Abụ Ọma 87:1-7
Abụ ọma ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ, abụ.
87 Ntọala ya dị n’ugwu nsọ.+
2 Jehova hụrụ ọnụ ụzọ ámá niile nke Zayọn n’anya+Karịa ụlọikwuu niile nke Jekọb.+
3 A na-ekwu okwu otuto banyere gị, gị obodo ezi Chineke.+ Sila.
4 M ga-agụnye Rehab+ na Babịlọn+ ná ndị maara m;Lee Filistia+ na Taya, ha na Kush:“A mụrụ nke ọ bụla n’ime ha n’ebe ahụ.”+
5 A ga-ekwukwa banyere Zayọn, sị:“N’ime ya ka a mụrụ nke ọ bụla n’ime ha.”+Onye Kasị Elu+ ga-emekwa ka o guzosie ike.+
6 Mgbe Jehova ga na-edeba aha ndị dị iche iche n’akwụkwọ, ọ ga-ekwu, sị:+“A mụrụ nke ọ bụla n’ime ha n’ebe ahụ.”+ Sila.
7 A ga-enwekwa ndị na-agụ egwú na ndị na-ete egwú a na-agba gburugburu na-ete,+ bụ́ ndị na-asị:“Isi iyi m niile dị n’ime gị.”+