Levitikọs 17:1-16
17 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:
2 “Gwa Erọn na ụmụ ya nakwa ụmụ Izrel niile okwu, sị ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nyere n’iwu, sị:
3 “‘“Onye ọ bụla si n’ụlọ Izrel nke gburu oké ehi ma ọ bụ nwa ebule ma ọ bụ ewu n’ebe unu mara ụlọikwuu ma ọ bụ onye gburu ya ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu
4 ma o wetaghị ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ iji chụọrọ ya Jehova n’àjà n’ihu ụlọikwuu Jehova, a ga-agụ onye ahụ n’onye ikpe ọbara mara. Ọ wụfuwo ọbara, a ga-ebipụkwa onye ahụ n’etiti ndị ya,+
5 ka ụmụ Izrel wee na-eweta àjà ha, bụ́ ndị ha na-achụ n’ọhịa,+ ha ga na-ewetara ha Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute nye onye nchụàjà,+ ha ga-achụrụ Jehova ihe ndị a n’àjà dị ka àjà udo.+
6 Onye nchụàjà ga-efesa ọbara ha n’elu ebe ịchụàjà Jehova+ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ọ ga-esure abụba+ ha n’ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Jehova.+
7 Ha agakwaghị na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu,+ bụ́ ndị ha na ha na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ àjà ha. Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka, ruo ọgbọ unu niile.”’
8 “Ị ga-asịkwa ha, ‘Ma onye ọ bụla nke si n’ụlọ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu bụ́ onye ga-achụ àjà nsure ọkụ+ ma ọ bụ àjà nkịtị,
9 ma o wetaghị ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute iji chụọrọ ya Jehova n’àjà,+ a ga-ebipụ onye ahụ n’etiti ndị ya.+
10 “‘Ma onye ọ bụla nke si n’ụlọ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu nke riri ụdị ọbara ọ bụla,+ m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ+ riri ọbara, m ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya.
11 N’ihi na mkpụrụ obi nke anụ ahụ́ dị n’ọbara ya,+ mụ onwe m emewo ka ọ bụrụ maka ebe ịchụàjà ka unu were ya na-ekpuchiri+ mkpụrụ obi unu mmehie, n’ihi na ọ bụ ọbara+ na-ekpuchi mmehie+ site ná mkpụrụ obi nke dị n’ime ya.
12 Ọ bụ ya mere m ji gwa ụmụ Izrel, sị: “Ọ dịghị mkpụrụ obi ọ bụla n’ime unu ga-eri ọbara, ọ dịghịkwa onye mbịarambịa bi n’etiti unu+ dị ka ọbịa nke ga-eri ọbara.”+
13 “‘Onye ọ bụla n’etiti ụmụ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu nke nwụdere anụ ọhịa ma ọ bụ anụ ufe a na-eri eri mgbe ọ na-achụ nta ga-eme ka ọbara ya gbapụsịa,+ ọ ga-ekpochikwa ya ájá.+
14 N’ihi na mkpụrụ obi nke ụdị anụ ọ bụla bụ ọbara ya, mkpụrụ obi ya dị n’ọbara ya. Ọ bụ ya mere m ji gwa ụmụ Izrel, sị: “Unu erila ọbara nke ụdị anụ ọ bụla, n’ihi na mkpụrụ obi nke ụdị anụ ọ bụla bụ ọbara ya.+ A ga-ebipụ onye ọ bụla riri ya.”+
15 Ma mkpụrụ obi ọ bụla nke riri anụ nwụworo anwụ ma ọ bụ nke anụ ọhịa dọgburu,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ bụ mbịarambịa, ọ ga-asụ uwe ya, saakwa ahụ́ na mmiri wee bụrụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede;+ ọ ga-aghọkwa onye dị ọcha.
16 Ma ọ bụrụ na ọ sụghị ha, saakwa ahụ́, mgbe ahụ ọ ga-aza ajụjụ maka njehie ya.’”+