Habakọk 3:1-19

3  Ekpere Habakọk onye amụma kpere nke bụ́ abụ iru uju:  Jehova, anụwo m akụkọ banyere gị.+ Jehova, ihe i mere emenyewo m ụjọ.+ Biko, meekwa ya ọzọ n’afọ ndị a! Mee ka a mara ya n’afọ ndị a. N’oge iwe gị, cheta mee ebere.+  Chineke wee si na Timan bịa, ọbụna Onye Nsọ si n’Ugwu Peran+ bịa. Sila.+ Ebube ya kpuchiri eluigwe;+ otuto ya jupụtakwara elu ụwa.+  Ìhè ya gbukepụrụ dị nnọọ ka anyanwụ.+ Ụzarị ìhè abụọ si n’aka ya na-apụta, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ike ya zoro.+  Ọrịa na-efe efe si n’ebe ọ nọ na-apụ,+ oké ahụ́ ọkụ sikwa n’ụkwụ ya na-apụ.+  O guzoro otu ebe ka o wee mee ka ụwa maa jijiji.+ O lere anya wee mee ka mba niile malie elu n’ụjọ.+ E tidakwara ugwu ukwu niile na-adịru mgbe ebighị ebi;+ ugwu nta niile na-adịru mgbe ebighị ebi dakwara.+ Ụzọ ya dị kemgbe ogologo oge gara aga.  Ahụrụ m ụlọikwuu Kushan ka ihe ọjọọ dakwasịrị ya. Ákwà ụlọikwuu nke ala Midian+ malitere ịma jijiji.+  Jehova, ọ̀ bụ osimiri ka ị na-eweso iwe dị ọkụ,+ ka ọ̀ bụ oké osimiri ka ị na-eweso oké iwe?+ N’ihi na ị nọkwasịrị n’ịnyịnya gị;+ ụgbọ ịnyịnya gị bụ nzọpụta.+  E kpughewo ụta gị wee gbaa ya ọtọ.+ Ịṅụ iyi nke ebo dị iche iche bụ ihe e kwuru ekwu.+ Sila. I ji osimiri kewaa ụwa.+ 10  Ugwu dị iche iche hụrụ gị; ha wee nọrọ n’oké ihe mgbu.+ Oké mmiri ozuzo gafere. Ogbu mmiri mere mkpatụ.+ Ọ chịliri aka ya elu. 11  Anyanwụ—ọnwa—guzooro otu ebe n’ebe obibi ha dị elu.+ Akụ́ gị na-aga dị ka ìhè.+ Àmụ̀mà nke ube gị na-enye ìhè.+ 12  I ji oké iwe zọrọ ije gafere n’ụwa. I ji iwe zọchaa+ mba niile dị ka mkpụrụ. 13  Ị pụtara maka ịzọpụta ndị gị,+ ka i wee zọpụta onye i tere mmanụ. Ị kụriri onyeisi nke si n’ụlọ onye ajọ omume.+ Ị gbara ụlọ ahụ ọtọ malite na ntọala ya ruo n’elu ya.+ Sila. 14  I ji ngwá ọgụ ya mapuo+ ndị dike ya isi mgbe ha bịara dị ka oké ifufe ịla m n’iyi.+ Oké ọṅụ ha nwere dị nnọọ ka nke ndị kpebisiri ike iripịa onye nọ n’ahụhụ, bụ́ onye nọ n’ebe nzuzo.+ 15  I ji ịnyịnya gị gafee oké osimiri, gafee nnukwu mmiri.+ 16  M nụrụ ihe ndị a, afọ wee gbarụọ m; mgbe m nụrụ ụda ya, egbugbere ọnụ m mara jijiji; ọkpụkpụ m wee rewe ure;+ m mara jijiji n’ebe m nọ, m ga-anọrọ nwayọọ wee chere ụbọchị ahụhụ,+ chere mgbe ọ ga-adakwasị ndị mmadụ,+ ka o wee wakpo ha. 17  Ọ bụ ezie na osisi fig nwere ike ghara ịma ifuru,+ osisi vaịn nwekwara ike ghara ịmị mkpụrụ; osisi oliv nwere ike ghara ịmị mkpụrụ, mbara ala nwekwara ike ghara imepụta nri+ ọ bụla; ìgwè ewu na atụrụ ndị nọ n’ogige nwere ike nwụchaa, e nwekwara ike a gaghị enwe ìgwè ehi n’ogige ha;+ 18  Ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova;+ m ga-enwe aṅụrị n’ime Chineke nke nzọpụta m.+ 19  Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ ike m;+ ọ ga-emekwa ka ụkwụ m na-awụ ọsọ dị ka ụkwụ nne ele,+ ọ ga-emekwa ka m jee ije n’ebe ndị dị elu m.+Ntụziaka e nyere onye nduzi nke ụbọ akwara m.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji