Diuterọnọmi 29:1-29
29 Ihe ndị a bụ okwu ọgbụgba ndụ nke Jehova nyere Mozis iwu ka ya na ndị Izrel gbaa n’ala Moab ma e wezụga ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara na Horeb.+
2 Mozis wee kpọkọta Izrel dum, sị ha: “Ọ bụ unu hụrụ ihe niile Jehova mere Fero na ndị niile na-ejere ya ozi na ala ya dum n’ihu unu, n’ala Ijipt,+
3 oké ihe nnwapụta ndị anya gị hụrụ,+ bụ́ oké ihe ịrịba ama+ na ọrụ ebube ndị ahụ.+
4 Ma ruo taa, Jehova enyeghị unu obi unu ga-eji mara ihe na anya unu ga-eji hụ ụzọ na ntị unu ga-eji nụ ihe.+
5 ‘N’ime afọ iri anọ m nọ na-edu unu n’ala ịkpa,+ uwe unu yi n’ahụ́ akaghị nká, akpụkpọ ụkwụ unu yi n’ụkwụ akaghịkwa nká.+
6 Unu erighị achịcha,+ unu aṅụghịkwa mmanya na ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu, ka unu wee mara na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu.’
7 N’ikpeazụ, unu rutere ebe a, Saịhọn eze Heshbọn+ na Ọg+ eze Beshan pụtakwara ibuso anyị agha, ma anyị meriri ha.+
8 E mesịa, anyị weere ala ha nye ụmụ Ruben na ụmụ Gad nakwa ọkara ebo ụmụ Manase ka ọ bụrụ ihe nketa ha.+
9 Ya mere, debenụ okwu ọgbụgba ndụ a ma mee ha, ka unu wee mee ka ihe niile unu ga-eme gaa nke ọma.+
10 “Unu niile guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu taa, ya bụ, ndị isi nke ebo unu niile, ndị okenye unu na ndị isi unu, nwoke ọ bụla n’Izrel,+
11 ụmụntakịrị unu, ndị nwunye unu,+ ndị mbịarambịa+ bụ́ ndị nọ n’ebe ị mara ụlọikwuu, malite n’onye na-akpatara gị nkụ ruo n’onye na-esetara gị mmiri,
12 ka gị na Jehova bụ́ Chineke gị wee gbaa ndụ+ site n’ịṅụ iyi, bụ́ ndụ gị na Jehova bụ́ Chineke gị na-agba taa;+
13 ka o wee mee ka unu bụrụ ndị ya taa,+ ka o wee bụrụ Chineke gị,+ dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa, dịkwa nnọọ ka ọ ṅụụrụ nna nna gị hà bụ́ Ebreham,+ Aịzik+ na Jekọb+ iyi.
14 “Ọ bụghị naanị mụ na unu na-agba ndụ a ma na-aṅụ iyi a,+
15 kama ọ bụ anyị na onye anyị na ya guzo n’ebe a taa n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị nakwa ndị na-esoghị anyị nọrọ n’ebe a taa;+
16 (n’ihi na unu onwe unu maara nke ọma otú anyị si bie n’ala Ijipt nakwa otú anyị si gafere n’etiti mba ndị unu si na ha gafere.+
17 Unu nọkwa na-ahụ ihe arụ ha na arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ bụ́ osisi na nkume, ọlaọcha na ọlaedo, ndị ha nwere;)
18 ka e wee ghara inwe taa n’etiti unu nwoke ma ọ bụ nwaanyị ma ọ bụ ezinụlọ ma ọ bụ ebo nke obi ya na-esi n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ pụọ ịga fee chi dị iche iche nke mba ndị ahụ ofufe;+ ka e wee ghara inwe mgbọrọgwụ nke na-amịpụta mkpụrụ osisi na-egbu mmadụ nakwa ahịhịa ilu n’etiti unu.+
19 “Ọ ga-erukwa na mgbe mmadụ nụrụ okwu nke iyi a a ṅụrụ,+ o wee gọzie onwe ya n’obi ya, sị, ‘M ga-enwe udo,+ ọ bụ ezie na m ga na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi m si dị,’+ buru n’obi ikpochapụ ma onye na-aṅụju mmiri afọ ma onye akpịrị na-akpọ nkụ,
20 Jehova agaghị achọ ịgbaghara ya,+ kama iwe+ na ekworo+ Jehova ga-adị ọkụ megide onye ahụ,+ ọbụbụ ọnụ dum e dere n’akwụkwọ+ a ga-adakwasị ya, Jehova ga-ehichapụkwa aha ya n’okpuru eluigwe.
21 Jehova ga-ekewapụkwa+ ya n’ebo niile nke Izrel ka ọdachi dakwasị ya dị ka ọbụbụ ọnụ dum nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere n’akwụkwọ iwu a si dị.
22 “Ọgbọ nke dị n’ihu, bụ́ ụmụ unu ndị ga-anọchi unu, na onye mba ọzọ nke ga-esi n’ala dị anya bịa, ga-asị, mgbe ha hụrụ ihe otiti nke ala ahụ na nrịanrịa ya ndị Jehova ji sogbuo ya,+
23 bụ́ sọlfọ na nnu+ na ọkụ,+ nke mere na a gaghị akụ ihe n’ala ya dum, ihe agaghịkwa epulite na ya, ahịhịa ndụ agaghịkwa epu na ya, dị ka mgbe a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,+ Adma+ na Zeboyim,+ bụ́ ndị Jehova ji iwe na ọnụma kwatuo;+
24 ee, mba niile ga-asị, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a ihe dị otú a?+ Gịnị kpatara oké iwe nke a dị oké ọkụ?’
25 Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ+ Jehova bụ́ Chineke nke ndị nna nna ha, bụ́ nke ya na ha gbara mgbe ọ kpọpụtara ha n’ala Ijipt.+
26 Ha wee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala, bụ́ chi ndị ha na-amaghị, ndị ọ na-enyeghịkwa ha.+
27 Jehova wee weso ala ahụ iwe dị ọkụ site n’ime ka nkọcha dum e dere n’akwụkwọ a dakwasị ya.+
28 N’ihi ya, Jehova ji iwe+ na ọnụma na oké iwe fopụ ha n’ala ha, wee tụga ha n’ala ọzọ dị ka ọ dị taa.’+
29 “Ihe e zoro ezo+ dịịrị Jehova bụ́ Chineke anyị, ma ihe e kpughere ekpughe+ dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe a na-akaghị aka, ka anyị wee mee ihe niile e kwuru n’iwu a.+