Abụ Ọma 80:1-19
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Okooko Lili.+ Ihe ncheta. Abụ ọma Esaf.+ Abụ olu ụtọ.
80 Onye na-azụ Izrel dị ka atụrụ, biko, gee ntị,+Gị onye na-edu Josef dị nnọọ ka ìgwè atụrụ.+Gị onye nọ ọdụ n’elu cherọb,+ nwuo dị ka ìhè.+
2 Kpọtee ike gị n’ihu Ifrem na Benjamin na Manase,+Bịa zọpụta anyị.+
3 Chineke, biko, kpọghachite anyị;+Mee ka ihu gị nwuo dị ka ìhè, ka e wee zọpụta anyị.+
4 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, ruo ole mgbe ka ekpere ndị gị ga na-ewe gị iwe?+
5 I mewo ka anya mmiri ghọọrọ ha nri,+I mekwara ka ha na-aṅụ anya mmiri dị ukwuu.+
6 I mere ka anyị ghọọ ihe ndị agbata obi anyị kwo na-alụ ọgụ,+Ndị iro anyị na-akwakwa anyị emo otú o si masị ha.+
7 Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, kpọghachite anyị;+Mee ka ihu gị nwuo dị ka ìhè, ka e wee zọpụta anyị.+
8 I mere ka otu osisi vaịn si n’Ijipt pụọ.+Ị nọ na-achụpụ mba dị iche iche, ka i wee kụọ ya.+
9 Ị sụchara ebe ị ga-akụ ya,+ ka o wee gbanye mgbọrọgwụ ma tochie ala ahụ.+
10 Ndò ya kpuchiri ugwu dị iche iche,Alaka ya kpuchikwara osisi sida Chineke kụrụ.+
11 O ji nwayọọ nwayọọ wasaa alaka ya ruo n’oké osimiri,+Wasaakwa ngalaba ya ruo n’Osimiri Yufretis.+
12 Gịnị mere i ji kwatuo mgbidi e ji nkume wuo gburugburu ya,+Gịnịkwa mere ndị niile na-agafe n’ụzọ ji na-aghọrọ mkpụrụ ya?+
13 Ézì ọhịa nọ na-ebibi ya,+Ìgwè anụ ọhịa na-atakwa ya.+
14 Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, lọghachite;+Si n’eluigwe ledata anya hụrụ, lekọtakwa osisi vaịn a,+
15 Na ogwe osisi aka nri gị kụrụ,+Legidekwa nwa gị nwoke anya, bụ́ onye i mere ka ọ dịrị gị ike.+
16 A na-agba ya ọkụ, na-egbutukwa ya.+Ha na-ala n’iyi n’ihi mba i ji ihu gị na-abara ha.+
17 Ka aka gị dịkwasị onye nọ gị n’aka nri,+Nwa nke mmadụ bụ́ onye i mere ka ọ dịrị gị ike,+
18 Anyị agaghịkwa esi n’ebe ị nọ laghachi azụ.+Chebe anyị ndụ, ka anyị wee kpọkuo aha gị.+
19 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, kpọghachite anyị;+Mee ka ihu gị nwuo dị ka ìhè, ka e wee zọpụta anyị.+