Abụ Ọma 84:1-12

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Gitit.+ Abụ ọma ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ. 84  Jehova nke ụsụụ ndị agha,+Lee ka m si hụ ụlọikwuu gị dị ebube n’anya!+   Agụụ ogige ụlọ Jehova agụkatala mkpụrụ obi m ike gwụ ya.+Mkpụrụ obi m na anụ ahụ́ m na-etiku Chineke dị ndụ mkpu ọṅụ.+   Jehova nke ụsụụ ndị agha, Eze m na Chineke m,Ọbụna nnụnụ enwetawo ebe obibi,Elekentịọba kpakwara akwụ́,Ná nnukwu ebe ịchụàjà gị, bụ́ ebe o debeworo ụmụ ya!   Obi ụtọ na-adịrị ndị bi n’ụlọ gị!+Ha ka na-eto gị.+ Sila.   Obi ụtọ na-adịrị ndị ị bụ ike ha,+Ndị obi ha dị n’ụzọ e si aga n’ụlọ gị.+   Mgbe ha na-agabiga na ndagwurugwu osisi beka,+Ha na-eme ka ọ ghọọ isi iyi;Onye ozizi ha+ ji ngọzi na-ekpuchi onwe ya.   Ha ga na-eje ije ma na-enwewanye ike;+Onye nke ọ bụla na-abịa n’ihu Chineke n’ime Zayọn.+   Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nụrụ ekpere m;+Ṅaa ntị, Chineke Jekọb.+ Sila.   Chineke, bụ́ ọta anyị, biko, hụrụ,+Lee onye i tere mmanụ anya n’ihu.+ 10  N’ihi na otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.+Ahọrọwo m iguzo n’ọnụ ụzọ ụlọ Chineke m+Karịa ịgagharị n’ụlọikwuu ajọ omume.+ 11  N’ihi na Jehova Chineke bụ anyanwụ+ na ọta;+Ọ na-emekwa ka mmadụ nweta ihu ọma na ebube.+Jehova agaghị ajụ inye ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọma.+ 12  Jehova nke ụsụụ ndị agha, obi ụtọ na-adịrị onye tụkwasịrị gị obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji