Abụ Ọma 72:1-20
Banyere Sọlọmọn.
72 Chineke, biko, mee ka eze mara mkpebi ikpe gị,+Meekwa ka nwa eze mara ezi omume gị.+
2 Ka o jiri ezi omume kpechite ọnụ ndị gị,+Ka o jirikwa ikpe ziri ezi kpechite ọnụ ndị gị nọ n’ahụhụ.+
3 Ka ugwu ukwu na ugwu nta bugara ndị gị udo,+Bụ́ nke e nwetara site n’ezi omume.
4 Ka o kpechitere ndị nọ n’ahụhụ n’etiti ndị gị ọnụ ha,+Ka ọ zọpụta ụmụ onye ogbenye,Ka o gwepịakwa onye nrigbu.
5 Ha ga na-atụ egwu gị ogologo oge niile anyanwụ dị,+Nakwa ogologo oge niile ọnwa dị, site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+
6 Ọ ga-agbadata dị ka mmiri ozuzo si ezokwasị ahịhịa a sụrụ asụ,+Dị ka oké mmiri ozuzo nke na-ede ala.+
7 N’oge ọchịchị ya, onye ezi omume ga na-ama pokopoko,+Udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị.+
8 Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị malite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,+Malitekwa n’Osimiri Yufretis+ ruo na nsọtụ ụwa.+
9 Ndị bi n’ebe mmiri na-adịghị ga-akpọ isiala n’ihu ya,+Ndị iro ya ga-arachakwa ájá.+
10 Ndị eze Tashish na ndị eze agwaetiti dị iche iche+—Ha ga-atụ ụtụ.+Ndị eze Shiba na ndị eze Siba—Ha ga-eweta onyinye.+
11 Ndị eze niile ga-akpọrọ ya isiala;+Mba niile ga-ejekwara ya ozi.+
12 N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka,+Nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.+
13 Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere,+Ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.+
14 Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike,Ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.+
15 Ya dịrị ndụ,+ ka e nyekwa ya ụfọdụ n’ime ọlaedo Shiba.+Ka a na-ekpekwa ekpere n’ihi ya mgbe niile;Ka ọ bụrụ onye a gọziri agọzi ogologo ụbọchị dum.+
16 Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa;+Ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.+Mkpụrụ ya ga na-eme nke ọma dị ka osisi ndị dị na Lebanọn,+Ndị nọ n’obodo ya ga na-ama pokopoko dị ka ihe a kụrụ n’ala.+
17 Ka aha ya dịruo mgbe ebighị ebi;+Ka aha ya dị ukwuu ruo ogologo oge niile anyanwụ dị,Ka ha site n’aka ya gọzie onwe ha;+Ka mba niile kpọọ ya onye obi ụtọ.+
18 Ka Jehova Chineke, bụ́ Chineke Izrel, bụrụ onye a gọziri agọzi,+Onye naanị ya na-arụ ọrụ dị ebube.+
19 Ka aha ya nke dị ebube bụrụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi,+Ka ebube ya jupụtakwa ụwa dum.+Amen na Amen.
20 Ekpere Devid nwa Jesi+ agwụla.