Abụ Ọma 94:1-23

94  Gị Chineke nke na-abọ ọbọ, bụ́ Jehova,+Chineke nke na-abọ ọbọ, nwuo dị ka ìhè!+   Bilie, gị Onyeikpe ụwa.+Kwụọ ndị mpako ụgwọ ihe ha mere.+   Jehova, ruo ole mgbe,+Ruo ole mgbe ka ndị ajọ omume ga-anọ na-aṅụrị ọṅụ?+   Ha na-ekwu ekwurekwu, ha na-ekwu ogologo okwu;+Ndị niile na-eme ihe ọjọọ na-eji onwe ha etu ọnụ.+   Jehova, ha na-echi ndị gị ọnụ n’ala,+Ha na-emekpakwa ihe nketa gị ahụ́.+   Ha na-egbu nwaanyị di ya nwụrụ na onye mbịarambịa,+Ha na-egbukwa nwa na-enweghị nna.+   Ha na-asịkwa: “Jaa adịghị ahụ ya;+Chineke Jekọb amaghịkwa ihe na-eme.”+   Ghọtanụ, unu ndị na-adịghị eche echiche;+Unu ndị nzuzu kwa, olee mgbe unu ga-enwe nghọta?+   Onye ahụ nke kere ntị, ọ́ pụghị ịnụ ihe?+Ma ọ bụ, Onye ahụ nke kere anya, ọ́ pụghị ịhụ ụzọ?+ 10  Onye ahụ nke na-agbazi mba niile, bụ́ Onye na-akụziri ndị mmadụ ihe,+Ọ́ pụghị ịba mba?+ 11  Jehova maara ihe ụmụ mmadụ na-eche, na ọ dị ka ume e kupụrụ ekupụ.+ 12  Jaa, obi ụtọ na-adịrị dimkpa ị na-agbazi,+Na onye ị na-akụzikwara iwu gị,+ 13  Iji mee ka obi ruo ya ala n’ụbọchị ọdachi,+Ruo mgbe a ga-egwu olulu maka onye ajọ omume.+ 14  N’ihi na Jehova agaghị ahapụ ndị ya,+Ọ gaghịkwa ahapụ ihe nketa ya.+ 15  N’ihi na a ga-amaliteghachi ikpe ikpe n’ezi omume,+Ndị niile obi ha ziri ezi ga na-agbasokwa ya. 16  Ònye ga-ebiliri m megide ndị ajọ omume?+Ònye ga-adụnyere m úkwù megide ndị na-eme ihe ọjọọ?+ 17  Ma ọ́ bụghị na Jehova nyeere m aka,+Ọ garaghị adị anya mkpụrụ obi m anwụọ pịị.+ 18  Mgbe m sịrị: “Ụkwụ ga na-ama m jijiji,”+Jehova, obiọma* gị nọ na-akwado m.+ 19  Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m,+Nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.+ 20  Gị na ocheeze nke na-akpata ahụhụ ùnu ga-ejikọ aka+Mgbe o ji iwu na-akpa nkata nsogbu?+ 21  Ha na-awakpo mkpụrụ obi onye ezi omume ajọ mwakpo,+Na-ekwukwa na ọbara onye aka ya dị ọcha na-eme ihe ọjọọ.+ 22  Ma Jehova ga-aghọrọ m ebe dị elu e wusiri ike,+Chineke m ga-aghọkwara m oké nkume bụ́ ebe mgbaba.+ 23  Ọ ga-emekwa ka ihe ọjọọ ha dịrị n’isi ha,+Ọ ga-ejikwa ọdachi nke ha laa ha n’iyi.+Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ala ha n’iyi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”