Abụ Ọma 86:1-17

Ekpere Devid. 86  Jehova, biko, tọọ ntị n’ala. Za m,+N’ihi na anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye.+   Chebe mkpụrụ obi m, n’ihi na m na-eguzosi ike n’ihe.+Zọpụta ohu gị nke tụkwasịrị gị obi+—ị bụ Chineke m.   Jehova, biko, meere m amara,+N’ihi na ọ bụ gị ka m na-akpọku ogologo ụbọchị dum.+   Mee ka mkpụrụ obi ohu gị ṅụrịa ọṅụ,+N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, ka m na-enye mkpụrụ obi m.+   N’ihi na gị onwe gị, Jehova, dị mma,+ dịkwa njikere ịgbaghara mmehie;+Obiọma* ị na-egosi ndị na-akpọku gị dị ukwuu.+   Jehova, biko, gee ntị n’ekpere m;+Ṅaakwa ntị n’olu arịrịọ m.+   M ga-akpọku gị n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ,+N’ihi na ị ga-aza m.+   Ọ dịghị onye dị ka gị n’etiti chi niile, Jehova,+Ọ dịghịkwa ọrụ yiri ọrụ gị.+   Mba niile i kere ga-abịa,+Ha ga-akpọkwa isiala n’ihu gị, Jehova,+Nyekwa aha gị otuto.+ 10  N’ihi na ị dị ukwuu, na-emekwa ihe ndị dị ebube;+Ọ bụ naanị gị bụ Chineke.+ 11  Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+M ga-eje ije n’eziokwu gị.+Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.+ 12  M ji obi m dum na-eto gị, Jehova Chineke m,+M ga-enyekwa aha gị otuto ruo mgbe ebighị ebi, 13  N’ihi na obiọma ị na-egosi m dị ukwuu,+Ị napụtawokwa mkpụrụ obi m na Shiol, bụ́ ebe dị n’ime ime ala.+ 14  Chineke, ndị mpako ebiliwo imegide m;+Ìgwè ndị na-eme ihe n’aka ike na-achọ mkpụrụ obi m,+Ha adịghịkwa eme ka ị nọrọ n’ihu ha.+ 15  Ma gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke nke na-eme ebere, onye na-eme amara,+Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.+ 16  Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara.+Nye ohu gị ike gị,+Zọpụtakwa nwa ohu gị nwaanyị.+ 17  Mee ka ịdị mma gị pụta ìhè n’ahụ́ m,Ka ndị kpọrọ m asị wee hụ ya, ihere ewee mee ha.+N’ihi na gị onwe gị, Jehova, enyeworo m aka, kasiekwa m obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”