Abụ Ọma 90:1-17

Ekpere Mozis, onye nke ezi Chineke.+ 90  Jehova, gị onwe gị aghọworo anyị ezigbo ebe obibi+ Site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+   Tupu a mụọ ugwu dị iche iche,+Ma ọ bụ, tupu ị mụpụta ụwa+ na elu ala dị ka à ga-asị na ime mere gị,+Ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, ị bụ Chineke.+   Ị na-eme ka mmadụ efu laghachi n’ájá,+Ị na-asịkwa: “Laghachinụ, unu ụmụ mmadụ.”+   N’ihi na otu puku afọ dị ka ụnyaahụ n’anya gị mgbe ọ gafeworo,+Dịkwa ka otu oge nche n’abalị.+   I kpochapụwo ha;+ ha ewee ghọọ ụra efu;+N’ụtụtụ, ha na-adị ka ahịhịa ndụ nke na-agbanwe agbanwe.+   Ọ na-awa okooko n’ụtụtụ, na-agbanwekwa;+Ọ na-akpọnwụ n’uhuruchi, kpọọkwa nkụ.+   N’ihi na iwe gị emewo ka anyị laa n’iyi,+Ọnụma gị emewokwa ka anyị maa jijiji.+   I debewokwa njehie anyị kpọmkwem n’ihu gị,+Debekwa mmehie ndị anyị mere na nzuzo* n’ihu gị nke na-egbuke egbuke.+   N’ihi na iwe gị emewo ka ụbọchị niile anyị gwụchaa;+Anyị anọzuwo afọ ndụ anyị ngwa ngwa dị nnọọ ka okwu a takwunyere atakwunye.+ 10  Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa;+Ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ,+Ma ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ;+N’ihi na ha ga-agafe ngwa ngwa, anyị ewee ghara ịnọkwa.+ 11  Ònye maara otú iwe gị dịruru ọkụ,+Ònyekwa maara oké iwe gị ruo n’ókè e kwesịrị ịtụ egwu gị?+ 12  Kụziere anyị otú anyị ga-esi na-agụ ụbọchị anyị+Ka anyị wee nweta obi amamihe.+ 13  Jehova, biko, lọta!+ Ọ̀ ga-abụ ruo ole mgbe?+Nweekwa mwute n’ihi ndị ohu gị.+ 14  Jiri obiọma* gị mee ka afọ ju anyị n’ụtụtụ,+Ka anyị wee tie mkpu ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ ụbọchị niile nke ndụ anyị.+ 15  Mee ka anyị ṅụrịa ọṅụ nke ga-eru ụbọchị ole i mekpara anyị ahụ́,+Bụ́ afọ ole ọdachi dakwasịrị anyị.+ 16  Mee ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị,+Ka ha hụkwa ịma mma gị n’ahụ́ ụmụ ha.+ 17  Ka ịdị mma Jehova bụ́ Chineke anyị dịkwasị anyị,+Meekwa ka ọrụ aka anyị guzosiere anyị ike.+Ee, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “Mmehie anyị mere n’amaghị ama.”
Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”