Jọn 10:1-42

10  “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye na-adịghị esi n’ọnụ ụzọ+ abanye n’ogige atụrụ, nke na-arịgo ebe ọzọ, bụ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe.+  Ma onye na-esi n’ọnụ ụzọ+ abanye bụ onye na-azụ+ atụrụ.+  Onye nche ọnụ ụzọ+ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ+ na-ege ntị n’olu ya, ọ na-akpọkwa atụrụ nke ya n’aha, na-edurukwa ha apụ.  Mgbe ọ kpọpụtara ndị niile bụ́ nke ya, ọ na-ebutere ha ụzọ, atụrụ ahụ na-esokwa+ ya, n’ihi na ha maara olu ya.+  Ha agaghị eso onye bịara abịa ma ọlị, kama ha ga-agbara ya ọsọ,+ n’ihi na ha amaghị olu ndị bịara abịa.”+  Jizọs maara ha atụ a; ma ha amaghị ihe ihe ndị ọ na-agwa ha pụtara.+  Ya mere, Jizọs kwuru ọzọ, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Abụ m ọnụ ụzọ+ nke atụrụ ahụ.  Ndị niile bịara wee na-asị na ha bụ m bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe;+ ma atụrụ ahụ egeghị ha ntị.+  Abụ m ọnụ ụzọ ahụ;+ onye ọ bụla nke na-esi na mụ abanye ka a ga-azọpụta, ọ ga na-abanye, na-apụkwa ma na-achọta ebe ịta nri.+ 10  Onye ohi+ adịghị abịa ma ọ́ bụghị ka o zuo ohi, gbuokwa mmadụ, mebiekwa ihe.+ Abịara m ka ha nwee ndụ, ka ha nweekwa ya n’uju. 11  Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma;+ onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi atụrụ ya.+ 12  Onye e goro ọrụ+ nke na-abụghị onye ọzụzụ atụrụ, onye atụrụ na-abụghịkwa nke ya, na-ahụ anụ ọhịa wolf ka ọ na-abịa, ya ahapụ atụrụ ahụ gbaa ọsọ—anụ ọhịa wolf na-akpụrụ ha ma chụsasịa ha+ 13  n’ihi na ọ bụ onye e goro ọrụ,+ ihe banyere atụrụ ahụ adịghịkwa emetụ ya n’obi.+ 14  Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma, amakwaara m atụrụ m,+ atụrụ m makwaara m,+ 15  dị nnọọ ka Nna m maara m, m marakwa Nna m;+ m na-atọgbọkwa mkpụrụ obi m n’ihi atụrụ m.+ 16  “Enwekwara m atụrụ ọzọ,+ ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a;+ m ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m,+ ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.+ 17  Ọ bụ ya mere Nna m ji hụ m n’anya,+ n’ihi na m na-atọgbọ mkpụrụ obi m,+ ka m wee nweta ya ọzọ. 18  Ọ dịghị onye napụrụ m ya, kama m na-atọgbọ ya n’onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, enwekwara m ikike inweta ya ọzọ.+ Ọ bụ n’aka Nna m ka m natara iwu+ banyere nke a.” 19  Nkewa+ dapụtara ọzọ n’etiti ndị Juu n’ihi okwu ndị a. 20  Ọtụtụ n’ime ha nọ na-asị: “Mmụọ ọjọọ ji ya,+ ara na-agbakwa ya. Gịnị mere unu ji na-ege ya ntị?” 21  Ndị ọzọ na-asị: “Okwu ndị a abụghị okwu onye mmụọ ọjọọ ji. Mmụọ ọjọọ ọ̀ pụrụ imeghe anya ndị ìsì?” 22  N’oge ahụ, e mere ememme nraranye na Jeruselem. Ọ bụ oge oyi, 23  Jizọs na-ejegharịkwa n’ụlọ nsọ n’ebe veranda nwere ogidi nke Sọlọmọn.+ 24  Ya mere, ndị Juu gbara ya gburugburu wee malite ịsị ya: “Ị̀ ga-ekowe anyị obi n’elu ruo ole mgbe? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst,+ gwa anyị hoo haa.”+ 25  Jizọs zara ha, sị: “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ niile m na-arụ n’aha Nna m na-agba àmà banyere m.+ 26  Ma unu ekweghị, n’ihi na unu esoghị n’atụrụ m.+ 27  Atụrụ m+ na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.+ 28  M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi,+ a gaghịkwa ebibi ha ma ọlị,+ ọ dịghịkwa onye ga-apụnara ha n’aka m.+ 29  Ihe Nna m+ nyere m karịrị ihe ndị ọzọ niile,+ ọ dịghịkwa onye pụrụ ịpụnara ha n’aka Nna m.+ 30  Mụ na Nna m bụ otu.”+ 31  Ndị Juu buliri nkume ọzọ ka ha tụọ ya.+ 32  Jizọs zara ha, sị: “Egosiri m unu ọtụtụ ọrụ ọma si n’aka Nna m. Ole nke n’ime ọrụ ndị ahụ mere unu ji na-atụ m nkume?” 33  Ndị Juu zara ya, sị: “Anyị na-atụ gị nkume, ọ bụghị n’ihi ọrụ ọma, kama n’ihi nkwulu,+ ọbụna n’ihi na gị onwe gị na-eme onwe gị chi, ọ bụ ezie na ị bụ mmadụ.”+ 34  Jizọs zara ha, sị: “Ọ̀ bụ na e deghị ya n’Iwu unu,+ sị, ‘Asịrị m: “Unu bụ chi”’?+ 35  Ọ bụrụ na ọ kpọrọ ndị ahụ okwu Chineke bịakwasịrị ‘chi,’+ ma a pụghịkwa ime ka Akwụkwọ Nsọ ghara ịdị irè,+ 36  ùnu na-asị m, bụ́ onye Nna m doro nsọ ma zite n’ụwa, ‘Ị na-ekwulu Chineke,’ n’ihi na m sịrị, Abụ m Ọkpara Chineke?+ 37  Ọ bụrụ na mụ adịghị arụ ọrụ+ Nna m, unu ekwerela na m. 38  Ma ọ bụrụ na m na-arụ ha, ọ bụrụgodị na unu ekwereghị na m, kwerenụ ọrụ ndị ahụ,+ ka unu wee mara ma nọgide na-amara na mụ na Nna m dị n’otu, nakwa na Nna m na mụ onwe m dịkwa n’otu.”+ 39  Ya mere, ha nwara ọzọ ijide ya;+ ma ọ gbanahụrụ ha.+ 40  O wee gaa ọzọ n’ofe Jọdan, bụ́ ebe Jọn nọbu na-eme baptizim,+ ọ nọgidekwara n’ebe ahụ. 41  Ọtụtụ ndị bịakwutekwara ya, ha wee malite ịsị: “N’ezie, Jọn emeghị otu mkpụrụ ihe ịrịba ama, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụcha eziokwu.”+ 42  Ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji