Abụ Ọma 76:1-12

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke ụbọ akwara. Abụ olu ụtọ. Abụ ọma Esaf.+ Abụ. 76  A maara Chineke n’ime Juda;+Aha ya dị ukwuu n’Izrel.+   Ọ bụkwa na Selem ka ụlọ ya dị,+Ebe obibi ya dịkwa na Zayọn.+   N’ebe ahụ ka ọ gbajisịrị akụ́ ụta na-enwu ọkụ,+Ọta na mma agha nakwa ngwá agha.+ Sila.   Ìhè ekpuchiwo gị, ị dị ebube karịa ugwu dị iche iche anụ ọhịa jupụtara.+   E bukọrọwo ihe ndị nwere obi ike,+Ha erowo ụra wee rahụ,+Ọ dịghịkwa otu n’ime ndị dike niile nke hụrụ aka o ji eme ihe.+   N’ihi ịba mba gị, Chineke Jekọb, oké ụra eburula ma onye na-anya ụgbọ ịnyịnya ma ịnyịnya.+   Gị onwe gị bụ onye a na-atụ egwu,+Ònye pụrụ iguzo n’ihu gị n’ihi oké iwe gị?+   I si n’eluigwe mee ka a nụrụ okwu ikpe;+Ụwa tụrụ egwu wee nọrọ jụụ+   Mgbe Chineke biliri ikpe ikpe,+Iji zọpụta ndị niile dị umeala n’obi nọ n’ụwa.+ Sila. 10  N’ihi na ọnụma mmadụ ga-eto gị;+Ị ga-eke ọnụma fọrọ afọ n’úkwù. 11  Kwenụ Jehova bụ́ Chineke unu nkwa ma mezuo ya, unu niile ndị gbara ya gburugburu.+Jirinụ egwu weta onyinye.+ 12  Ọ ga-eweda mpako ndị ndú ala;+Ọ bụ onye ndị eze ụwa na-atụ egwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji