Abụ Ọma 79:1-13

Abụ olu ụtọ Esaf. 79  Chineke, ndị mba ọzọ abatawo n’ihe nketa gị;+Ha emerụwo ụlọ nsọ gị;+Ha emewo ka Jeruselem bụrụ mkpọmkpọ ebe.+   Ha emewo ka ozu ndị ohu gị ghọọrọ nnụnụ nke eluigwe ihe oriri,+Werekwa anụ ahụ́ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ nye anụ ọhịa nke ụwa.+   Ha awụpụwo ọbara ha dị ka mmiriNa Jeruselem dum, ọ dịghịkwa onye ga-eli ha.+   Anyị aghọworo ndị agbata obi anyị ihe nkọcha,+Ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ọchị na ihe ịkwa emo.+   Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga na-ewe oké iwe? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?+Ruo ole mgbe ka iwe gị ga na-enwu dị ka ọkụ?+   Wụkwasị mba ndị na-amaghị gị ọnụma gị,+Wụkwasịkwa alaeze ndị na-adịghị akpọku aha gị ọnụma gị.+   N’ihi na ha eripịawo Jekọb,+Ha emewokwa ka ebe obibi ya tọgbọrọ n’efu.+   Echetala njehie nna nna anyị hà wee taa anyị ahụhụ n’ihi ya.+Meere anyị ebere ọsọ ọsọ,+N’ihi na ike agwụla anyị kpamkpam.+   Nyere anyị aka, Chineke nke nzọpụta anyị,+N’ihi ebube nke aha gị;+Napụta anyị, kpuchiekwa mmehie anyị n’ihi aha gị.+ 10  Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+Ka anyị hụ mgbe a ga-eme ka a mara n’etiti mba niile+Ọbọ ị ga-abọ maka ọbara ndị ohu gị a wụfuru.+ 11  Ka ị nụ ude onye mkpọrọ na-asụ.+Dị ka ogwe aka gị si dị ukwuu, chebe ndị a mara ikpe ọnwụ.+ 12  Jehova, kwụọ ndị agbata obi anyị ụgwọ nkọcha ha kọchara gị,+Kwụọ ha ụgwọ okpukpu asaa, wụnye ya n’obi uwe ha.+ 13  Anyị bụ́ ndị gị na ìgwè atụrụ nke nọ n’ebe ịta nri gị,+Ga na-ekele gị ruo mgbe ebighị ebi;Anyị ga-akọ otuto gị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji