Levitikọs 2:1-16
2 “‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi achọọ ịchụrụ Jehova àjà ọka,*+ àjà ya kwesịrị ịbụ ntụ ọka e gwere nke ọma;+ ọ ga-awụkwa ya mmanụ ma tụkwasị frankinsens n’elu ya.
2 Ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn bụ́ ndị nchụàjà, onye nchụàjà ga-ekpoju ntụ ọka ahụ e gwere nke ọma ọbụ aka ya, tinyere mmanụ ya na frankinsens ya dum; ọ ga-esure ya n’ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ihe ncheta ya,+ dị ka àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.
3 Ihe fọdụrụ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya,+ dị ka ihe kasị nsọ+ nke si n’àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.
4 “‘Ọ bụrụ na àjà ị ga-achụ bụ àjà ọka n’ụdị achịcha e ghere n’ekwú, ọ ga-abụ nke e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, achịcha na-ekoghị eko+ nke a gwara mmanụ ma ọ bụ achịcha dị fere fere na-ekoghị eko+ nke e tere mmanụ.+
5 “‘Ọ bụrụ na àjà ị ga-achụ bụ àjà ọka nke e ji ite dị mbadamba ghee,+ ọ ga-abụ nke e ji ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ghee, ọ ga-abụ nke na-ekoghị eko.
6 A ga-anyawasị ya iberibe iberibe, ị ga-awụkwa ya mmanụ.+ Ọ bụ àjà ọka.
7 “‘Ọ bụrụ na àjà ị ga-achụ bụ àjà ọka nke e ji mmanụ ghee n’ime ite nwere afọ, ọ ga-abụ nke e ji ntụ ọka e gwere nke ọma na mmanụ mee.
8 Ị ga-ewetara Jehova àjà ọka e ji ihe ndị a mee; a ga-enye ya onye nchụàjà, ọ ga-ewetakwa ya nso n’ebe ịchụàjà.
9 Onye nchụàjà ga-ekporo ụfọdụ n’ime àjà ọka ahụ ka ọ bụrụ ihe ncheta ya,+ ọ ga-esurekwa ya n’ọkụ n’ebe ịchụàjà, dị ka àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
10 Ihe fọdụrụ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya, dị ka ihe kasị nsọ n’àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
11 “‘Ọ dịghị àjà ọka unu ga-enye Jehova nke a ga-eme ka o koo eko,+ n’ihi na unu agaghị ewere ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha nakwa mmanụ aṅụ suree n’ọkụ ka ọ bụrụ àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.
12 “‘Unu ga-achụrụ ha Jehova n’àjà dị ka mkpụrụ mbụ,+ a gaghịkwa eweta ha n’elu ebe ịchụàjà ka ha bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ.
13 “‘Ị ga-etinye nnu n’àjà gị ọ bụla bụ́ àjà ọka;+ ekwela ka nnu nke ọgbụgba ndụ+ Chineke gị kọọ ụkọ n’àjà ọka gị. Mgbe ị na-eweta ihe ọ bụla ị chọrọ ịchụ n’àjà, wetakọta ya na nnu.
14 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ àjà ọka nke si ná mkpụrụ mbụ kara aka ka ị ga-enye Jehova, ị ga-enye oko ọka na-akpọbeghị akpọ nke a hụrụ n’ọkụ, ọka ọhụrụ a kụjasịrị akụjasị, dị ka àjà ọka nke si ná mkpụrụ mbụ gị kara aka.+
15 Ị ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya. Ọ bụ àjà ọka.+
16 Onye nchụàjà ga-esure ihe ncheta ya n’ọkụ,+ ya bụ, ụfọdụ n’ime ọka ahụ a kụjasịrị akụjasị na mmanụ, ya na frankinsens ya dum, dị ka àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.