Levitikọs 10:1-20
10 E mesịa, ụmụ Erọn bụ́ Nedab na Abaịhu+ weere ihe ịgụ ọkụ ha,+ onye nke ọ bụla wetara nke ya ma tinye ya ọkụ, tụkwasịkwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’elu ya, ha wee malite iji ọkụ suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị+ n’ihu Jehova, bụ́ nke ọ na-agwaghị ha suree.
2 Ọkụ wee si n’ihu Jehova pụta repịa ha,+ ha wee nwụọ n’ihu Jehova.+
3 Mozis wee sị Erọn: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ka e doo m nsọ+ n’etiti ndị na-abịaru m nso,+ ka e nyekwa m otuto+ n’ihu mmadụ niile.’” Ma Erọn gbara nkịtị.
4 Mozis wee kpọọ Mishel na Elzefan, bụ́ ụmụ Ọziel,+ nwanne nna Erọn, wee sị ha: “Bịanụ nso, sinụ n’ihu ebe nsọ a buru ụmụnne unu gaa ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu.”+
5 Ha wee bịaruo nso buru ha mgbe ha ka yi uwe mwụda ha gaa ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu, dị ka Mozis kwuru.
6 Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị nke ọzọ, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi,+ unu adọwakwala uwe unu, ka unu ghara ịnwụ, ka ọ gharakwa iweso nzukọ a dum iwe;+ kama ụmụnne unu bụ́ ụlọ Izrel dum ga-akwa ákwá maka ọkụ rere ha bụ́ nke Jehova kpatara.
7 Unu esikwala n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ ka unu ghara ịnwụ,+ n’ihi na e tere unu mmanụ Jehova ji ete mmadụ mmanụ n’isi.”+ Ha wee mee ihe Mozis kwuru.
8 Jehova wee gwa Erọn, sị:
9 “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu,+ gị na ụmụ gị ndị gị na ha nọ, mgbe unu na-abata n’ụlọikwuu nzute, ka unu ghara ịnwụ. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka,
10 iji kpaa ókè n’agbata ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa n’agbata ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha,+
11 nakwa iji kụziere ụmụ Izrel+ ụkpụrụ niile Jehova si n’ọnụ Mozis nye ha.”
12 Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị fọdụrụ, sị: “Werenụ àjà ọka*+ fọdụrụ n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, nọrọkwanụ nso n’ebe ịchụàjà rie ya n’etinyeghị ya ihe na-eko achịcha, n’ihi na ọ bụ ihe kasị nsọ.+
13 Unu ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya,+ n’ihi na ọ bụ òkè gị na òkè ụmụ gị ga na-eketa n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova; n’ihi na ọ bụ nke a ka e nyere m n’iwu.
14 Unu ga-anọ n’ebe dị ọcha rie obi anụ àjà ahụ a na-efegharị efegharị+ na ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ,+ gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ n’ihi na e nyewo ha ka ha bụrụ òkè gị na òkè ụmụ gị ga na-eketa n’àjà udo nke ụmụ Izrel.
15 Ha ga-eweta ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ na obi nke anụ àjà a na-efegharị efegharị,+ tinyere abụba nke àjà a na-esure n’ọkụ, ka e wee fegharịa àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova; ọ ga-abụ òkè+ gị na ụmụ gị ndị gị na ha nọ ga na-eketa ruo mgbe a na-akaghị aka, dị ka Jehova nyere n’iwu.”
16 Mozis wee chọsie ewu àjà mmehie+ ahụ ike, ma, lee! e surewo ya n’ọkụ. O wee weso Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị fọdụrụnụ, iwe, wee sị:
17 “Gịnị mere na unu erighị anụ àjà mmehie ahụ n’ebe dị nsọ,+ ebe ọ bụ ihe kasị nsọ, o nyewokwa ya unu ka unu wee na-aza ajụjụ maka njehie nke nzukọ a iji na-ekpuchiri ha mmehie n’ihu Jehova?+
18 Lee! E webataghị ọbara ya n’ebe nsọ nke dị n’ime.+ Unu gaara eri ya n’ebe nsọ, dị ka e nyere m n’iwu.”+
19 Erọn wee sị Mozis: “Lee! Taa ka ha wetara àjà mmehie ha na àjà nsure ọkụ ha n’ihu Jehova,+ mgbe ihe ndị a malitere ịdakwasị m; a sị na m riri anụ àjà mmehie ahụ taa, ọ̀ ga-adị mma n’anya Jehova?”+
20 Mgbe Mozis nụrụ nke ahụ, ọ dị mma n’anya ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.