Abụ Ọma 96:1-13

96  Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+Bụkuonụ Jehova abụ, unu ndị niile bi n’ụwa.+   Bụkuonụ Jehova abụ, gọzienụ aha ya.+Kwa ụbọchị, na-ekwusanụ ozi ọma banyere nzọpụta ya.+   Kọsaanụ ebube ya n’etiti mba niile,+Kọsaakwanụ ọrụ ya dị ebube n’etiti ndị niile dị iche iche.+   N’ihi na Jehova dị ukwuu,+ kwesịkwa nnọọ ka e too ya.E kwesịrị ịtụ ya egwu karịa chi niile ọzọ.+   N’ihi na chi niile nke ndị dị iche iche bụ chi na-abaghị uru;+Ma, ọ bụ Jehova kere eluigwe.+   Ebube na ịma mma dị n’ihu ya;+Ike na ịma mma dị n’ebe nsọ ya.+   Nyenụ Jehova otuto, unu ezinụlọ nke ndị dị iche iche,+Nyenụ Jehova otuto, kwuokwanụ na ọ dị ike.+   Nyenụ Jehova otuto kwesịrị aha ya;+Burunụ onyinye bata n’ogige ya.+   Yirinụ uwe mara mma nke dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala;+Tụọnụ egwu ya nke ukwuu*, unu ndị niile bi n’ụwa.+ 10  Kwuonụ n’etiti mba niile, sị: “Jehova aghọwo eze.+Elu ala guzosikwara ike nke na a pụghị ime ka ọ maa jijiji.+Ọ ga-eji ịkwụwa aka ọtọ kpechite ọnụ ndị dị iche iche.”+ 11  Ka eluigwe ṅụrịa ọṅụ, ka ụwa nweekwa aṅụrị.+Ka oké osimiri bigbọọ, ya na ihe jupụtara n’ime ya.+ 12  Ka ọhịa ṅụrịa ọṅụ, ya na ihe niile dị n’ime ya.+Ka osisi niile dị n’oké ọhịa tiekwa mkpu ọṅụ+ 13  N’ihu Jehova. N’ihi na ọ bịawo;+N’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe.+Ọ ga-ekpe elu ala ikpe n’ezi omume,+Ọ ga-ekpekwa ndị dị iche iche ikpe n’ikwesị ntụkwasị obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “Nọrọnụ n’oké ihe mgbu n’ihi ya.”