Jọn 20:1-31
20 N’ụbọchị mbụ n’izu,+ Meri Magdalin bịara n’ili ncheta ahụ n’isi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbara. O wee hụ na a kwapụwo nkume n’ili ncheta ahụ.+
2 Ya mere, ọ gbaara ọsọ bịakwute Saịmọn Pita na onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs,+ bụ́ onye Jizọs hụrụ n’anya nke ukwuu, o wee sị ha: “Ha ebupụwo Onyenwe anyị n’ili ncheta ahụ,+ anyị amaghịkwa ebe ha dọbara ya.”
3 Pita+ na onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs wee gawa n’ili ncheta ahụ.
4 Ee, ha abụọ malitere ịgba ọsọ; ma onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs gbanahụrụ Pita wee buru ụzọ rute n’ili ncheta ahụ.
5 Mgbe o hulatara, ọ hụrụ ka ákwà ozu ndị ahụ wụsa n’ebe ahụ,+ ma ọ banyeghị.
6 Saịmọn Pita sokwa ya n’azụ bịarute, wee banye n’ime ili ncheta ahụ. O wee hụ ákwà ozu ndị ahụ wụsa n’ebe ahụ,+
7 hụkwa ákwà e kere ya n’isi, nke na-awụsaghị n’ebe ákwà ozu ndị ahụ dị, kama a fụkọtara ya iche debe n’otu ebe.
8 Ya mere, n’oge ahụ, onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, nke bu ụzọ rute n’ili ncheta ahụ, banyekwara. Ọ hụkwara wee kwere.
9 N’ihi na ha aghọtabeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke kwuru na ọ ghaghị isi ná ndị nwụrụ anwụ bilie.+
10 Ndị na-eso ụzọ ya wee laghachi n’ebe obibi ha.
11 Otú ọ dị, Meri guzo n’èzí n’akụkụ ili ncheta ahụ, na-akwa ákwá. Mgbe ọ nọkwa na-akwa ákwá, o hulatara ka o nyoba anya n’ili ncheta ahụ,
12 o wee hụ ndị mmụọ ozi abụọ+ yi uwe ọcha ka ha nọ ọdụ n’ebe ahụ ozu Jizọs dịbu, otu nọ n’ebe isi, otu nọkwa n’ebe ụkwụ.
13 Ha wee sị ya: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-akwa ákwá?” O wee sị ha: “Ha ebupụwo Onyenwe m, amaghịkwa m ebe ha debere ya.”
14 Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, ọ tụgharịrị wee hụ Jizọs ka o guzo, ma ọ ghọtaghị na ọ bụ Jizọs.+
15 Jizọs sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị mere i ji na-akwa ákwá? Ònye ka ị na-achọ?”+ Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ubi ahụ, ọ sịrị ya: “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya, m ga-eburukwa ya.”
16 Jizọs sịrị ya: “Meri!”+ Nwaanyị ahụ tụgharịrị, sị ya, n’asụsụ Hibru: “Rabonaị!”+ (nke pụtara “Onye Ozizi!”)
17 Jizọs sịrị ya: “Kwụsị ịrapara m n’ahụ́. N’ihi na arịgobeghị m gakwuru Nna m. Ma gakwuru ụmụnna m,+ sị ha, ‘Ana m arịgokwuru Nna m+ na Nna unu nakwa Chineke m+ na Chineke unu.’”+
18 Meri Magdalin bịara kọọrọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs, sị: “Ahụrụ m Onyenwe anyị!” kọọkwara ha na ọ gwara ya ihe ndị a.+
19 Ya mere, mgbe chi jiwere n’ụbọchị ahụ, bụ́ ụbọchị mbụ n’izu,+ ọ bụ ezie na a kpọchiri ọnụ ụzọ ebe ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ihi egwu+ ha na-atụ ndị Juu, Jizọs bịakwara+ guzoro n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị unu.”+
20 Mgbe o kwusịrị nke a, o gosiri ha ma aka ya ma akụkụ ya.+ Ndị ahụ na-eso ụzọ wee ṅụrịa ọṅụ+ mgbe ha hụrụ Onyenwe anyị.
21 Jizọs wee sị ha ọzọ: “Udo dịrị unu. Dị nnọọ ka Nna m ziteworo m,+ mụ onwe m na-ezigakwa unu.”+
22 Mgbe o kwusịrị ihe a, ọ fụrụ ha ikuku wee sị ha: “Natanụ mmụọ nsọ.+
23 Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị ọ bụla mmehie ha,+ a gbagharawo ha mmehie ndị ahụ; ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmehie nke ndị ọ bụla, a gbagharaghị ha.”+
24 Ma Tọmọs,+ otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, onye a na-akpọ Ejima, esoghị ha nọrọ mgbe Jizọs bịara.
25 Ya mere, ndị ọzọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs sịrị ya: “Anyị hụrụ Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na mụ ahụghị apa ntu n’aka ya, rụnyekwa mkpịsị aka m n’apa ntu ndị ahụ, rụnyekwa aka m n’akụkụ ya,+ agaghị m ekweta ma ọlị.”+
26 Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya nọ ọzọ n’ime ụlọ, Tọmọs sokwa ha nọrọ. Jizọs bịara, ọ bụ ezie na a kpọchisịrị ụzọ akpọchi, o guzokwara n’etiti ha wee sị: “Udo dịrị unu.”+
27 O wee sị Tọmọs: “Rụnye mkpịsị aka gị n’ebe a, lee aka m, werekwa aka gị+ rụnye n’akụkụ m, kwụsịkwa ịbụ onye na-adịghị ekweta ihe kama na-ekweta.”
28 Tọmọs wee sị ya: “Onyenwe m na Chineke m!”+
29 Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ bụ n’ihi na ị hụrụ m ka i ji kweta? Obi ụtọ na-adịrị ndị na-ahụghị ihe ma kweta.”+
30 N’ezie, Jizọs mekwara ọtụtụ ihe ịrịba ama ndị ọzọ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị a na-edeghị n’akwụkwọ mpịakọta a.+
31 Ma e dere ihe ndị a+ ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, ka unu wee nwee ndụ site n’aha ya n’ihi na unu kweere.+