Abụ Ọma 8:1-9
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Gitit.+ Abụ olu ụtọ Devid.
8 Jehova bụ́ Onyenwe anyị, lee ka aha gị si dị ebube n’ụwa dum,+Gị onye a na-akọ akụkọ ịdị ebube ya n’eluigwe!+
2 I siwo n’ọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gosi ike gị,+N’ihi ndị na-ebuso gị iro,+Iji mee ka onye iro na onye na-abọ ọbọ kwụsị ihe ha na-eme.+
3 Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ihe mkpịsị aka gị rụrụ,+Ọnwa na kpakpando ndị i kere,+
4 Gịnị ka mmadụ efu bụ,+ nke mere i ji na-echeta ya,+Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ, nke mere i ji na-elekọta ya?+
5 I mekwara ya ka ọ dị ala karịa ndị dị ka chi,+I kpuwere ya ebube+ na ịma mma dị ka okpueze.+
6 I mere ka ọ na-achị ọrụ aka gị;+I dowokwa ihe niile n’okpuru ụkwụ ya:+
7 Ewu na atụrụ na ehi, ha niile,+Tinyekwara anụ ọhịa dị iche iche,+
8 Nnụnụ nke eluigwe na azụ̀ ndị dị n’oké osimiri,+Ihe ọ bụla nke na-agagharị n’oké osimiri.+
9 Jehova bụ́ Onyenwe anyị, lee ka aha gị si dị ebube n’ụwa dum!+