Jọn 13:1-38
13 Ma, ebe Jizọs maara tupu ememme ngabiga ahụ na oge awa ya eruwo+ ka ọ pụọ n’ụwa lakwuru Nna ya,+ ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya,+ ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.
2 Ya mere, mgbe ha nọ na-eri nri anyasị ahụ, mgbe Ekwensu tinyeworo ya n’obi Judas Iskarịọt,+ nwa Saịmọn, ịrara ya nye,+
3 ya onwe ya maara na Nna ya enyefewo ihe niile n’aka ya,+ marakwa na ya si n’ebe Chineke nọ bịa, na-alakwurukwa Chineke.+
4 O biliri na nri anyasị ahụ ma chịsa uwe elu ya n’akụkụ. O weere ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù.+
5 Mgbe o mesịrị, ọ gbanyere mmiri n’efere wee malite ịsa ụkwụ+ ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa ákwà ahụ e ji ehicha ahụ́ o kere n’úkwù na-ehicha ha.
6 O wee rute n’ebe Saịmọn Pita nọ. Ọ sịrị ya: “Onyenwe anyị, ị̀ na-asa m ụkwụ?”+
7 Jizọs zara ya, sị: “Ị ghọtaghị ugbu a ihe m na-eme, ma ị ga-aghọta ya mgbe ihe ndị a gasịrị.”+
8 Pita sịrị ya: “N’ezie, ị gaghị asa m ụkwụ ma ọlị.” Jizọs wee sị ya: “Ọ bụrụ na mụ asaghị gị ụkwụ,+ o nweghị ihe jikọrọ mụ na gị.”
9 Saịmọn Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị ụkwụ m, kamakwa aka m na isi m.”
10 Jizọs wee sị ya: “Onye sara ahụ́,+ ọ dịghị mkpa ịsa ya ebe ọzọ ma e wezụga ụkwụ ya, ma ahụ́ ya dum dị ọcha. Unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu niile.”
11 N’ezie, ọ maara onye na-arara ya nye.+ Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”
12 Mgbe ọ sasịrị ha ụkwụ, yirikwa uwe elu ya wee nọdụ ala ọzọ na tebụl, ọ sịrị ha: “Ùnu maara ihe m meere unu?
13 Unu na-akpọ m, ‘Onye Ozizi,’+ na, ‘Onyenwe anyị,’+ ihe unu na-akpọ m zikwara ezi, n’ihi na ọ bụ ihe m bụ.+
14 Ya mere, ọ bụrụ na mụ onwe m sara unu ụkwụ,+ ọ bụ ezie na m bụ Onyenwe unu na Onye Ozizi, unu kwesịkwara ịsarịta ibe unu ụkwụ.+
15 N’ihi na m na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.+
16 N’ezie, n’ezie, ana asị unu, Ohu adịghị aka nna ya ukwu, onye ozi adịghịkwa aka onye zitere ya.+
17 Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.+
18 Adịghị m ekwu banyere unu niile; amaara m ndị m họọrọ.+ Kama ọ bụ ka e wee mezuo Akwụkwọ Nsọ,+ nke sịrị, ‘Onye na-eri nri m ebiliwo megide m.’*+
19 Malite ugbu a gaa n’ihu, ana m agwa unu tupu ya emee,+ ka unu wee kwere na ọ bụ m bụ ya mgbe ọ ga-eme.
20 N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye na-anabata onye ọ bụla nke m zitere na-anabatakwa m.+ N’aka nke ọzọ, onye na-anabata m, na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m.”+
21 Mgbe Jizọs kwusịrị ihe ndị a, mmụọ ya malitere inye ya nsogbu, o wee gbaa àmà, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+
22 Ndị na-eso ụzọ ya malitere ilerịta ibe ha anya, n’amaghị onye n’ime ha ọ na-ekwu maka ya.+
23 Ọ dị otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nke nọ nso n’obi ya na-eri ihe, Jizọs hụkwara ya n’anya.+
24 Ya mere, Saịmọn Pita kweere onye a n’isi, sị ya: “Kwuo onye ọ na-ekwu maka ya.”
25 Ya mere, onye a dalara azụ dabere n’obi Jizọs wee sị ya: “Onyenwe anyị, ònye ka ọ bụ?”+
26 Ya mere, Jizọs zara, sị: “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye achịcha a m na-esuru.”+ N’ihi ya, mgbe o suuru achịcha ahụ, o weere ya nye Judas, nwa Saịmọn Iskarịọt.
27 Mgbe o nyesịrị ya achịcha ahụ, Setan banyere n’ime Judas.+ Ya mere, Jizọs sịrị ya: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.”
28 Otú ọ dị, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị nọ na-eri ihe na tebụl maara ihe mere o ji gwa ya ihe a.
29 N’eziokwu, ụfọdụ chere na ebe ọ bụ Judas na-eji igbe ego,+ na Jizọs na-asị ya: “Zụta ihe ndị dị anyị mkpa maka ememme a,” ma ọ bụ na o kwesịrị inye ndị ogbenye ihe.+
30 Ya mere, mgbe ọ narasịịrị achịcha ahụ, ọ pụrụ ozugbo. Ọ bụkwa n’abalị.+
31 Ya mere, mgbe ọ pụrụ, Jizọs sịrị: “Ugbu a, e mewo ka Nwa nke mmadụ dị ebube,+ e mewokwa ka Chineke dị ebube site n’aka ya.
32 Chineke ga-emekwa ka ọ dị ebube,+ ọ ga-emekwa ka ọ dị ebube ozugbo.
33 Ụmụntakịrị,+ mụ na unu ga-anọkwu obere oge. Unu ga-achọ m; dị nnọọ ka m gwara ndị Juu, sị, ‘Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga,’+ otú ahụ ka m na-agwakwa unu ugbu a.
34 Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya,+ ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.+
35 Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”+
36 Saịmọn Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-aga?” Jizọs zara, sị: “Ị pụghị iso m ugbu a gaa ebe m na-aga, kama ị ga-eso m ma e mesịa.”+
37 Pita jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, gịnị mere na apụghị m iso gị ugbu a? M ga-atọgbọ mkpụrụ obi m n’ihi gị.”+
38 Jizọs zara, sị: “Ị̀ ga-atọgbọ mkpụrụ obi gị n’ihi m? N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Oké ọkpa agaghị akwa ma ọlị ruo mgbe ị gọnahụrụ m ugboro atọ.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ebuliwo ikiri ụkwụ ya megide m.”