Jọshụa 12:1-24
12 Ndị a bụ ndị eze na-achị ala ụmụ Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ+ nke Jọdan, malite n’iyi ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ tinyere Araba+ dum nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ:
2 Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ bụ́ onye na-achị malite n’Aroa+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn,+ na etiti ndagwurugwu ahụ, na ọkara nke Gilied ruo Jabọk+ bụ́ iyi ndagwurugwu, nke bụ́ ókè nke ala ụmụ Amọn,
3 nakwa Araba+ ruo oké osimiri Kineret*+ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruokwa n’oké osimiri Araba, Oké Osimiri Nnu, n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-jeshimọt, nakwa n’ebe ndịda nke dị n’ala ala mkpọda Pisga.+
4 Tinyere ókèala Ọg+ eze Beshan, onye fọdụrụ n’ime ndị Refeyim,+ bụ́ ndị biri n’Ashtarọt+ na Edriaị,+
5 onye chịrị n’Ugwu Hemọn nakwa na Saleka nakwa na Beshan dum,+ ruo n’ókè ndị Geshọ+ na ndị Meakat, na ọkara nke Gilied, ruo n’ókèala Saịhọn eze Heshbọn.+
6 Ọ bụ Mozis ohu Jehova na ụmụ Izrel meriri ha,+ Mozis ohu Jehova wee nye ya ụmụ Ruben+ na ụmụ Gad+ na ọkara ebo Manase+ ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
7 Ndị a bụ ndị eze na-achị ala Jọshụa na ụmụ Izrel meriri n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Jọdan, malite na Bel-gad nke dị na ndagwurugwu* Lebanọn, ruo n’Ugwu Helak, nke dị ruo Sia,+ Jọshụa wee nye ya ebo niile nke Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè,
8 n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa na Shefila nakwa n’Araba nakwa n’ebe ndị dị ná mkpọda nakwa n’ala ịkpa nakwa na Negeb—ndị Het, ndị Amọraịt+ na ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs:+
9 Eze Jeriko, otu; eze E-aị, nke dị n’akụkụ Betel, otu;
10 eze Jeruselem, otu; eze Hibrọn, otu;
11 eze Jamọt, otu; eze Lekish, otu;
12 eze Eglọn, otu; eze Giza, otu;
13 eze Diba, otu; eze Gida, otu;
14 eze Họma, otu; eze Erad, otu;
15 eze Libna, otu; eze Adọlam, otu;
16 eze Makida, otu; eze Betel,+ otu;
17 eze Tapua, otu; eze Hifa,+ otu;
18 eze Efek, otu; eze Lasharọn, otu;
19 eze Medọn, otu; eze Hezọ, otu;
20 eze Shimrọn-mirọn, otu; eze Akshaf, otu;
21 eze Teanak, otu; eze Megido,+ otu;
22 eze Kidesh, otu; eze Jọkniam nke dị na Kamel, otu;
23 eze Dọọ nke dị na mkputamkpu ugwu nke Dọọ, otu; eze Goyim nke dị na Gilgal, otu;
24 eze Teza, otu; ndị eze ahụ niile dị iri atọ na otu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ N’ezie, ọ bụ ọdọ mmiri; Baịbụl kpọkwara ya ọdọ mmiri Genesaret, Osimiri Galili, nakwa Osimiri Taịbirịas.
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”