Emọs 7:1-17
7 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova mere ka m hụ, lee! ọ na-eme ka e nwee ìgwè igurube n’oge mkpụrụ ndị a ghara n’ikpeazụ malitere ipulite.+ Lee! ọ bụ mkpụrụ ndị a ghara n’ikpeazụ mgbe e gbutesịịrị eze ahịhịa.
2 O wee ruo na mgbe ha tasịrị ahịhịa dị n’ala a, m sịrị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, gbaghara.+ Ònye ga-esi n’ụlọ Jekọb bilie? N’ihi na ọ dị obere!”+
3 Jehova wee gbanwee obi ya banyere ihe a.+ “Ọ gaghị eme,” ka Jehova kwuru.
4 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova mere ka m hụ, lee! Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-akpọ òkù ka e jiri ọkụ see okwu;+ o wee ripịa nnukwu ogbu mmiri, ripịakwa ibé ala.
5 M wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, o zuola.+ Ònye ga-esi n’ụlọ Jekọb bilie? N’ihi na ọ dị obere!”+
6 Jehova wee gbanwee obi ya banyere ihe a.+ “Nke ahụkwa agaghị eme,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
7 Nke a bụ ihe o mere ka m hụ, ma, lee, Jehova guzo ná mgbidi e ji eriri e ji atụ̀ ihe kwụ ọtọ+ wuo, o jikwa eriri ahụ n’aka.
8 Jehova wee sị m: “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” M wee sị: “Eriri e ji atụ̀ ihe kwụ ọtọ.” Jehova wee gaa n’ihu ikwu, sị: “Lee, ana m etinye eriri a n’etiti ndị m, bụ́ Izrel.+ M gakwaghị ahapụ ha.+
9 A ghaghị ime ka ebe ndị dị elu nke Aịzik+ tọgbọrọ n’efu, laakwa ebe nsọ+ dị iche iche nke Izrel n’iyi.+ M ga-eji mma agha bilie megide ụlọ Jeroboam.”+
10 Amazaya onye nchụàjà Betel+ wee zigara Jeroboam+ eze Izrel ozi, sị: “Emọs anọrọla n’ụlọ Izrel gbaara gị izu.+ Ala a agaghị edili okwu niile o kwuru.+
11 N’ihi na nke a bụ ihe Emọs kwuru, ‘A ga-eji mma agha gbuo Jeroboam; a ghaghịkwa ịdọrọ Izrel n’agha pụọ n’ala ya.’”+
12 Amazaya wee sị Emọs: “Onye ọhụụ,+ gbara ọsọ gawa ala Juda. Riwe ihe n’ebe ahụ, nọrọkwa n’ebe ahụ buwe amụma.
13 Ma ebukwala amụma ọzọ na Betel,+ n’ihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze,+ ọ bụkwa ebe ụlọ nsọ nke alaeze dị.”
14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma, abụghịkwa m nwa onye amụma;+ kama abụ m onye na-azụ anụ+ nakwa onye na-arụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ.
15 Jehova wee si n’ebe m nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ kpọrọ m. Jehova wee gaa n’ihu ịsị m, ‘Gaa buoro ndị m bụ́ Izrel amụma.’+
16 Ugbu a, nụrụ okwu Jehova, ‘Ị̀ na-asị: “Ebula amụma na a ga-eme Izrel ihe,+ ekwukwala na a ga-eme+ ụlọ Aịzik ihe ọ bụla”?
17 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Nwunye gị ga-aghọ akwụna n’obodo.+ A ga-eji mma agha gbuo ụmụ gị ndị ikom nakwa ụmụ gị ndị inyom. A ga-ejikwa ụdọ e ji atụ̀ ihe kerie ala gị. Gị onwe gị kwa ga-anwụ n’ala na-adịghị ọcha;+ a ghaghịkwa ịdọrọ Izrel n’agha pụọ n’ala ya.”’”+