Abụ Ọma 71:1-24

71  Jehova, agbabawo m n’ime gị.+Biko, ekwela ka ihere mee m.+   N’ihi ezi omume gị, biko, napụta m ma meere m ụzọ mgbapụ.+Tọọrọ m ntị n’ala ma zọpụta m.+   Ghọọrọ m oké nkume siri ike ebe m ga na-agbaba mgbe niile.+Biko, nye iwu ka a zọpụta m,+N’ihi na ị bụ nkume m dị elu nakwa ebe m e wusiri ike.+   Chineke m, biko, meere m ụzọ m ga-esi gbapụ n’aka onye ajọ omume,+N’ọbụ aka onye na-eme ihe na-ezighị ezi, nke na-emegbukwa mmadụ.+   N’ihi na gị onwe gị, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ olileanya m+ na obi ike m malite n’oge m bụ nwata.+   Ọ bụ n’ebe ị nọ ka m dabeere malite n’oge m nọ n’afọ;+Ọ bụ Gị kewapụtara m n’afọ nne m.+Ọ bụ gị ka m na-enye otuto mgbe niile.+   Adịzi m ka ọrụ ebube n’anya ọtụtụ ndị;+Ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.+   Ọnụ m jupụtara n’otuto gị,+Na-akọkwa ịma mma gị ogologo ụbọchị dum.+   Ajụla m mgbe m mere agadi;+Mgbe ike na-adịkwaghị m, ahapụla m.+ 10  N’ihi na ndị iro m ekwuwo banyere m,+Ndị na-echebiri mkpụrụ obi m agbawo izu,+ 11  Sị: “Chineke ahapụwo ya.+Chụwa ya jide ya, n’ihi na ọ dịghị onye ga-anapụta ya.”+ 12  Chineke, biko, anọla m n’ebe dị anya.+Chineke m, biko, bịa ọsọ ọsọ nyere m aka.+ 13  Ka ihere mee ndị na-emegide mkpụrụ obi m, ka ha laa n’iyi.+Ka ndị na-achọ ka ọdachi dakwasị m yiri nkọcha na mmechuihu dị ka uwe.+ 14  Ma mụ onwe m ga na-echere mgbe niile,+M ga-emekwa ka otuto dum m na-enye gị bukwuo ibu. 15  Ọnụ m ga-akọ ezi omume gị,+Kọọkwa nzọpụta gị ogologo ụbọchị dum,+N’ihi na amaghị m ole ha dị.+ 16  Ọkaakaa+ Onyenwe anyị Jehova, m ga-abịa kọọ oké ịdị ike gị;+M ga-ekwu banyere ezi omume gị, bụ́ naanị ezi omume nke gị.+ 17  Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata,+Ruo ugbu a, anọ m na-akọ banyere ọrụ gị dị ebube.+ 18  Chineke, biko, ahapụla m ruo ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́,+Ruo mgbe m kọọrọ ọgbọ ọzọ banyere ogwe aka gị,+Kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ịdị ike gị.+ 19  Chineke, ezi omume gị dị ruo n’ebe dị elu;+A bịa n’oké ihe ndị i mere,+Chineke, ònye dị ka gị?+ 20  N’ihi na i mewo ka m nwee ọtụtụ ahụhụ na ọdachi,+Mee ka m gbakee ọzọ;+Sikwa n’ogbu mmiri ndị dị n’ụwa gụpụta m ọzọ.+ 21  Mee ka m dịkwuo ukwuu,+Gbaa m gburugburu ma kasie m obi.+ 22  Mụ onwe m kwa ga-eji ụbọ akwara too gị,+Aga m eto eziokwu gị, Chineke m.+Aga m eji une bụkuo gị abụ olu ụtọ, gị Onye Nsọ Izrel.+ 23  Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m chọrọ ịbụku gị abụ olu ụtọ,+Ee, mkpụrụ obi m nke ị napụtaworo ga-etikwa mkpu ọṅụ.+ 24  Ire m ga-akọkwa banyere ezi omume gị n’olu dị ala ogologo ụbọchị dum,+N’ihi na ihere emewo ndị na-achọ ka ọdachi dakwasị m, n’ihi na e mechuwo ha ihu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji