Jọshụa 16:1-10
16 Ala ụmụ Josef+ ketara site n’ife nza+ bidoro na Jọdan,+ nke dị nso na Jeriko, ruo na mmiri Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruo n’ala ịkpa nke si na Jeriko gbagoo n’ógbè Betel nke bụ́ ugwu ugwu.
2 O sikwa na Betel nke Lọz+ gafere ruo n’ókè ndị Akaịt,+ n’Atarọt,
3 ọ gbadakwara n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’ókè ndị Jaflet ruo n’ókè Bet-horọn+ Ndịda na Giza,+ ebe o jedebere bụ n’oké osimiri.+
4 Ụmụ Josef,+ bụ́ Manase na Ifrem, wee weghara ala ahụ.+
5 Ókè nke ala ụmụ Ifrem, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ, ee, ókè nke ihe nketa ha n’ebe ọwụwa anyanwụ bụ Atarọt-ada, ruo Bet-horọn Mgbago;+
6 ókè ya wee ruo n’oké osimiri. Mikmitat dị n’ebe ugwu, ókè ya gakwara gburugburu n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Teanat-shaịlo, wee si n’ebe ọwụwa anyanwụ gafee ruo Janoa.
7 O wee si na Janoa gbadaa ruo Atarọt nakwa Neara, ruokwa Jeriko, gbadaakwa Jọdan.
8 Malite na Tapua, ókè ya gawara n’ebe ọdịda anyanwụ ruo na ndagwurugwu Kena, ebe o jedebere wee bụrụ n’oké osimiri.+ Nke a bụ ihe nketa nke ebo ụmụ Ifrem, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
9 Ụmụ Ifrem nwekwara obodo ndị e wepụtaara ha n’etiti ihe nketa nke ụmụ Manase, obodo niile na ógbè ha niile.
10 Ha achụpụghịkwa ndị Kenan+ bi na Giza, ndị Kenan wee biri n’etiti ndị Ifrem ruo taa,+ bụrụkwa ndị ohu na-arụ ọrụ mmanye.+