Abụ Ọma 9:1-20

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Mọt-laben. Abụ olu ụtọ Devid. א [Alef] 9  M ga-eji obi m dum too gị, Jehova;+M ga-akọsa ọrụ gị niile dị ebube.+   M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’ime gị,+M ga-abụku aha gị abụ olu ụtọ, gị Onye Kasị Elu.+ ב [Bet]   Mgbe ndị iro m laghachiri azụ,+Ha ga-ada ma laa n’iyi n’ihu gị.+   N’ihi na i mewo ka m nweta ikpe ziri ezi na ihe ruuru m;+Ị nọdụwo n’ocheeze na-ekpe ikpe n’ezi omume.+ ג [Gimel]   Ị baworo mba dị iche iche mba,+ i bibiwo onye ajọ omume.+I hichapụwo aha ha ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+   Gị onye iro, e bibiwo gị ruo mgbe ebighị ebi,+Bibiekwa obodo ndị i fopụworo.+A gakwaghị akpọtụ ha aha.+ ה [Hee]   Ma Jehova ga-anọdụ n’ocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,+Mee ka ocheeze ya guzosie ike maka ikpe.+   Ya onwe ya ga-ekpekwa elu ala ikpe n’ezi omume;+Ọ ga-ekpe mba dị iche iche ikpe ziri ezi.+ ו [Wọọ]   Jehova ga-abụrụ onye ọ bụla e gburu mmụọ ya ebe dị elu e wusiri ike,+Ebe dị elu e wusiri ike n’oge ahụhụ.+ 10  Ndị maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,+N’ihi na gị onwe gị, Jehova, agaghị ahapụ ndị na-achọ gị.+ ז [Zayin] 11  Bụkuonụ Jehova, bụ́ onye bi na Zayọn,+ abụ olu ụtọ;Kọsaanụ ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche.+ 12  N’ihi na, mgbe ọ na-achọ ndị na-awụfu ọbara,+ ọ ga-echeta ndị nọ n’ahụhụ;+Ọ dịghị ihe ga-eme ka o chefuo mkpu ákwá nke ndị nọ n’ahụhụ.+ ח [Het] 13  Jehova, biko, meere m amara; hụ ahụ́ ndị kpọrọ m asị na-emekpa m,+Gị onye si n’ọnụ ụzọ ámá nke ọnwụ kulite m.+ 14  Ka m wee kọọ akụkọ ihe niile kwesịrị otuto ị na-eme+N’ọnụ ụzọ ámá+ nke ada bụ́ Zayọn,+Ka m wee ṅụrịa ọṅụ ná nzọpụta gị.+ ט [Tet] 15  Mba dị iche iche adabawo n’olulu ha gwuru;+Ụgbụ ha+ ji sie ọnyà ejidewo ha n’ụkwụ.+ 16  A marawo Jehova site n’ikpe o kpere.+Ihe onye ajọ omume ji aka ya na-eme emewo ka ọnyà ma ya.+Higeyọn. Sila. י [Yod] 17  Ndị ajọ omume+ ga-aga na Shiol,+Ọbụna mba niile ndị na-echefu Chineke.+ 18  N’ihi na ọ bụghị mgbe niile ka a ga-echefu ogbenye,+Ọ dịghịkwa mgbe olileanya ndị dị umeala n’obi ga-ala n’iyi.+ כ [Kaf] 19  Jehova, biko, bilie! Ekwela ka mmadụ efu ka gị ike.+Ka e kpee mba dị iche iche ikpe n’ihu gị.+ 20  Jehova, mee ka egwu jide ha,+Ka mba dị iche iche wee mara na ha bụ mmadụ efu.+ Sila.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji