Jọshụa 18:1-28

18  Nzukọ ụmụ Izrel dum wee gbakọọ na Shaịlo.+ Ha wee maa ụlọikwuu nzute n’ebe ahụ,+ ebe ọ bụ na e meriwo ala ahụ n’ihu ha.+  Ma a ka nwere ndị fọdụrụ n’etiti ụmụ Izrel bụ́ ndị a na-ekepụtabeghị ihe nketa ha, ya bụ, ebo asaa.  Jọshụa wee sị ụmụ Izrel: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-akpọ ekwo nkụ n’ihe banyere ịbanye weghara ala+ ahụ nke Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà nyere unu?+  Họpụtaranụ onwe unu ndị ikom atọ n’ebo ọ bụla ka m zipụ ha, ka ha bilie gagharịa n’ala ahụ wee see ókè ya n’akwụkwọ dị ka ihe nketa ha si dị, ka ha bịakwutekwa m.+  Ha ga-ekekwa ya ụzọ asaa n’etiti onwe ha.+ Juda ga-ebi n’ókèala ya n’ebe ndịda, ụlọ Josef ga-ebikwa n’ókèala ha n’ebe ugwu.  Ma unu ga-ese ala ahụ n’akwụkwọ ma kee ya ụzọ asaa, wetaranụ m ya ebe a, m ga-efekwara unu nza+ n’ebe a n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị.  N’ihi na ndị Livaị enweghị òkè n’etiti unu,+ n’ihi na ọrụ nchụàjà Jehova bụ ihe nketa ha;+ Gad na Ruben+ na ọkara ebo Manase+ enwetawo ihe nketa ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, bụ́ nke Mozis ohu Jehova nyere ha.”+  Ndị ikom ahụ wee bilie ka ha gawa. Jọshụa wee nye ndị ahụ na-aga ise ala ahụ n’akwụkwọ iwu,+ sị: “Gaanụ jegharịa n’ala ahụ ma see ya n’akwụkwọ, lọghachikwutekwanụ m, ọ bụ n’ebe a ka m ga-efere unu nza na Shaịlo+ n’ihu Jehova.”  Ndị ikom ahụ wee gawa, gazuo ala ahụ ma see ya n’akwụkwọ, keekwa ya ụzọ asaa n’obodo n’obodo. E mesịa, ha bịakwutere Jọshụa n’ebe ha mara ụlọikwuu ha na Shaịlo, 10  Jọshụa wee feere ha nza na Shaịlo n’ihu Jehova.+ Otú ahụ ka Jọshụa si keere ụmụ Izrel ala ahụ n’ebe ahụ n’òkè n’òkè.+ 11  Nza+ wee daara ebo Benjamin+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, ókèala ha nwetara site na nza e fere wee dịrị n’agbata ala ụmụ Juda na ụmụ Josef. 12  Ókè ha n’isi isi ebe ugwu wee malite na Jọdan, ókè nke ala ahụ rukwara ná mkpọda Jeriko n’ebe ugwu ma gbagoo n’ugwu n’ebe ọdịda anyanwụ. Ebe o jedebere bụ n’ala ịkpa Bet-evin. 13  Ókè ya wee si n’ebe ahụ ruo Lọz, n’ebe mkpọda nke dị na ndịda Lọz, ya bụ, Betel;+ ókè ya wee gbadaa Atarọt-ada n’elu ugwu nke dị n’ebe ndịda nke Bet-horọn Ndịda. 14  E wee kpaa ókè ya, ókè ya wee gaa gburugburu n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’ebe ndịda, malite n’ugwu nke chere ihu na Bet-horọn n’ebe ndịda; ebe o jedebere bụ Kiriat-bel, ya bụ, Kiriat-jierim,+ bụ́ obodo ụmụ Juda. Nke a bụ ebe ọdịda anyanwụ. 15  Mpaghara ebe ndịda bidoro na nsọtụ Kiriat-jierim, ókè ya gakwara n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’isi mmiri Neftoa. 16  Ókè ya gbadara na nsọtụ ugwu nke chere ihu na ndagwurugwu nwa Hinọm,+ nke dị na ndagwurugwu Refeyim+ n’ebe ugwu. Ọ gbadakwara na ndagwurugwu Hinọm, ná mkpọda nke obodo ndị Jibọs,+ gbadaruokwa n’En-rogel.+ 17  A kpara ókè ya n’ebe ugwu. O ruru En-shimesh, ruokwa Gelaịlọt, bụ́ nke dị n’ihu ụzọ gbagoro Adọmịm; ọ gbadakwara ruo nkume+ Bohan nwa Ruben. 18  Ọ gafere ruo ná mkpọda nke dị n’ebe ugwu n’ihu Araba, gbadaruokwa Araba. 19  Ókè ya gafere ruo ná mkpọda nke dị n’ebe ugwu nke Bet-họgla, ebe ókè ya jedebere bụ n’ọnụ mmiri dị n’ebe ugwu nke Oké Osimiri Nnu,+ na nsọtụ ebe ndịda Jọdan. Nke a bụ ókè ebe ndịda. 20  Ókè ya nke ebe ọwụwa anyanwụ bụ Jọdan. Nke a bụ ihe nketa nke ụmụ Benjamin, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ókè ya niile gbaa gburugburu. 21  Obodo niile nke ebo ụmụ Benjamin, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ Jeriko na Bet-họgla na Imek-kiziz, 22  na Bet-araba na Zemarem na Betel,+ 23  na Avim na Pera na Ọfra,+ 24  na Kifa-amọnaị na Ọfnaị na Giba;+ obodo iri na abụọ na ógbè ha niile. 25  Gibiọn+ na Rema na Bierọt, 26  na Mizpe+ na Kefaịra+ na Moza, 27  na Rikem na Iyepiel na Tarala, 28  na Zila,+ Ha-ilef na Jebusi, ya bụ, Jeruselem,+ Gibia+ na Kiriat; obodo iri na anọ na ógbè ha niile. Ọ bụ nke a bụ ihe nketa nke ụmụ Benjamin n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji