Abụ Ọma 89:1-52

Maskil. Abụ ọma Itan onye Zira.+ 89  M ga-abụ abụ banyere obiọma* Jehova ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.+M ga-eji ọnụ m mee ka a mara ikwesị ntụkwasị obi gị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+   N’ihi na m sịrị: “Obiọma ga-adịgide ọbụna ruo mgbe ebighị ebi;+Ị ga-emekwa ka ikwesị ntụkwasị obi gị guzosie ike n’eluigwe.”+   “Mụ na onye m họọrọ agbawo ndụ;+Aṅụworo m ohu m Devid iyi, sị,+   ‘M ga-eme ka mkpụrụ gị guzosie ike ọbụna ruo mgbe ebighị ebi,+M ga-emekwa ka ocheeze gị dịrị+ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.’” Sila.   Jehova, eluigwe ga-eto ọrụ gị dị ịtụnanya,+Ee, ọ ga-etokwa ikwesị ntụkwasị obi gị n’ime ọgbakọ nke ndị nsọ.   N’ihi na ònye ka a pụrụ iji tụnyere Jehova n’eluigwe?+Ònye n’etiti ụmụ Chineke dị ka Jehova?+   A ga na-atụ egwu Chineke n’etiti ìgwè ndị nsọ ndị na-akpachi anya;+Ọ dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-atụ egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.+   Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha,+Ònye dị ike ka gị, Jaa?+Ikwesị ntụkwasị obi gị gbara gị gburugburu.+   Ị na-achị oké osimiri toro eto;+Mgbe ebili mmiri ya maliri, ọ bụ gị na-eme ka ọ dajụọ.+ 10  Gị onwe gị egwepịawo Rehab,+ ọbụna dị ka onye e gburu egbu.+I jiriwo ogwe aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.+ 11  Eluigwe bụ nke gị,+ ụwa bụkwa nke gị;+Elu ala na ihe jupụtara ya+—ọ bụ gị tọrọ ntọala ha.+ 12  Ugwu na ndịda—ọ bụ gị kere ha;+Tebọ+ na Hemọn+—ha na-etiku aha gị mkpu ọṅụ.+ 13  I nwere ogwe aka dị ike,+Aka gị dị ike,+Aka nri gị dị elu.+ 14  Ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze gị;+Obiọma na eziokwu na-abịa n’ihu gị.+ 15  Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eti mkpu ọṅụ.+Jehova, ọ bụ n’ìhè nke ihu gị ka ha na-eje ije.+ 16  Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi aha gị ogologo ụbọchị dum,+A na-ebuli ha elu site n’ezi omume gị.+ 17  N’ihi na ọ bụ gị na-eme ka ike ha dị ebube;+A na-emekwa ka mpi anyị dị elu site n’amara gị.+ 18  N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ọta anyị,+Ọ bụkwa Onye Nsọ Izrel nwe eze anyị.+ 19  N’oge ahụ, ị gwara ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ okwu n’ọhụụ,+I wee sị:“Enyeworo m onye dị ike aka;+Ebuliwo m onye a họọrọ n’etiti ndị mmadụ elu.+ 20  Ahọrọwo m Devid bụ́ ohu m;+Etewo m ya mmanụ m dị nsọ,+ 21  Bụ́ onye aka m ga-akwadosi ike,+Onye ogwe aka m ga-emekwa ka ọ dị ike.+ 22  Ọ dịghị onye iro ga na-anara ya ụtụ,+Ọ dịghịkwa nwa ajọ omume ọ bụla ga-emekpa ya ahụ́.+ 23  M gweriri ndị na-emegide ya n’ihu ya,+Ọ bụkwa ndị kpọrọ ya asị nke ukwuu ka m nọ na-eti ihe.+ 24  Ikwesị ntụkwasị obi m na obiọma m dị n’ahụ́ ya,+A na-ebuli mpi ya elu n’aha m.+ 25  Emewo m ka aka ya dịrị n’oké osimiri,+Meekwa ka aka nri ya dịrị n’osimiri.+ 26  Ya onwe ya na-akpọku m, sị, ‘Ị bụ Nna m,+Chineke m+ na Oké Nkume nke nzọpụta m.’+ 27  Mụ onwe m ga-eme ka ọ bụrụ ọkpara m,+Onye kasị elu ná ndị eze ụwa.+ 28  M ga-eme ka obiọma m nwere n’ebe ọ nọ dịruo mgbe ebighị ebi,+A gaghị emebi ọgbụgba ndụ mụ na ya.+ 29  M ga-eme ka mkpụrụ ya nọruo mgbe ebighị ebi,+Meekwa ka ocheeze ya dịgide dị ka ụbọchị niile nke eluigwe.+ 30  Ọ bụrụ na ụmụ ya ahapụ iwu m,+Ọ bụrụkwa na ha ejeghị ije ná mkpebi ikpe m,+ 31  Ọ bụrụ na ha emebie ụkpụrụ m,Gharakwa idebe ihe niile m nyere n’iwu, 32  M ga-eji ụtarị lebara mmebi iwu ha anya,+Jirikwa apịpịa lebara njehie ha anya.+ 33  Ma agaghị m akwụsị igosi ya obiọma m,+M gaghịkwa ahapụ ikwesị ntụkwasị obi m.+ 34  M gaghị emebi ọgbụgba ndụ m,+M gaghịkwa agbanwe okwu si n’egbugbere ọnụ m.+ 35  Ọ dị otu ihe m ṅụrụ n’iyi n’ịdị nsọ m,+M gaghị aghara Devid ụgha.+ 36  Mkpụrụ ya ga-anọru mgbe ebighị ebi,+Ocheeze ya ga-adịgidekwa dị ka anyanwụ n’ihu m.+ 37  Ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi dị ka ọnwa,Ọ ga-adịgidekwa dị ka onye akaebe kwesịrị ntụkwasị obi nke nọ na mbara igwe.” Sila. 38  Ma gị onwe gị ajụwo onye i tere mmanụ, ị na-elegharakwa ya anya;+I wesowo ya oké iwe.+ 39  I legharawo ọgbụgba ndụ gị na ohu gị anya;I merụwo okpueze ya site n’ịtụ ya n’ala.+ 40  Ị kwatuwo ogige anụ niile e ji nkume gbaa;+I bibiwo ebe ya niile e wusiri ike.+ 41  Ndị niile na-agafe n’ụzọ akwakọrọwo ihe ya;+Ọ ghọwo onye ndị agbata obi ya na-akọcha.+ 42  I mewo ka aka nri nke ndị na-emegide ya dị elu;+I mewo ka ndị iro ya niile ṅụrịa ọṅụ.+ 43  Mma agha ya ka ị na-emesokwa ọzọ dị ka onye iro,+I mewokwa ka ọ ghara inwe mmeri n’agha. 44  I mebiwo ịma mma ya,+Ị kwatuwo ocheeze ya n’ala.+ 45  I mewo ka oge okorobịa ya dị mkpụmkpụ;I mewo ka ihere ju ya ihu.+ Sila. 46  Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-ezonahụ m onwe gị? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?+Ọnụma gị ọ̀ ga na-ere ka ọkụ?+ 47  Cheta afọ ole m ga-adị ndụ.+Ọ̀ bụ naanị n’efu ka i kere ụmụ mmadụ niile?+ 48  Olee dimkpa dị ndụ nke na-agaghị anwụ anwụ?+Ọ̀ pụrụ imere mkpụrụ obi ya ụzọ ọ ga-esi gbanahụ Shiol?+ Sila. 49  Jehova, olee ebe obiọma niile ị na-egosibu anyị dị,Bụ́ nke i ji ikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid n’iyi?+ 50  Jehova, cheta nkọcha a na-akọcha ndị ohu gị,+Chetakwa otú m si buru nkọcha nke ndị niile dị iche iche n’obi uwe m,+ 51  Jehova, biko, cheta otú ndị iro gị si na-akọcha nzọụkwụ nke onye i tere mmanụ,+Otú ha si na-akọcha nzọụkwụ ya.+ 52  Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi. Amen na Amen.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”