Diuterọnọmi 20:1-20

20  “Ọ bụrụ na ị gaa ibuso ndị iro gị agha, i wee hụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha na ndị mmadụ dị ọtụtụ karịa gị, atụla ha egwu; n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị,+ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt,+ nọnyeere gị.  Ọ ga-erukwa na mgbe ị garuru nso n’ọgbọ agha, onye nchụàjà ga-abịa gwa ndị Izrel okwu.+  Ọ ga-asị ha, ‘Nụrụnụ, Izrel, unu na-agaru nso taa ibuso ndị iro unu agha. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri.+ Unu atụla egwu wee jiri ụjọ gbaa ọsọ ma ọ bụ maa jijiji n’ihi ha,+  n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-eje ije iburu unu agha megide ndị iro unu ka o wee zọpụta unu.’+  “Ndị isi agha+ ga-agwakwa ha, sị, ‘È nwere onye wuru ụlọ ọhụrụ nke na-agbapebeghị ya? Ya laghachi n’ụlọ ya, a dịghị ama ama ya anwụọ n’agha, onye ọzọ ewee gbapee ya.+  È nwere onye kọrọ ubi vaịn nke na-amalitebeghị ịghọrọ mkpụrụ ya? Ya laghachi n’ụlọ ya, a dịghị ama ama ya anwụọ n’agha, onye ọzọ ewee malite ịghọrọ mkpụrụ ya.+  È nwere onye kwere nwaanyị nkwa ọlụlụ nke na-alụbeghị ya? Ya laghachi n’ụlọ ya,+ a dịghị ama ama ya anwụọ n’agha, nwoke ọzọ ewee lụrụ ya.’  Ndị isi agha ahụ ga-agwa ha okwu ọzọ, sị, ‘È nwere onye na-atụ egwu, nke obi na-esighịkwa ike?+ Ya laghachi n’ụlọ ya, ka o wee ghara ime ka obi lọọ ụmụnna ya mmiri dị ka obi na-alọ ya mmiri.’+  Ọ ga-erukwa na mgbe ndị isi agha gwasịrị ha okwu, ha ga-ahọpụta ndị ọchịagha nke ụsụụ ndị agha ka ha bụrụ ndị ndú ha. 10  “Ọ bụrụ na ị garuo obodo nso ibuso ya agha, gwa ha ihe ha ga-eme ka gị na ha wee mee udo. 11  Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na obodo ahụ azaa gị na ha chọrọ udo, o wee megheere gị ọnụ ụzọ ámá ya, ọ ga-erukwa na ndị niile nọ n’ime ya ga-aghọrọ gị ndị na-arụ ọrụ mmanye, ha ga na-ejekwara gị ozi.+ 12  Ma ọ bụrụ na o kweghị ka gị na ya mee udo,+ o wee buso gị agha, i wee nọchibido ya, 13  Jehova bụ́ Chineke gị ga-enyefe ya n’aka gị, ị ga-ejikwa ihu mma agha gbuo nwoke ọ bụla nọ n’ime ya.+ 14  Ọ bụ naanị ndị inyom na ụmụntakịrị+ na anụ ụlọ ka ị ga-achịrị, ị ga-ebukọrọkwa ihe ọ bụla dị n’obodo ahụ, ya bụ, ihe niile ị kwatara;+ ị ga-erikwa ihe niile ị kwatara n’aka ndị iro gị, bụ́ ndị Jehova bụ́ Chineke gị nyefere n’aka gị. 15  “Otú ahụ ka ị ga-eme obodo niile dị gị anya nke ukwuu, bụ́ ndị na-esoghị n’obodo ndị dị ná mba ndị a. 16  Ọ bụ naanị n’obodo niile nke ndị a Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị obodo ha ka ọ bụrụ ihe nketa gị ka ị na-agaghị ahapụ ihe ọ bụla na-eku ume ka ọ dịrị ndụ, 17  n’ihi na ị ga-ahụ na i bibiri ha, ya bụ, ndị Het na ndị Amọraịt, ndị Kenan na ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs,+ dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu; 18  ka ha wee ghara ịkụziri unu ime ihe arụ niile ha na-eme, bụ́ ndị ha na-emere chi ha, unu ewee mehie Jehova bụ́ Chineke unu.+ 19  “Ọ bụrụ na ị nọchibido obodo ruo ọtụtụ ụbọchị wee na-ebuso ya agha ka i weghara ya, ebibila osisi ndị dị na ya site n’igbu ha anyụike; n’ihi na ị ga-eri mkpụrụ ha, egbutukwala ha,+ n’ihi na osisi dị n’ọhịa ọ̀ bụ mmadụ nke mere ị ga-eji nọchibido ya? 20  Naanị osisi ị maara na ọ bụghị osisi a na-eri mkpụrụ ya eri ka ị ga-ebibi, ị ga-egbutu ya ma wuo ihe ị ga-eji nọchibido+ obodo ahụ nke na-ebuso gị agha, ruo mgbe ọ dara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji