Abụ Ọma 69:1-36

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Okooko Lili.+ Abụ ọma Devid. 69  Chineke, biko zọpụta m, n’ihi na mmiri na-achọ iri mkpụrụ obi m.+   Emikpuwo m n’ime apịtị miri emi, n’ebe ala m ga-azọkwasị ụkwụ na-adịghị.+Abawo m n’ime ogbu mmiri,Mmiri na-asọ asọ eburuwo m.+   Etigidela m mkpu, ike gwụ m;+Olu agụwo m.Anya m adịkwaghị ahụ ụzọ ebe m nọ na-echere Chineke m.+   Ndị kpọrọ m asị na nkịtị adịwo ọtụtụ ọbụna karịa ntutu isi m.+Ndị chọrọ igbu m, ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha, adịwo ọtụtụ.+M wee nye ha ihe m na-apụnaraghị apụnara.   Chineke, gị onwe gị maara nzuzu m,E zonahụghị gị ikpe ọmụma m.+   Ekwela ka ihere m mee ndị nwere olileanya n’ebe ị nọ,+Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha.+Chineke Izrel,+Ekwela ka e menye ndị na-achọ gị ihere n’ihi m.+   N’ihi na a na-akọcha m n’ihi gị,+Ihere ejuwo m ihu.+   Aghọwo m onye e kewapụrụ n’ebe ụmụnne m nọ,+Aghọwokwa m onye mba ọzọ nye ndị nne ji mụ na ha.+   N’ihi na ekworo maka ụlọ gị eripịawo m,+Eburuwo m nkọcha nke ndị mmadụ na-akọcha gị.+ 10  M wee kwaa ákwá, mee ka mkpụrụ obi m buo ọnụ,+Ma ọ ghọrọ ihe a ga-eji kọchaa m.+ 11  Mgbe m ji ákwà iru uju mere uwe,M wee ghọọrọ ha ihe e ji atụ ilu.+ 12  Ndị nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá malitere ikwu banyere m,+Abụkwa m onye ndị aṅụrụma ji agụ egwú.+ 13  Ma ọ bụ gị, Jehova, ka m kpekuru ekpere, +N’oge ị pụrụ ịnụrụ ya, Chineke.+Za m n’ihi obiọma* gị dị ukwuu, wee gosi na ị bụ onye nzọpụta n’eziokwu.+ 14  Dọpụta m n’apịtị, ka m wee ghara imikpu.+Biko, napụta m n’aka ndị kpọrọ m asị,+ dọpụtakwa m na mmiri dị ogbu.+ 15  Ekwela ka iyi na-asọ asọ buru m,+Ma ọ bụ, ka mmiri dị ogbu rie m,Ma ọ bụ, ka olulu loo m.+ 16  Jehova, biko, za m, n’ihi na obiọma gị dị mma.+Chee ihu n’ebe m nọ dị ka ebere gị si dị ukwuu,+ 17  Ewepụla ihu gị n’ebe ohu gị nọ.+Za m ngwa ngwa n’ihi na m nọ n’oké ihe isi ike.+ 18  Bịaruo mkpụrụ obi m nso, napụta ya;+Napụta m n’ihi ndị iro m. 19  Gị onwe gị maara nkọcha m na ihere m nakwa mweda n’ala m.+Ndị niile na-ebuso m iro nọ n’ihu gị.+ 20  Nkọcha etiwaala m obi, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.+Anọ m na-atụ anya ka mmadụ meere m ebere, ma ọ dịghị onye meere m ebere;+Na-atụkwa anya ndị nkasi obi, ma o nweghị onye m hụrụ.+ 21  Kama ha nyere m ahịhịa na-egbu mmadụ ka m taa,+Ha nwakwara ime ka m ṅụọ mmanya gbara ụka mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ.+ 22  Ka tebụl nke dị n’ihu ha ghọọ ọnyà,+Ka ihe ọ bụla bụ́ maka ọdịmma ha ghọọkwa ọnyà.+ 23  Ka anya gbaa ha ọchịchịrị ka ha ghara ịhụ ụzọ;+Meekwa ka úkwù na-ama ha jijiji mgbe niile.+ 24  Wụkwasị ha oké iwe gị,+Ka iwe gị nke dị ọkụ bịakwasịkwa ha.+ 25  Ka ebe ha mara ụlọikwuu nke nwere mgbidi tọgbọrọ n’efu;+Ka onye ọ bụla ghara ibi n’ụlọikwuu ha.+ 26  N’ihi na ha na-achụ onye gị onwe gị tiri ihe otiti ọsọ,+Ha na-akọkwa akụkọ ihe mgbu nke ndị ị mapuru ahụ́. 27  Tụkwasị njehie ná njehie ha,+Ka ha gharakwa ịbata n’ezi omume gị.+ 28  Ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndị dị ndụ,+Ka a gharakwa ide aha ha n’ebe e dere aha ndị ezi omume.+ 29  Ma anọ m n’ahụhụ, ahụ́ dum na-egbukwa m mgbu.+Chineke, biko, ka nzọpụta gị chebe m.+ 30  M ga-eji abụ too aha Chineke,+M ga-ejikwa ekele too ya.+ 31  Nke a ga-atọ Jehova ụtọ karịa oké ehi,+Karịa nwa oké ehi nwere mpi, nke ụkwụ ya wara njakpa.+ 32  Ndị dị umeala n’obi ga-ahụ ya; ha ga-aṅụrị ọṅụ.+Unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu dị ndụ.+ 33  N’ihi na Jehova na-ege ndị ogbenye ntị,+Ọ gaghịkwa eleghara ndị ya nọ n’ụlọ mkpọrọ anya.+ 34  Ka eluigwe na ụwa too ya,+Ka oké osimiri na ihe niile na-agagharị n’ime ya+ too ya. 35  N’ihi na ọ bụ Chineke ga-azọpụta Zayọn,+Wuokwa obodo dị iche iche nke Juda;+Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ, o wee ghọọ nke ha.+ 36  Ọ bụkwa ụmụ ndị ohu ya ga-eketa ya,+Ọ bụkwa ndị hụrụ aha ya n’anya ga-ebi n’ime ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”