Diuterọnọmi 22:1-30
22 “Ị gaghị ahụ ehi nwanne gị ma ọ bụ atụrụ ya nke na-akpafu akpafu ma mara ama hapụ ya.+ Hụ na i dughachiteere ya nwanne gị.+
2 Ọ bụrụ na nwanne gị anọghị gị nso, ị maghịkwa onye ọ bụ, ị ga-akpụrụ ya lọta n’ụlọ gị, ọ ga-anọkwa n’ụlọ gị ruo mgbe nwanne gị ga-achọwa ya. Ị ga-akpụrụkwa ya kpụnye ya.+
3 Otú ahụkwa ka ị ga-eme ịnyịnya ibu ya, otú ahụkwa ka ị ga-eme ákwà mgbokwasị ya, otú ahụkwa ka ị ga-eme ihe ọ bụla bụ́ nke nwanne gị, nke furu efu, bụ́ nke funahụrụ ya i wee hụ ya. Ahapụla ya.
4 “Ị gaghị ahụ ịnyịnya ibu nwanne gị nwoke ma ọ bụ ehi ya ka ọ dara n’ụzọ ma mara ama hapụ ya. Hụ na i nyeere ya aka mee ka o bilie.+
5 “E kwesịghị iyiwe nwaanyị uwe nwoke, nwoke ekwesịghịkwa igbokwasị ákwà nwaanyị;+ n’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.
6 “Ọ bụrụ na ị hụrụ akwụ́ nnụnụ n’ihu gị mgbe ị na-aga n’ụzọ, n’elu osisi ọ bụla ma ọ bụ n’ala, bụ́ nke ụmụ ọhụrụ+ nọ n’ime ya ma ọ bụ nke àkwá dị n’ime ya, ọ bụrụkwa na nne nnụnụ ahụ kpudoro ụmụ ọhụrụ ma ọ bụ kpu n’àkwá, achịrịla nne nnụnụ ahụ na ụmụ ya.+
7 Hụ na ị chụpụrụ nne ha, ma i nwere ike ịchịrị ụmụ ya; ka ihe wee gaziere gị, ka ụbọchị gị wee dị ogologo.+
8 “Ọ bụrụ na ị na-ewu ụlọ ọhụrụ, rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ gị,+ ka i wee ghara ime ka ikpe ọbara ma ụlọ gị n’ihi na mmadụ nwere ike isi na ya dapụ.
9 “Aghakọtala ụdị mkpụrụ abụọ n’ubi vaịn gị,+ ka ihe dum mkpụrụ ị ga-agha mịpụtara nakwa ihe si n’ubi vaịn gị wee ghara ịghọ ihe dịịrị ebe nsọ.
10 “Ejikọtala ehi na ịnyịnya ibu ọnụ wee jiri ha na-akọ ihe.+
11 “Eyila uwe e ji ajị anụ na eri linin mee.+
12 “Ị ga-emere onwe gị ihe dị yọrị yọrị na nsọtụ anọ nke ákwà ị na-egbokwasị n’ahụ́.+
13 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye, ya na ya enwee mmekọahụ, o wee kpọ ya asị,+
14 o wee bo ya ebubo na o mere arụ ma wetara ya aha ọjọọ,+ wee sị, ‘Onye a bụ nwaanyị m lụrụ, m wee garuo ya nso, ahụghịkwa m ihe na-egosi na ọ maghị nwoke’;+
15 nna nwa agbọghọ ahụ na nne ya ga-ewepụtakwa ihe na-egosi na nwa agbọghọ ahụ amaghị nwoke wee gosi ndị okenye obodo n’ọnụ ụzọ ámá;+
16 nna nwa agbọghọ ahụ ga-agwakwa ndị okenye ahụ, sị, ‘Ekenyere m nwoke a nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, o wee kpọ ya asị.+
17 Ma, lee, ọ na-ebo ya ebubo na o mere arụ,+ sị: “Achọpụtawo m na nwa gị nwaanyị enweghị ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.”+ Ma nke a bụ ihe na-egosi na nwa m nwaanyị amaghị nwoke.’ Ha ga-agbasa ákwà mgbokwasị ahụ n’ihu ndị okenye obodo ahụ.
18 Ndị okenye+ obodo ahụ ga-akpọ nwoke ahụ wee dọọ ya aka ná ntị.+
19 Ha ga-erikwa ya iwu otu narị shekel ọlaọcha ma were ya nye nna nwa agbọghọ ahụ, n’ihi na o wetaara nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Izrel aha ọjọọ;+ ọ ga-abụ nwunye ya. A gaghịkwa ekwe ka ọ gbaa ya alụkwaghịm ụbọchị ya niile.
20 “Otú ọ dị, ọ bụrụ na ihe a abụrụ eziokwu, na a hụghị ihe na-egosi na nwa agbọghọ ahụ amaghị nwoke,+
21 ha ga-akpọpụta nwa agbọghọ ahụ n’ihu ụlọ nna ya, ndị ikom obodo ya ga-eji nkume tụgbuo ya, n’ihi na o mewo ihe nzuzu na-eweta ihere+ n’Izrel site n’ịgba akwụna n’ụlọ nna ya.+ Ị ga-esi otú a kpochapụ ihe ọjọọ n’etiti unu.+
22 “Ọ bụrụ na a hụ ka nwoke na nwunye onye ọzọ dina,+ ha abụọ ga-anwụkọ ọnụ, nwoke ahụ na nwaanyị ahụ ya na ya dina.+ Ị ga-esi otú a kpochapụ ihe ọjọọ n’Izrel.+
23 “Ọ bụrụ na e nwee nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke nwoke kwere nkwa ọlụlụ,+ nwoke ọzọ ewee hụ ya n’obodo, ya na ya ewee dinaa,+
24 unu ga-akpọpụta ha abụọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma were nkume tụgbuo ha. Nwa agbọghọ ahụ ga-anwụ n’ihi na o tighị mkpu n’obodo, nwoke ahụ ga-anwụkwa n’ihi na o wedara nwunye nwoke ibe ya n’ala.+ Ị ga-esi otú a kpochapụ ihe ọjọọ n’etiti unu.+
25 “Otú ọ dị, ọ bụrụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ nwa agbọghọ e kwere nkwa ọlụlụ, nwoke ahụ ewee bagide ya ma dinaa ya, nwoke ahụ nke dinara ya ga-anwụ naanị ya,
26 emela nwa agbọghọ ahụ ihe ọ bụla. Nwa agbọghọ ahụ emeghị mmehie kwesịrị ọnwụ, n’ihi na ihe a dị nnọọ ka mgbe mmadụ biliri wakpo mmadụ ibe ya wee gbuo ya,+ ya bụ, gbuo mkpụrụ obi.
27 N’ihi na ọ bụ n’ọhịa ka ọ hụrụ ya. Nwa agbọghọ ahụ e kwere nkwa ọlụlụ tiri mkpu, ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.
28 “Ọ bụrụ na nwoke hụrụ nwa agbọghọ, bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, onye a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ, o wee bagide ya ma dinaa ya,+ e wee hụ ha,+
29 nwoke ahụ nke dinara ya ga-enye nna nwa agbọghọ ahụ shekel ọlaọcha iri ise,+ ọ ga-aghọkwa nwunye ya n’ihi na o wedara ya n’ala. A gaghị ekwe ka ọ gbaa ya alụkwaghịm ụbọchị ya niile.+
30 “Ọ dịghị onye kwesịrị ịkpọrọ nwunye nna ya, ka o wee ghara ikpuli uwe mwụda nna ya.+