Abụ Ọma 82:1-8
Abụ olu ụtọ Esaf.
82 Chineke guzo ná nzukọ+ nke Onye Dị Ike;+Ọ na-ekpe ikpe n’etiti chi dị iche iche, na-asị:+
2 “Ruo ole mgbe ka unu ga na-ekpe ikpe na-ezighị ezi,+Na-ele ndị ajọ omume anya n’ihu?+ Sila.
3 Bụrụnụ ndị ikpe nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na nwa na-enweghị nna.+Kpeerenụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye ikpe ziri ezi.+
4 Meerenụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ụzọ mgbapụ;+Napụtanụ ha n’aka ndị ajọ omume.”+
5 Ha amaghị, ha adịghịkwa aghọta;+Ha na-ejegharị n’ọchịchịrị;+A na-eme ka ntọala niile nke ụwa maa jijiji.+
6 “Mụ onwe m ekwuwo, sị, ‘Unu bụ chi,+Unu niile bụ ụmụ nke Onye Kasị Elu.+
7 N’ezie, unu ga-anwụ dị nnọọ ka ndị mmadụ si anwụ;+Unu ga-adakwa dị ka onye ọ bụla n’ime ndị isi si ada!’”+
8 Chineke, biko, bilie kpee ụwa ikpe;+N’ihi na ọ bụ gị nwe mba niile.+