Diuterọnọmi 4:1-49

4  “Ugbu a, Izrel, gee ntị n’ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị m na-akụziri unu ka unu debe, ka unu wee dị ndụ,+ ka unu wee banyekwa ma weghara ala ahụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-enye unu.  Unu atụkwasịla ihe n’okwu m na-enye unu n’iwu taa, unu ewepụkwala ihe na ya,+ ka unu wee debe iwu Jehova bụ́ Chineke unu nke m na-enye unu taa.  “Unu ji anya unu hụ ihe Jehova mere n’ihe metụtara Bel nke Piọ,+ na Jehova bụ́ Chineke gị lara onye ọ bụla nke sooro Bel nke Piọ n’iyi n’etiti unu.+  Ma unu niile ndị na-arapara+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu nọ dịcha ndụ taa.  Lee, akụziworo m unu ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe,+ dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke m nyere m n’iwu, ka unu wee mee otú ahụ n’ala ahụ unu na-aga inweta.  Debenụ ha, meekwanụ ha, n’ihi na nke a ga-egosi na unu nwere amamihe+ nakwa na unu nwere nghọta+ n’anya ndị ga-anụ banyere ụkpụrụ ndị a niile, ha ga-asịkwa, ‘N’ezie, mba ukwu a bụ ndị maara ihe ma nwee nghọta.’+  N’ihi na olee mba ukwu+ nke nwere chi ndị nọ ya nso otú Jehova bụ́ Chineke anyị si nọrọ anyị nso mgbe niile anyị na-akpọku ya?+  Oleekwa mba ukwu nke nwere ụkpụrụ na mkpebi ikpe ziri ezi dị ka iwu a dum m na-enye unu taa?+  “Naanị lezie anya, cheekwa mkpụrụ obi gị nche nke ọma,+ ka i wee ghara ichefu ihe ndị anya gị hụworo,+ ka ha gharakwa ịpụ n’obi gị n’ụbọchị niile nke ndụ gị;+ meekwa ka ụmụ gị na ụmụ ụmụ gị mara ha,+ 10  n’ụbọchị i guzoro n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị na Horeb,+ mgbe Jehova sịrị m, ‘Kpọkọtara m ndị a niile ka m mee ka ha nụ okwu m,+ ka ha wee mụta ịtụ egwu+ m n’ụbọchị niile ha dị ndụ n’ala ahụ, ka ha kụziekwara ya ụmụ ha.’+ 11  “Unu wee bịa nso ma guzo n’ala ala ugwu ahụ, ugwu ahụ nọkwa na-ere ọkụ ruo n’etiti eluigwe; itiri, ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbachiri.+ 12  Jehova wee si n’etiti ọkụ+ ahụ malite ịgwa unu okwu. Olu okwu ka unu nụrụ, ma ọ dịghị ọdịdị+ ọ bụla unu hụrụ—ọ dịghị ma e wezụga olu unu nụrụ.+ 13  O wee kọwaara unu ọgbụgba ndụ ya,+ nke o nyere unu iwu ka unu na-edebe, bụ́ Okwu Iri ahụ,+ e mesịa, o dere ha n’elu mbadamba nkume abụọ.+ 14  Ọ bụkwa m ka Jehova nyere iwu n’oge ahụ ka m kụziere unu ụkpụrụ na mkpebi ikpe, ka unu wee na-edebe ha n’ala ahụ unu na-agafe inweta.+ 15  “Cheekwanụ mkpụrụ obi unu+ nche nke ọma, n’ihi na ọ dịghị ọdịdị+ unu hụrụ n’ụbọchị Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu na Horeb, 16  ka unu wee ghara ime omume na-eweta mbibi,+ gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+ 17  ihe yiri anụ ọhịa ọ bụla nke nọ n’ụwa,+ ihe yiri anụ ufe ọ bụla nke nwere nku nke na-efe n’eluigwe,+ 18  ihe yiri ihe ọ bụla na-agagharị n’ala, ihe yiri azụ̀+ ọ bụla nke nọ na mmiri n’okpuru ụwa; 19  ka ị gharakwa ileli anya n’eluigwe ma hụ anyanwụ na ọnwa na kpakpando, bụ́ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe, e wee rafuo gị, i wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha,+ bụ́ ihe Jehova bụ́ Chineke gị kenyere ndị niile nọ n’okpuru eluigwe dum.+ 20  Kama ọ bụ unu ka Jehova kpọọrọ ka ọ kpọpụta unu n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè,+ n’Ijipt, ka unu bụrụ otu ndị ọ bụ naanị ya nwe+ dị ka ọ dị taa. 21  “Jehova wee weso m oké iwe n’ihi unu,+ nke mere na ọ ṅụrụ iyi na mụ agaghị agafe Jọdan ma ọ bụ banye n’ezi ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị.+ 22  N’ihi na m ga-anwụ n’ala a.+ Agaghị m agafe Jọdan, ma unu ga-agafe ya, unu ga-enwetakwa ezi ala a. 23  Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, nke unu na ya gbara,+ ka unu gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị iwu banyere ya.+ 24  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ọkụ na-erepịa ihe,+ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.+ 25  “Ọ bụrụ na i nwee ụmụ na ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume na-eweta mbibi+ wee mee ihe oyiyi a pịrị apị,+ bụ́ ọdịdị nke ihe ọ bụla, ọ bụrụkwa na i mee ihe ọjọọ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị+ iji kpasuo ya iwe, 26  ana m ewere eluigwe na ụwa+ dị ka ndị akaebe megide unu taa, na unu ga-alarịrị n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. Ụbọchị unu ga-ebi na ya agaghị adị ọtụtụ, n’ihi na a ga-alarịrị unu n’iyi.+ 27  Jehova ga-achụsasịkwa unu n’etiti ndị dị iche iche,+ a ga-emekwa ka unu fọdụ mmadụ ole na ole+ n’etiti mba ndị Jehova ga-achụga unu. 28  N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+ 29  “Ọ bụrụ na unu esi n’ebe ahụ chọọ Jehova bụ́ Chineke gị, ị ga-achọtakwa ya,+ n’ihi na ị ga-eji obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum jụọ ase ya.+ 30  Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke+ gị wee gee ntị n’olu ya.+ 31  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ Chineke ebere.+ Ọ gaghị agbahapụ gị ma ọ bụ laa gị n’iyi ma ọ bụ chefuo ọgbụgba ndụ+ nna nna gị hà nke ọ ṅụụrụ ha n’iyi. 32  “Biko, jụọ ajụjụ banyere oge gara aga+ nke dịrị tupu a mụọ gị, malite n’ụbọchị Jehova kere mmadụ n’elu ụwa,+ malitekwa n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ọzọ nke eluigwe, È nwetụla oké ihe e mere nke yiri nke a, ka è nwetụla ihe a nụrụ nke yiri ya?+ 33  È nwetụla ndị ọ bụla ọzọ nụrụ ka olu Chineke si n’etiti ọkụ na-ekwu okwu dị ka gị onwe gị nụrụ ya ma ka dịrị ndụ?+ 34  Ka Chineke ọ̀ nwara iji ihe nnwapụta,+ ihe ịrịba ama+ na ọrụ ebube+ na agha+ na aka dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ na ihe na-eme ka a tụọ oké egwu+ si n’etiti mba ọzọ kpọpụtara onwe ya otu mba, dị ka ihe niile Jehova bụ́ Chineke unu meere unu n’Ijipt n’ihu unu si dị? 35  E gosiwo gị ya, ka i wee mara na Jehova bụ ezi Chineke;+ e nweghị ọzọ ma e wezụga ya.+ 36  O si n’eluigwe mee ka ị nụrụ olu ya iji gbazie gị; n’elu ala kwa, o mere ka ị hụ oké ọkụ ya, ị nụkwara okwu ya site n’etiti ọkụ.+ 37  “Ma ị ka dị ndụ, n’ihi na ọ hụrụ nna nna gị hà n’anya, nke mere na ọ họọrọ mkpụrụ ha ndị nọchiri ha+ wee jiri oké ike ya kpọpụta gị n’Ijipt n’ihu ya,+ 38  iji chụpụ mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa gị n’ihu gị, ka o wee kpọbata gị, iji nye gị ala ha ka ọ bụrụ ihe nketa gị dị ka ọ dị taa.+ 39  Ị makwaara nke ọma taa, chetakwa na Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa.+ E nweghị ọzọ.+ 40  Debe ụkpụrụ ya+ na iwu ya nke m na-enye gị taa, ka ihe wee gaziere gị+ na ụmụ gị ndị ga-anọchi gị, nakwa ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị,+ mgbe niile.” 41  N’oge ahụ, Mozis wepụtara obodo atọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan,+ 42  ka onye gburu mmadụ wee gbaga n’ebe ahụ, bụ́ onye gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ama,+ ebe ọ na-akpọbughị ya asị;+ ọ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị a wee dịrị ndụ,+ 43  bụ́ Biza nke dị n’ala ịkpa, n’ala dị larịị, maka ụmụ Ruben, nakwa Remọt nke dị na Gilied, maka ụmụ Gad, nakwa Golan nke dị na Beshan, maka ụmụ Manase. 44  Nke a bụ iwu+ Mozis nyere ụmụ Izrel. 45  Ndị a bụ ihe àmà+ na ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe+ ndị Mozis gwara ụmụ Izrel mgbe ha si n’Ijipt pụta, 46  n’ógbè Jọdan na ndagwurugwu dị n’ihu Bet-piọ,+ n’ala Saịhọn eze ndị Amọraịt, bụ́ onye biri na Heshbọn,+ onye Mozis na ụmụ Izrel meriri mgbe ha si n’Ijipt pụta.+ 47  Ha wee weghara ala ya na ala Ọg+ eze Beshan, bụ́ eze abụọ nke ndị Amọraịt ndị nọ n’ógbè Jọdan nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, 48  malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn, ruo n’Ugwu Sayọn, ya bụ, Hemọn,+ 49  nakwa Araba dum+ nke dị n’ógbè Jọdan n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, ruo n’oké osimiri Araba+ n’ala ala mkpọda Pisga.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji