Abụ Ọma 77:1-20

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Jedutọn. Abụ ọma Esaf.+ Abụ olu ụtọ. 77  M ga-eji olu m tikuo Chineke,+M ga-eji olu m tikuo Chineke, ọ ga-egekwa m ntị.+   Achọrọ m Jehova n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ.+Agbatịwo m aka n’abalị, ọ kụnwụghịkwa akụnwụ;Mkpụrụ obi m ekweghị ka a kasie ya obi.+   M ga-echeta Chineke, obi agaghịkwa ezu m ike;+M ga-echegbu onwe m, ike ga-agwụkwa mmụọ m.+ Sila.   I jidewo mbubere anya m;+Ahụ́ erughị m ala, apụghịkwa m ikwu okwu.+   Echebarawo m oge dị anya gara aga echiche,+Chebarakwa afọ ndị a na-amaghị ama gara aga echiche.   Aga m echeta egwú m ji ụbọ akwara na-akpọ n’abalị;+M ga-echegbu onwe m n’ime obi m,+M ga-eji mmụọ m tụgharịa uche nke ọma.   Jehova ọ̀ ga-ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi,+Ọ̀ bụ na ihe anyị agakwaghị amasị ya ọzọ?+   Obiọma* ya ọ̀ kwụsịwo ruo mgbe ebighị ebi?+Okwu ya ọ̀ ghọọla ihe efu+ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ?   Chineke ò chefuwo ime amara,+Ka ò jiriwo iwe kwụsị ime ebere ya?+ Sila. 10  M̀ ga-asị: “Ọ bụ ihe a bụ ihe na-amapu m afọ,+Onye Kasị Elu agbanwewo otú o si eji aka nri ya emeso anyị”?+ 11  M ga-echeta ihe niile Jaa mere;+N’ihi na m ga-echeta ihe dị ịtụnanya i mere n’oge dị anya gara aga.+ 12  M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị dum,+M ga na-echebara ihe niile i mere echiche.+ 13  Chineke, ụzọ gị dị n’ebe nsọ.+Ònye bụ Chi ukwu dị ka Chineke?+ 14  Ọ bụ gị bụ ezi Chineke, onye na-eme ihe dị ebube.+I mewo ka a mata ike gị n’etiti ndị dị iche iche.+ 15  I jiriwo ogwe aka gị gbapụta ndị gị,+Bụ́ ụmụ Jekọb na ụmụ Josef. Sila. 16  Mmiri ahụwo gị, Chineke,Mmiri ahụwo gị; o wee malite inwe oké ihe mgbu.+Ogbu mmiri dị iche iche malitekwara ime mkpatụ.+ 17  Mmiri esiwo n’ígwé ojii zosie ike;+Ígwé ojii emewo mkpọtụ.Akụ́ gị wee na-aga aghara aghara.+ 18  Ụda égbè eluigwe gị dị ka ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya;+Àmụ̀mà emewo ka ìhè dị n’elu ala;+Ụwa mere mkpatụ, malitekwa ịma jijiji.+ 19  Ụzọ gafere n’etiti oké osimiri,+Ụzọ gị gafekwara n’etiti ọtụtụ mmiri;A matabeghịkwa nzọụkwụ gị. 20  I si n’aka Mozis na Erọn+Duo ndị gị dị nnọọ ka ìgwè ewu na atụrụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”