ m Jehova bụ́ onye na-edo unu nsọ.+
9 “‘Ọ bụrụ na e nwee onye kpọrọ nna ya na nne ya iyi,+ a ghaghị igbu ya.+ Ọ bụ nna ya na nne ya ka ọ kpọrọ iyi. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.+
10 “‘Nwoke ya na nwunye onye ọzọ kwara iko, ee, nwoke ya na nwunye mmadụ ibe ya kwara iko,+ a ghaghị igbu ya, a ga-egbu nwoke ahụ kwara iko, gbuokwa nwaanyị ahụ kwara iko.+
11 Nwoke ya na nwunye nna ya dinara ekpughewo ọtọ nna ya.+ A ghaghị igbu ha abụọ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.
12 Ọ bụrụkwa na nwoke na nwunye nwa ya edinaa, a ghaghị igbu ha abụọ.+ Ha mere ihe arụ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.+
13 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwoke ibe ya edinaa dị ka nwoke na nwaanyị si edina, ha abụọ emewo ihe arụ.+ A ghaghị igbu ha. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.
14 “‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ya na nne nwunye ya enwee mmekọahụ, ọ bụ omume rụrụ arụ.+ A ga-akpọ ya na ha ọkụ,+ ka omume rụrụ arụ+ ghara ịdịgide n’etiti unu.
15 “‘Ọ bụrụ na nwoke edinaa* anụmanụ,+ a ghaghị igbu ya, unu ga-egbukwa anụmanụ ahụ.
16 Ọ bụrụ na nwaanyị agakwuru anụmanụ ọ bụla ka ya na ya nwee mmekọ,+ unu ga-egbu nwaanyị ahụ na anụmanụ ahụ. A ghaghị igbu ha. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.
17 “‘Ọ bụrụ na nwoke edinaa nwanne ya, bụ́ nwa nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nne ya mụrụ, o wee hụ ọtọ ya, nwaanyị ahụ ahụkwa ọtọ ya, ọ bụ ihe ihere.+ Ya mere, a ga-ebipụ ha n’ihu ụmụ ndị ha. Ọ bụ ọtọ nwanne ya nwaanyị ka o kpughere. Ọ ga-aza ajụjụ maka njehie ya.
18 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị nọ ná nsọ ya edinaa, o wee kpughee ọtọ nwaanyị ahụ, nwoke ahụ ekpughewo isi ọbara nwaanyị ahụ, nwaanyị ahụ n’onwe ya ekpughewokwa ebe ọbara ya si asọpụta.+ N’ihi ya, a ga-ebipụ ha abụọ n’etiti ndị ha.
19 “‘Ekpughela ọtọ nwanne nne gị nke nwaanyị+ na ọtọ nwanne nna gị nke nwaanyị,+ n’ihi na onye mere nke a ekpugheela ọtọ onye ya na ya bụ otu ọbara.+ Ha ga-aza ajụjụ maka njehie ha.
20 Nwoke ya na nwunye nwanne nna ya dinara ekpughewo ọtọ nwanne nna ya.+ Ha ga-aza ajụjụ maka mmehie ha. Ha ga-anwụ n’amụtaghị nwa.+
21 Ọ bụrụ na nwoke edinaa nwunye nwanne ya, ọ bụ ihe a na-asọ nsọ.+ Ọ bụ ọtọ nwanne ya nwoke ka o kpughere. Ha agaghị amụta nwa.
22 “‘Debenụ ụkpụrụ m niile+ na mkpebi ikpe m niile,+ na-emekwa ha, ka ala nke m ga-akpọbata unu ka unu biri na ya ghara ịgbọpụ unu.+
23 Unu ejekwala ije n’ụkpụrụ nke mba dị iche iche m na-achụpụ n’ihu unu,+ n’ihi na ha emewo ihe ndị a niile, akpọkwara m ha asị.+
24 Ọ bụ ya mere m ji sị unu:+ “Unu onwe unu ga-enweta ala ha, mụ onwe m ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye si n’etiti ndị dị iche iche kewapụta unu.”+
25 Unu ga-akpakwa ókè n’agbata anụ dị ọcha na nke na-adịghị ọcha nakwa n’agbata anụ ufe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha;+ unu ejikwala anụ ọhịa na anụ ufe na ihe ọ bụla na-agagharị agagharị n’elu ala, bụ́ ndị m gụpụrụ agụpụ site n’ikwu na ha adịghị ọcha, mee ka mkpụrụ obi unu bụrụ ihe na-asọ oyi.+
26 Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ,+ n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova dị nsọ;+ m ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kewapụta unu ka unu bụrụ nke m.+
27 “‘Ma nwoke ma ọ bụ nwaanyị nke nwere mmụọ ịgba afa ma ọ bụ mmụọ ịkọ ọdịnihu,+ a ghaghị igbu ya.+ A ga-eji nkume tụgbuo ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.’”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “enye anụmanụ ọbara ọcha ya.”