Jọshụa 11:1-23
11 O wee ruo na ozugbo Jebin bụ́ eze Hezọ nụrụ ya, o zigaara Jobab eze Medọn na eze Shimrọn na eze Akshaf ozi,
2 zigakwara ndị eze bi n’ebe ugwu, n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa na mbara ọzara dị n’ebe ndịda Kineret+ nakwa na Shefila nakwa n’ugwu nke Dọọ+ n’ebe ọdịda anyanwụ,
3 zigakwara ndị Kenan+ bi n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ, tinyere ndị Amọraịt+ na ndị Het+ na ndị Perizaịt+ na ndị Jibọs+ bi n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa ndị Haịvaịt+ bi n’ala ala ugwu Hemọn,+ ya bụ, n’ala Mizpa.
4 Ha wee gaa, ha na ndị agha ha niile, bụ́ ndị dị ọtụtụ+ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri, tinyere ọtụtụ ịnyịnya+ na ụgbọ ịnyịnya agha.
5 Ndị eze a niile wee zukọta n’oge a kara aka wee bịa makọọ ụlọikwuu ha ọnụ n’akụkụ mmiri Merọm ibuso Izrel agha.+
6 Jehova wee sị Jọshụa: “Atụla egwu n’ihi ha,+ n’ihi na ụdị ugbu a echi, m ga-enyefe ha niile n’aka Izrel ka ha gbuo ha. Ị ga-ese ịnyịnya ha akwara,+ ị ga-esurekwa ụgbọ ịnyịnya ha n’ọkụ.”+
7 Jọshụa na ndị agha ya niile wee bịa buso ha agha na mberede n’akụkụ mmiri Merọm, gbuokwa ha.
8 Jehova wee nyefee ha n’aka Izrel,+ ha wee na-egbu ha ma chụrụ ha ruo Saịdọn+ nke nwere ụba mmadụ, ruokwa Misrefọt-meyim na ndagwurugwu* Mizpe, n’ebe ọwụwa anyanwụ; ha wee gbukata ha ruo mgbe ha na-ahapụghị onye ọ bụla n’ime ha ndụ.+
9 E mesịa, Jọshụa mere ha dị nnọọ ka Jehova gwara ya: o sere ịnyịnya ha akwara,+ sureekwa ụgbọ ịnyịnya ha n’ọkụ.+
10 Jọshụa tụgharịkwara n’oge ahụ wee weghara Hezọ; o jikwa mma agha gbuo eze ya+ n’ihi na Hezọ bụ isi alaeze ndị a niile tupu oge ahụ.
11 Ha wee were ihu mma agha gbuo mkpụrụ obi niile nọ n’ime ya, bibie ha.+ Ọ dịghị ihe ọ bụla na-eku ume ha hapụrụ,+ o surekwara Hezọ n’ọkụ.
12 Jọshụa wee weghara obodo niile nke ndị eze a niile na-achị, nwụdekwa ndị eze ha niile ma were ihu mma agha gbuo ha.+ O bibiri ha,+ dị nnọọ ka Mozis ohu Jehova nyere n’iwu.+
13 Ọ bụ naanị obodo ndị dị n’elu mkputamkpu ala ka Izrel na-agbaghị ọkụ, ma e wezụga Hezọ, nke bụ́ naanị obodo Jọshụa gbara ọkụ.
14 Ụmụ Izrel bukọkwaara ihe niile ha kwatara n’obodo ndị a, tinyere anụ ụlọ ha.+ Ọ bụ naanị ihe niile bụ́ mmadụ ka ha ji ihu mma agha gbuo ruo mgbe ha lara ha n’iyi.+ Ha ahapụghị onye ọ bụla na-eku ume.+
15 Dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis ohu ya n’iwu, otú ahụ ka Mozis nyere Jọshụa n’iwu,+ ọ bụkwa otú ahụ ka Jọshụa mere. O wepụghị otu okwu n’ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu.+
16 Jọshụa wee weghara ala a dum, ya bụ, ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa Negeb+ dum na ala Goshen dum na Shefila+ na Araba+ na ógbè Izrel nke bụ́ ugwu ugwu na Shefila ya,
17 malite n’Ugwu Helak, nke dị ruo Sia,+ ruokwa Bel-gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, n’ala ala Ugwu Hemọn,+ ọ nwụdekwara ndị eze ha niile, gbuo ha.+
18 Jọshụa busoro ndị eze a niile agha ọtụtụ ụbọchị.
19 Ọ dịghị obodo mere ka udo dịrị n’etiti ha na ụmụ Izrel ma e wezụga ndị Haịvaịt bi na Gibiọn. Ha lụtara obodo ndị nke ọzọ niile n’agha.+
20 N’ihi na ihe Jehova mere ha bụ ikwe ka obi ha kpọchie+ ka ha buso Izrel agha, ka o wee bibie ha, ka a ghara imere ha ebere,+ kama ka ọ laa ha n’iyi, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+
21 N’oge ahụ, Jọshụa gakwara gbukpọọ ụmụ Enak+ n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, ya bụ, Hibrọn, na Diba, na Enab nakwa n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu nakwa n’ógbè Izrel bụ́ ugwu ugwu. Jọshụa bibiri ha niile,+ tinyere obodo ha.
22 Ọ dịghị ụmụ Enak fọdụrụ n’ala ụmụ Izrel. Ọ bụ naanị na Geza+ nakwa na Gat+ nakwa n’Ashdọd+ ka ha fọdụrụ.+
23 Jọshụa wee weghara ala ahụ dum, dị ka ihe niile Jehova kwere Mozis ná nkwa si dị,+ Jọshụa wee nye ya Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè, dị ka ebo ha si dị.+ Ala ahụ enweghị nsogbu agha ọzọ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”