Abụ Ọma 97:1-12
97 Jehova aghọwo eze!+ Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.+Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.+
2 Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu;+Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze ya.+
3 Ọkụ na-aga n’ihu ya,+Ọ na-erepịakwa ndị niile na-emegide ya, bụ́ ndị gbara ya gburugburu.+
4 Àmụ̀mà ya mere ka ìhè dị n’elu ala;+Ụwa hụrụ ya wee nọrọ n’oké ihe mgbu.+
5 Ugwu dị iche iche gbazekwara dị ka mgbá aṅụ n’ihi Jehova,+N’ihi Onyenwe ụwa dum.+
6 Eluigwe ekwupụtawo ezi omume ya,+Ndị niile dị iche iche ahụwokwa ebube ya.+
7 Ka ihere mee ndị niile na-efe ihe oyiyi ọ bụla a pịrị apị ofufe,+Ndị ji chi na-abaghị uru na-anya isi.+Kpọọrọnụ ya isiala, unu chi niile.+
8 Jehova, Zayọn nụrụ mmeri i nwere wee malite ịṅụrị ọṅụ,+Obodo nta ndị dị na Juda malitekwara inwe obi ụtọ,+N’ihi mkpebi ikpe gị.+
9 N’ihi na gị onwe gị, Jehova, bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile;+Ị rịgowo n’ebe dị nnọọ elu wee karịa chi niile ọzọ.+
10 Unu ndị hụrụ Jehova n’anya,+ kpọọnụ ihe ọjọọ asị.+Ọ na-eche mkpụrụ obi nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche;+Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.+
11 Ìhè enwuworo onye ezi omume,+Ịṅụrị ọṅụ abịawokwara ndị obi ha ziri ezi.+
12 Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, unu ndị ezi omume,+Nyenụ aha nsọ ya ekele.+