Abụ Ọma 78:1-72
Maskil. Abụ ọma Esaf.+
78 Ndị m, ṅaanụ ntị n’iwu m;+Tọọnụ ntị n’ala nụrụ okwu ọnụ m.+
2 M ga-emeghe ọnụ m tụọ ilu;+M ga-atụ ọtụtụ ilu a tụwara kemgbe oge dị anya gara aga,+
3 Bụ́ ndị anyị nụrụ, ndị anyị makwaara,+Ndị nna anyị hà kọọrọ anyị;+
4 Bụ́ ndị anyị na-adịghị ezoro ụmụ ha ezo,+Na-akọrọ ọbụna ọgbọ dị n’ihu ihe ndị a,+Bụ́ otuto Jehova na ike ya+Na ihe ndị dị ebube o mere.+
5 O wee debe ihe ncheta na Jekọb,+Meekwa ka e nwee iwu n’Izrel,+Bụ́ ihe o nyere nna nna anyị hà n’iwu,+Iji mee ka ụmụ ha mara ha;+
6 Ka ọgbọ nke na-abịa n’ihu, bụ́ ụmụ a ka ga-amụ, wee mara ha,+Ka ha wee bilie kọọrọ ha ụmụ ha,+
7 Ka ha wee nwee obi ike n’ebe Chineke nọ,+Gharakwa ichefu ihe Chineke mere,+ kama ka ha na-edebe ihe o nyere n’iwu.+
8 Ka ha wee ghara ịdị ka ndị nna nna ha,+Bụ́ ọgbọ dị isi ike, nke na-enupụkwa isi,+Ọgbọ nke na-edozighị obi ya,+Nke mmụọ ya na-atụkwasịghịkwa Chineke obi.+
9 N’agbanyeghị na ụmụ Ifrem bụ ndị na-agba ụta,+Ha gbara ọsọ n’ụbọchị agha.+
10 Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke,+Ha jụkwara ije ije n’iwu ya.+
11 Ha malitekwara ichefu ihe niile o mere+Nakwa ọrụ ya dị ebube ndị o mere ka ha hụ.+
12 O mere ihe dị ịtụnanya n’ihu ndị nna nna ha+N’ala Ijipt,+ n’ala Zoan.+
13 O kewara oké osimiri, ka o wee mee ka ha gafere,+O mekwara ka mmiri ya guzoro dị ka mmiri e gbochiri egbochi.+
14 O wee jiri ígwé ojii na-edu ha n’ehihie,+Jirikwa ìhè ọkụ na-edu ha ogologo abalị dum.+
15 O wee mee ka oké nkume gbawaa n’ala ịkpa,+Ka o wee mee ka ha ṅụjuo mmiri afọ dị ka à ga-asị na ha gara n’ogbu mmiri.+
16 O wee mee ka mmiri si na nkume dị elu gbapụta,+Meekwa ka mmiri na-asọdata dị ka osimiri.+
17 Ha wee na-emehie ya+Site n’inupụrụ Onye Kasị Elu isi n’ebe mmiri na-adịghị;+
18 Ha wee nwaa Chineke ọnwụnwa n’ime obi ha+Site n’ikwu ka e nye mkpụrụ obi ha ihe ọ ga-eri.+
19 Ha wee malite ikwu okwu megide Chineke.+Ha sịrị: “Chineke ò nwere ike inye anyị ihe oriri* n’ala ịkpa a?”+
20 Lee! Ọ kụrụ ihe n’oké nkume+Ka mmiri wee gbapụta, ka mmiri na-asọ asọ wee nupụtakwa.+“Ò nwekwara ike inye ndị ya ihe oriri,+Ka ọ̀ pụrụ ime ka ha nweta ihe ha ga-eri?”+
21 Ọ bụ ya mere Jehova ji wee oké iwe mgbe ọ nụrụ ya;+O mere ka ọkụ ree Jekọb,+O wee weso Izrel iwe dị ọkụ.+
22 N’ihi na ha enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ,+Ha atụkwasịghịkwa obi ná nzọpụta si n’aka ya.+
23 O wee nye ígwé ojii nke dị n’elu iwu,O meghekwara ọnụ ụzọ eluigwe.+
24 O wee mee ka mana na-ezoro ha dị ka mmiri ka ha rie,+O nyekwara ha nri si n’eluigwe.+
25 Ndị mmadụ riri nri nke ndị ka mmadụ ike;+O ziteere ha nri, ha wee rijuo afọ.+
26 O mere ka ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ malite ife n’eluigwe,+Jirikwa ike ya mee ka ifufe nke si n’ebe ndịda fee.+
27 O wee mee ka ihe oriri zooro ha dị ka mmiri, o wee dị ka ájá dị n’ala,+Meekwa ka anụ ufe zooro ha dị ka mmiri, o wee dị ka ájá dị n’oké osimiri.+
28 O wee mee ka ha na-ada n’etiti ebe ọ mara ụlọikwuu,+N’ebe niile n’ụlọikwuu ya.+
29 Ha wee rie ihe rijuo afọ nke ọma,+O nyekwara ha ihe na-agụ ha.+
30 Agụụ nke na-agụ ha ka nọ na-agụ ha,Mgbe ha ka kpụ nri ahụ n’ọnụ,+
31 Mgbe ọnụma Chineke lara elu megide ha.+O wee malite igbu ndị ha gbasiri ike;+O mekwara ka ụmụ okorobịa Izrel daa.
32 N’agbanyeghị ihe a dum, ha nọ na-emehie,+Ha enweghịkwa okwukwe n’ọrụ niile dị ebube ọ rụrụ.+
33 O wee mee ka ụbọchị ndụ ha gwụ dị ka à ga-asị na ọ bụ ume e kupụrụ ekupụ,+Meekwa ka afọ ndụ ha gwụ ná nsogbu.
34 Mgbe ọ bụla o gbuwere ha, ha na-achọ ya,+Ha na-alaghachi chọọ Chineke.+
35 Ha wee malite icheta na Chineke bụ Oké Nkume ha,+Nakwa na Chineke bụ́ Onye Kasị Elu bụ Onye na-abọrọ ha ọbọ.+
36 Ha wee nwaa iji ọnụ ha ghọgbuo ya;+Ha nwakwara iji ire ha ghaara ya ụgha.+
37 Obi ha adịgideghịkwa n’ebe ọ nọ;+Ha ekwesịghịkwa ntụkwasị obi n’ọgbụgba ndụ ya.+
38 Ma ọ na-eme ebere;+ ọ na-ekpuchi njehie ha,+ wee ghara ibibi ha.+O mekwara ka iwe ya dajụọ ọtụtụ ugboro,+Ọ dịghịkwa awụkwasị ha ọnụma ya dum.
39 Ọ nọgidere na-echeta na ha bụ anụ ahụ́,+Na mmụọ ha na-apụ apụ, ọ dịghịkwa alọghachite.+
40 Lee ugboro ole ha nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa,+Kpasuokwa ya iwe n’ọzara!+
41 Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro,+Ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.+
42 Ha echetaghị aka ya,+Ha echetaghịkwa ụbọchị ọ gbapụtara ha n’aka onye mmegide,+
43 Otú o si mee ihe ịrịba ama ya n’Ijipt,+Rụọkwa ọrụ ebube ya n’ala Zoan;+
44 Na otú o si mee ka ọwa mmiri nke Naịl ghọọ ọbara,+Nke mere na ha enweghị ike ịṅụ mmiri iyi ha.+
45 O wee zitere ha odudu, ka ọ na-ata ha;+Nakwa mbàrá, ka ọ laa ha n’iyi.+
46 O wee mee ka ọchịcha malite ịta ihe ubi ha,Meekwa ka igurube taa ihe ha dọgburu onwe ha n’ọrụ nweta.+
47 O wee jiri akụ́ mmiri ígwé gbuo osisi vaịn ha,+Jirikwa akụ́ mmiri ígwé gbuo osisi sịkamọ ha.+
48 O wee mee ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo anụ ndị na-eburu ha ibu,+Meekwa ka oké ahụ́ ọkụ gbuo anụ ụlọ ha.
49 O wee mee ka iwe ya nke dị ọkụ,+Oké iwe ya na amamikpe ya na ahụhụ, bịakwasị ha,+O zitekwaara ha ndị mmụọ ozi wetaara ha ọdachi.+
50 O wee kwadebere iwe ya ụzọ.+O gbochighị mkpụrụ obi ha ịnwụ;O nyefekwara ndụ ha n’aka ọrịa na-efe efe.+
51 N’ikpeazụ, o gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+Mmalite nke ike ịmụ ọmụmụ ha n’ụlọikwuu Ham.+
52 E mesịa, o mere ka ndị ya pụọ dị nnọọ ka ìgwè atụrụ,+Wee duo ha n’ala ịkpa dị ka ìgwè ewu na atụrụ.+
53 O wee na-edu ha n’enweghị ihe mere ha, egwu atụghịkwa ha;+Oké osimiri kpuchikwara ndị iro ha.+
54 O wee kpọrute ha n’ókèala ya dị nsọ,+Bụ́ ógbè a nke bụ́ ugwu ugwu, bụ́ ebe aka nri ya nwetara.+
55 O ji nwayọọ nwayọọ chụpụ mba dị iche iche n’ihi ha,+Jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe kenye ha ihe nketa,+O wee mee ka ebo dị iche iche nke Izrel biri n’ụlọ nke ha.+
56 Ha wee malite ịnwa Chineke bụ́ Onye Kasị Elu ọnwụnwa nakwa inupụrụ ya isi,+Ha edebeghịkwa ihe ncheta ya.+
57 Dị ka ndị nna nna ha, ha nọ na-alaghachi azụ, na-aghọkwa aghụghọ;+Ha gbagọrọ agbagọ dị ka ụta a na-ekwesighị ike.+
58 Ha wee jiri ebe ndị dị elu ha na-akpasu ya iwe,+Jirikwa ihe oyiyi ha a pịrị apị na-akpali ya ikwo ekworo.+
59 Chineke nụrụ ya+ wee wee oké iwe,+O wee leghara Izrel anya kpamkpam.+
60 N’ikpeazụ, ọ gbahapụrụ ụlọikwuu dị na Shaịlo,+Bụ́ ụlọikwuu o biri nke dị n’etiti ụmụ mmadụ.+
61 O wee kwe ka a dọrọ ike ya n’agha,+Kwekwa ka onye mmegide weghara ịma mma ya.+
62 O wee na-enyefe ndị ya n’aka mma agha,+O wesokwara ihe nketa ya oké iwe.+
63 Ọkụ regburu ụmụ okorobịa ya,A jaghịkwa ụmụ agbọghọ ya mma.+
64 E jikwa mma agha gbuo ndị nchụàjà ya,+Ndị inyom ha di ha nwụrụ ebeghịkwa ákwá.+
65 Jehova wee teta dị ka à ga-asị na o si n’ụra,+Dị ka dike nke mmanya pụrụ n’anya.+
66 O wee si n’azụ gbuo ndị na-emegide ya;+O mere ka ha nwee nkọcha ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+
67 O wee jụ ụlọikwuu Josef;+Ọ họrọghịkwa ebo Ifrem.+
68 Kama ọ họọrọ ebo Juda,+Bụ́ Ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ n’anya.+
69 O wee malite iwu ebe nsọ ya dị nnọọ ka ebe dị elu,+Dị ka ụwa nke ọ tọrọ ntọala ya ka ọ dịruo mgbe ebighị ebi.+
70 O wee họrọ ohu ya bụ́ Devid,+O wee si n’ogige anụ ụlọ kpọrọ ya.+
71 N’ebe ọ na-edugharị nne anụmanụ ndị na-enye ụmụ ara+Ka o si kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye na-azụ Jekọb bụ́ ndị ya,+Na Izrel bụ́ ihe nketa ya, dị ka atụrụ.+
72 O wee jiri ezi obi malite ịzụ ha dị ka atụrụ,+Jirikwa nkà ya na-edu ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ò nwere ike ido tebụl n’usoro n’ala ịkpa a?”