Levitikọs 11:1-47
11 Jehova wee gwa Mozis na Erọn okwu, sị ha:
2 “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nke a bụ ihe e kere eke dị ndụ nke unu nwere ike iri+ n’ime anụmanụ niile dị n’elu ala:
3 Ihe ọ bụla e kere eke nke ụkwụ ya wara njakpa, nke ụkwụ ya nwekwara mkpịwa, nke na-atagharịkwa ọnụ n’etiti anụmanụ, ọ bụ ya ka unu nwere ike iri.+
4 “‘Ọ bụ naanị nke a ka unu na-agaghị eri n’etiti anụ ndị na-atagharị ọnụ na ndị ụkwụ ha wara njakpa: kamel, n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.+
5 Unu erikwala ewi nkume,+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
6 Unu erikwala ùrúrù,+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
7 Unu erikwala ézì,+ n’ihi na ụkwụ ya wara njakpa, ụkwụ ya nwekwara mkpịwa, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
8 Unu erila anụ ha, unu emetụkwala ozu ha aka.+ Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.+
9 “‘Nke a bụ ihe unu nwere ike iri n’ime ihe ọ bụla dị n’ime mmiri:+ Ihe niile nwere ntù na akpịrịkpa,+ nke dị n’ime mmiri, n’oké osimiri nakwa n’iyi, unu nwere ike iri ha.
10 Ihe niile dị n’oké osimiri nakwa n’iyi, nke na-enweghị ntù na akpịrịkpa, n’ime ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè nakwa n’ime mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke dị n’ime mmiri, ha bụ ihe unu ga na-asọ oyi.
11 Ee, ha ga-abụrụ unu ihe na-asọ oyi. Unu erila anụ ha,+ ozu ha ga na-asọkwa unu oyi.
12 Ihe ọ bụla dị n’ime mmiri nke na-enweghị ntù na akpịrịkpa bụ ihe unu ga na-asọ oyi.
13 “Anụ ufe ndị a ga-abụ ihe unu ga na-asọ oyi.+ E kwesịghị iri ha eri. Ha bụ ihe na-asọ oyi: ugo+ na ugo na-eri azụ̀ na udele ojii,
14 na égbé uhie na égbé ojii,+ n’ụdị ya dị iche iche,
15 na ugoloọma ọ bụla,+ n’ụdị ya dị iche iche,
16 na enyí nnụnụ+ na ikwiikwii na nnụnụ mmiri na agụ nkwọ, n’ụdị ya dị iche iche,
17 na ikwiikwii nta na nnụnụ mmiri bụ́ kọmọrant na ikwiikwii ntị ogologo,+
18 na ọbọgwụ mmiri na okwolo na udele,+
19 na ụgbala ọcha na ụgbala mmiri, n’ụdị ya dị iche iche, na nnụnụ huupu na ụsụ.+
20 Ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè nke nwere nku bụ́ nke ji ụkwụ anọ eje ije bụ ihe unu ga na-asọ oyi.+
21 “‘Ọ bụ naanị nke a ka unu nwere ike iri n’ime ihe niile e kere eke na-enupụta n’ìgwè bụ́ ndị nwere nku, ndị ji ụkwụ anọ eje ije, ndị nwere ụkwụ e ji amali elu bụ́ ndị ha ji amali elu n’elu ala.
22 Ndị a ka unu nwere ike iri n’ime ha: igurube na-enugharị enugharị,+ n’ụdị ya dị iche iche, na ụdị igurube a na-eri eri,+ n’ụdị ya dị iche iche, na mbụzụ, n’ụdị ya dị iche iche, na ụkpara,+ n’ụdị ya dị iche iche.
23 Ihe ọ bụla ọzọ e kere eke na-enupụta n’ìgwè, nke nwere nku, nke nwekwara ụkwụ anọ, bụ ihe unu ga na-asọ oyi.+
24 Ihe ndị a ga-eme ka unu ghọọ ndị na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+
25 Onye ọ bụla nke bu ozu ha n’ahụ́ ya ga-asụ+ uwe ya, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
26 “‘Anụmanụ ọ bụla nke ụkwụ ya wara njakpa ma ụkwụ ya enweghị mkpịwa, nke na-adịghịkwa atagharị ọnụ, bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.+
27 Ma ihe ọ bụla e kere eke nke ji ọbụ ụkwụ na ọbụ aka ya eje ije n’etiti ihe niile e kere eke ndị na-eji ụkwụ anọ eje ije ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
28 Onye ọ bụla nke buru ozu+ ha ga-asụ uwe ya,+ ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. Ha ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
29 “‘Nke a ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha n’etiti ihe e kere eke na-enupụta n’ìgwè n’elu ala:+ nkapị na òké na-amali elu+ na ngwere, n’ụdị ya dị iche iche,
30 na agụ ụlọ na oroburu na ngwere mmiri na ngwere ájá na ogwumagala.
31 Ihe ndị a ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha n’etiti ihe niile e kere eke na-enupụta n’ìgwè.+ Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+
32 “‘Ihe ọ bụla ozu nke ọ bụla n’ime ha dakwasịrị ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ arịa e ji osisi mee+ ma ọ bụ uwe ma ọ bụ akpụkpọ anụ+ ma ọ bụ ákwà iru uju.+ A ga-asụnye arịa ọ bụla a na-eji eme ihe n’ime mmiri, ọ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede, mgbe ahụ ọ ga-adị ọcha.
33 Ma ite ụrọ+ ọ bụla nke ozu nke ọ bụla n’ime ha dabara, ihe ọ bụla dị n’ime ya ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, unu ga-akụrikwa ya.+
34 Ụdị ihe ọ bụla a na-eri eri nke mmiri si na ya wụsara ga-aghọ nke na-adịghị ọcha, ihe ọṅụṅụ ọ bụla nke dị n’arịa ọ bụla, nke mmiri si na ya bara, ga-aghọkwa nke na-adịghị ọcha.
35 Ihe ọ bụla ozu nke ọ bụla n’ime ha dakwasịrị ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha. Ma ọ̀ bụ ekwú ma ọ bụ ihe a na-adọkwasị ite, a ga-akụtu ya. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha, ha ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
36 Ọ bụ naanị iyi na olulu a hapụrụ ka mmiri dọrọ n’ime ya ga-adịrị ọcha, ma onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
37 Ọ bụrụ na ozu nke ọ bụla n’ime ha adaa n’elu mkpụrụ akụ́kụ́ ọ bụla a ga-akụ akụ, ọ dị ọcha.
38 Ma ọ bụrụ na a wụsa mmiri ná mkpụrụ, akụkụ ọ bụla nke ozu ha adaa n’elu ya, ọ ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
39 “‘Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’anụmanụ unu nke bụụrụ unu ihe oriri anwụọ, onye ọ bụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+
40 Onye riri+ akụkụ ọ bụla nke ozu ya ga-asụ uwe ya, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede; onye bupụkwara ozu ya ga-asụ uwe ya, ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
41 Ihe ọ bụla e kere eke nke na-enupụta n’ìgwè n’elu ala bụ ihe na-asọ oyi.+ A gaghị eri ya eri.
42 Ihe ọ bụla e kere eke nke na-akpụ akpụ+ na ihe ọ bụla na-eji ụkwụ anọ eje ije ma ọ bụ nke ọ bụla nwere ọtụtụ ụkwụ n’ime ihe niile na-enupụta n’ìgwè n’elu ala, unu erila ha, n’ihi na ha bụ ihe na-asọ oyi.+
43 Unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu bụrụ ihe na-asọ oyi, unu ekwela ka ha mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ha ewee mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+
44 N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu;+ unu ga-edo onwe unu nsọ, unu ga-adịkwa nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+ Ya mere, unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu ghara ịdị ọcha.
45 N’ihi na abụ m Jehova onye dupụtara unu n’ala Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu;+ unu ga-adịkwa nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+
46 “‘Nke a bụ iwu banyere anụmanụ na anụ ufe na mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke na-agagharị n’ime mmiri+ nakwa banyere mkpụrụ obi ọ bụla na-enupụta n’ìgwè n’elu ala,
47 iji kpaa ókè+ n’agbata ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha nakwa n’agbata ihe e kere eke dị ndụ a pụrụ iri eri na ihe e kere eke dị ndụ a na-agaghị eri eri.’”