Abụ Ọma 92:1-15
Abụ olu ụtọ, abụ a na-abụ n’ụbọchị izu ike.
92 Ọ dị mma ikele Jehova ekele+Na ịbụku aha gị abụ olu ụtọ, gị Onye Kasị Elu;+
2 Ịkọ banyere obiọma* gị n’ụtụtụ+Nakwa ịkọ banyere ikwesị ntụkwasị obi gị n’abalị,+
3 Jiri une na ụbọ nwere akwara iri na-akọ banyere ya,+Jiri egwú na-ada ụda nke e ji ụbọ akwara na-akpọ na-akọ banyere ya.+
4 N’ihi na gị onwe gị, Jehova, emewo ka m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi ọrụ gị;M na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ọrụ aka gị.+
5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Jehova!+Echiche gị miri emi nke ukwuu.+
6 Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-adịghị eche echiche nke pụrụ ịmata ha,+Ọ dịghịkwa onye nzuzu nke pụrụ ịghọta ya.+
7 Mgbe ndị ajọ omume pulitere dị ka ahịhịa ndụ,+Ndị niile na-eme ihe ọjọọ ana-amakwa pokopoko,Ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.+
8 Ma gị onwe gị, Jehova, nọ n’elu ruo mgbe ebighị ebi.+
9 N’ihi na, lee! ndị iro gị ga-ala n’iyi, Jehova,+N’ihi na, lee! ndị iro gị ga-ala n’iyi;+A ga-achụsasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ.+
10 Ma ị ga-eme ka mpi m dị elu dị ka nke atụ́;+M ga-ete mmanụ ọhụrụ.+
11 M ga na-ele ndị iro m anya, na-achị ha ọchị;+Ntị m ga na-anụ banyere ndị na-ebili imegide m, bụ́ ndị na-eme ihe ọjọọ.
12 Onye ezi omume ga na-eto na-ebu dị ka nkwụ;+Ọ ga-agba agba dị ka osisi sida nke dị na Lebanọn.+
13 Ndị a kụrụ n’ụlọ Jehova,+N’ogige ụlọ Chineke anyị,+ ga na-ama pokopoko.
14 Ha ka ga na-eme nke ọma n’isi awọ́ ha,+Ha ka ga-agba agba, na-amakwa pokopoko,+
15 Ka ha wee na-akọ na Jehova bụ onye ezi omume.+Ọ bụ Oké Nkume m,+ onye na-adịghị eme ajọ omume.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”