Abụ Ọma 91:1-16

91  Onye ọ bụla nke bi n’ebe nzuzo+ nke Onye Kasị Elu+Ga-enwetara onwe ya ebe obibi na ndò nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+   M ga-asị Jehova: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike,+Chineke m, onye m ga-atụkwasị obi.”+   N’ihi na ọ ga-anapụta gị n’ọnyà nke onye na-achụ nta nnụnụ siri,+Napụtakwa gị n’ọrịa na-efe efe nke na-akpata nhụjuanya.+   Ọ ga-eji nku ya chebe gị,+Ị ga-agbabakwa n’okpuru nku ya.+Eziokwu ya+ ga-abụrụ gị ọta ukwu+ na mgbidi siri ike.   Ị gaghị atụ egwu ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’abalị,+Ma ọ bụ akụ́+ nke na-efe n’ehihie,   Ma ọ bụ ọrịa na-efe efe nke na-agagharị n’ọchịchịrị,+Ma ọ bụ ihe na-ebibi ihe n’etiti ehihie.+   Otu puku mmadụ ga-ada n’akụkụ gị,Puku iri adaakwa n’aka nri gị;Ma ọ gaghị abịaru gị nso.+   Ị ga na-ele naanị n’anya+Wee hụ ụgwọ a na-akwụ ndị ajọ omume.+   N’ihi na ị sịrị: “Jehova bụ ebe mgbaba m,”+I mewo ka Onye Kasị Elu bụrụ ebe obibi gị;+ 10  Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị gị,+Ọbụna ihe otiti agaghị eru ụlọikwuu gị nso.+ 11  N’ihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,+Ka ha chee gị nche n’ụzọ gị niile.+ 12  Ha ga-eji aka ha ghọrọ gị,+Ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume ọ bụla.+ 13  Ị ga-azọ nwa ọdụm na agwọ ubí ụkwụ;+Ị ga-azọkwasị nwa ọdụm tojuru etoju na nnukwu agwọ ụkwụ.+ 14  N’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu,+M ga-emekwara ya ụzọ mgbapụ.+M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.+ 15  Ọ ga-akpọku m, m ga-azakwa ya.+M ga-anọnyere ya n’oge ahụhụ.+M ga-anapụta ya ma bulie ya elu.+ 16  M ga-eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,+M ga-emekwa ka ọ hụ nzọpụta m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji