Diuterọnọmi 15:1-23
15 “Mgbe afọ asaa ọ bụla gwụchara, ị ga-akagbu ụgwọ e ji gị.
2 Otú a ka ị ga-esi kagbuo ụgwọ e ji gị:+ onye ọ bụla e ji ụgwọ ga-akagbu ụgwọ ọ bụla mmadụ ibe ya ji ya. Ọ gaghị amanye mmadụ ibe ya ma ọ bụ nwanne ya ka ọ kwụọ ya ụgwọ,+ n’ihi na a ga-akpọsa ụgwọ a na-akagbu n’ihi Jehova.+
3 Onye mba ọzọ+ ka i nwere ike ịmanye ka ọ kwụọ ụgwọ; ma aka gị ga-ahapụ ihe gị ọ bụla nke nwanne gị ji.
4 Otú ọ dị, ọ dịghị onye kwesịrị ịda ogbenye n’etiti unu, n’ihi na Jehova aghaghị ịgọzi+ gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka i nweta dị ka ihe nketa,+
5 naanị ma ọ bụrụ na i gee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị wee lezie anya debe iwu a dum m na-enye gị taa.+
6 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzi gị dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa, ị ga-agbazinyekwa+ ọtụtụ mba ihe n’ibé, ma gị onwe gị agaghị agbazite ihe; ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.+
7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+
8 N’ihi na ị ga-emesapụrụ ya aka+ ma hụ na ị gbazinyere ya ihe n’ibé otú ọ chọrọ, bụ́ ihe ndị na-akpa ya.
9 Lezie anya ka okwu na-abaghị n’ihe ghara ịdị n’obi gị,+ sị, ‘Afọ nke asaa, bụ́ afọ m ga-akagbu ụgwọ e ji m, eruwo nso,’+ anya gị ewee ghara imere nwanne gị dara ogbenye ebere,+ i wee ghara inye ya ihe ọ bụla, nke ga-eme ka ọ kpọkuo Jehova n’ihi gị,+ o wee ghọọrọ gị mmehie.+
10 Hụ na i nyere ya ihe,+ enwela mwute n’obi gị mgbe ị na-enye ya ihe, n’ihi na ọ bụ nke a ga-eme ka Jehova bụ́ Chineke gị gọzie gị n’ihe ọ bụla ị na-eme nakwa n’ihe ọ bụla ị na-arụ.+
11 N’ihi na ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala gị.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu, sị, ‘Mesapụrụ nwanne gị aka, bụ́ onye nọ n’ahụhụ, nke dakwara ogbenye n’ala gị.’+
12 “Ọ bụrụ na e resị gị nwanne gị, ya bụ, nwoke Hibru ma ọ bụ nwaanyị Hibru,+ ọ bụrụkwa na o jeworo gị ozi afọ isii, n’ime afọ nke asaa ị ga-ahapụ ya ka ọ lawa wee bụrụ onye nweere onwe ya.+
13 Mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa wee bụrụ onye nweere onwe ya, agbawala ya aka mgbe ị na-ahapụ ya.+
14 Hụ na i nyere ya ihe si n’ìgwè ewu na atụrụ gị na ihe si n’ebe nzọcha mkpụrụ gị na ebe nzọchapụta mmanụ gị na ebe nzọchapụta mmanya gị. Ị ga-enye ya ihe dị ka Jehova bụ́ Chineke gị si gọzie gị.+
15 Ị ga-echetakwa na ị ghọrọ ohu n’ala Ijipt, Jehova bụ́ Chineke gị wee gbapụta gị.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị ihe a n’iwu taa.
16 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ọ sị gị, ‘M gaghị ahapụ gị!’ n’ihi na ọ hụrụ gị na ezinụlọ gị n’anya, ebe ọ bụ na ihe dịịrị ya mma mgbe gị na ya nọ,+
17 ị ga-edokwasị ntị ya n’ibo ụzọ, were ahà hapuo ya, ọ ga-abụkwa ohu gị ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Otú a kwa ka ị ga-eme ohu gị nwaanyị.
18 O kwesịghị ịbụ ihe siiri gị ike mgbe ị na-ahapụ ya ka ọ lawa wee bụrụ onye nweere onwe ya;+ n’ihi na ozi o jeere gị afọ isii bụ okpukpu abụọ nke ụgwọ ọrụ onye ọrụ e goro ego,+ Jehova bụ́ Chineke gị agọziwokwa gị n’ihe niile ị na-eme.+
19 “Ị ga-edo nke ọ bụla bụ́ oké e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị nakwa n’ìgwè ewu na atụrụ gị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Ejila ehi gị e bu ụzọ mụọ rụọ ọrụ, akpachakwala ajị ewu na atụrụ gị e bu ụzọ mụọ.+
20 N’ihu Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-anọ eri ya kwa afọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ,+ gị na ezinụlọ gị.
21 Ọ bụrụkwa na o nwere nkwarụ, daa ngwọrọ ma ọ bụ kpuo ìsì, ajọ nkwarụ ọ bụla, achụrụla ya Jehova bụ́ Chineke gị n’àjà.+
22 N’ime obodo gị ka ị ga-eri ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha ga-eri ya,+ dị ka a pụrụ iri nne mgbada na oké ele.+
23 Ọ bụ naanị ọbara ya ka ị na-agaghị eri.+ Ị ga-awụpụ ya n’ala dị ka mmiri.+