Abụ Ọma 68:1-35

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ, abụ. 68  Ka Chineke bilie,+ ka a chụsaa ndị iro ya,+Ka ndị kpọrọ ya oké asị gbaa ọsọ n’ihi ya.+   Chụsaa ha dị ka ifufe si efesasị anwụrụ ọkụ;+Dị ka ọkụ si eme ka mgbá aṅụ gbazee,+Ka ndị ajọ omume laa n’iyi ghara ịnọkwa n’ihu Chineke.+   Ma, ka ndị ezi omume ṅụrịa ọṅụ,+Ka ha nwee ọṅụ n’ihu Chineke,+Ka ha jirikwa ọṅụ na-awụli elu.+   Bụkuonụ Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ olu ụtọ;+Bụkuonụ Onye ahụ nke na-agbafe na mbara ọzara abụ,+Dị ka Jaa, nke bụ́ aha ya;+ ṅụrịakwanụ ọṅụ n’ihu ya;   Nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ+Ka Chineke bụ n’ebe obibi ya dị nsọ.+   Chineke na-eme ka ndị nọ naanị ha biri n’ụlọ;+Ọ na-atọhapụ ndị mkpọrọ, meekwa ka ha baa ọgaranya.+Ma ndị isi ike ga-ebi n’ala kpọrọ nkụ.+   Chineke, mgbe i buteere ndị gị ụzọ,+Mgbe ị zọrọ ije gafere n’ọzara+Sila   Ala mara jijiji,+Chineke mekwara ka mmiri si n’eluigwe zoo;+Chineke, bụ́ Chineke Izrel+ mere ka Saịnaị nke a maa jijiji.+   Chineke, i mere ka mmiri malite izosi ike;+Ọbụna mgbe ihe nketa gị dara mbà—gị onwe gị na-eme ka o nweta ume.+ 10  Ụlọikwuu gị+—ha ebiriwo n’ime ya;+Chineke, i ji ịdị mma gị kwadebere ya onye nọ n’ahụhụ.+ 11  Ọ bụ Jehova kwuru okwu;+Ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.+ 12  Ọbụna ndị eze nke ìgwè ndị agha dị iche iche na-agba ọsọ, ha na-agba ọsọ.+Nwaanyị nke nọ n’ụlọ na-esokwa eketa ihe a kwatara n’agha.+ 13  Ọ bụ ezie na unu dina n’akụkụ ikpo ntụ,A ga-enwe nduru e ji ọlaọcha kpuchie nku ya,Nke e jikwa ọlaedo na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na odo odo kpuchie ábụ́bà ya.+ 14  Mgbe Onye Pụrụ Ime Ihe Niile chụsasịrị ndị eze nọ n’ime ya,+Snoo malitere ịda na Zalmọn.+ 15  Ógbè Beshan nke bụ́ ugwu ugwu+ bụ ugwu Chineke;+Ógbè Beshan nke bụ́ ugwu ugwu bụ ugwu nke nwere ọtụtụ ọnụ pịrị apị.+ 16  Unu ugwu ndị nwere ọtụtụ ọnụ pịrị apị, gịnị mere unu ji na-eleUgwu Chineke nwere mmasị ibi na ya anya ọjọọ?+Jehova ga-ebi n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.+ 17  Ụgbọ ịnyịnya agha Chineke dị iri puku kwuru iri puku, puku kwuru puku.+Jehova esiwo na Saịnaị bata n’ebe nsọ ya.+ 18  Jaa bụ́ Chineke, ị rịgowo n’elu;+Ị dọrọwo ọtụtụ ndị n’agha;+Ị narawo onyinye n’ụdị mmadụ,+Ee, ọbụna ndị isi ike,+ ka i wee biri n’etiti ha.+ 19  Ka Jehova, bụ́ onye na-eburu anyị ibu anyị kwa ụbọchị,+ bụrụ onye a gọziri agọzi,Ezi Chineke nke nzọpụta anyị.+ Sila. 20  Ezi Chineke bụụrụ anyị Chineke nke na-enye nzọpụta;+Ọ bụkwa n’aka Jehova bụ́ Ọkaakaa+ Onyenwe anyị ka ụzọ e si alanahụ ọnwụ dị.+ 21  N’ezie, Chineke ga-akụri isi ndị iro ya,+Bụ́ opu isi nke ntutu jupụtara, nke onye na-ejegharị wee na-ewetara onwe ya amamikpe.+ 22  Jehova kwuru, sị: “M ga-esi na Beshan kpọghachite ha,+M ga-esi n’ala ala oké osimiri kpọghachite ha,+ 23  Ka i wee jiri ọbara saa ụkwụ gị,+Ka ire nkịta gị niile wee keta òkè n’ọbara ndị iro.”+ 24  Chineke, ha ahụwo ìgwè ndị so gị n’azụ,+Bụ́ ndị so Chineke m, bụ́ Eze m, n’azụ na-abanye n’ebe nsọ ya.+ 25  Ndị na-abụ abụ nọ n’ihu, ndị na-akpọ ụbọ akwara so ha n’azụ;+Ụmụ agbọghọ na-akụ obere ịgbà nọkwa n’agbata ha.+ 26  Unu ndị nwetara ndụ site n’Isi Iyi nke Izrel, gọzienụ Chineke, bụ́ Jehova,+N’etiti ìgwè zukọrọ ọnụ.+ 27  Benjamin nke dị ntakịrị, nke na-emeri ha, nọkwa ya,+Tinyere ndị isi Juda nakwa ìgwè ha ndị na-eti mkpu,Na ndị isi Zebulọn na ndị isi Naftalaị.+ 28  Chineke gị enyewo iwu ka ike gị pụta ìhè.+Chineke, biko, gosi ike gị, gị onye meworo ihe n’ihi anyị.+ 29  Ndị eze ga-ewetara gị onyinye+N’ihi ụlọ nsọ gị nke dị na Jeruselem.+ 30  Baara anụ ọhịa nke nọ n’etiti ahịhịa amị mba,+ bụ́ ìgwè oké ehi,+Nakwa ụmụ ehi nke ndị dị iche iche, nke ọ bụla na-azọtọ iberibe ọlaọcha.+Ọ chụsawo ndị ịlụ ọgụ na-atọ ụtọ.+ 31  Arịa ndị e ji ọla nchara mee ga-esi n’Ijipt pụta;+Kush ga-amatị aka ngwa ngwa nye Chineke onyinye.+ 32  Unu alaeze dị iche iche nke ụwa, bụkuonụ Chineke abụ,+Bụkuonụ Jehova abụ olu ụtọ—Sila 33  Bụkuonụ Onye ahụ abụ, bụ́ Onye nọkwasịrị n’eluigwe nke eluigwe dị ka ịnyịnya,+ bụ́ eluigwe dịwara kemgbe oge ochie.Lee! Ọ na-eme ka olu ya, bụ́ olu dị ike, daa ụda.+ 34  Kwuonụ na ọ bụ Chineke nwe ike.+Ọ bụ ya na-achị Izrel, ike ya dịkwa n’ígwé ojii.+ 35  Chineke dị egwu n’ebe nsọ ya dị ebube.+Ọ bụ Chineke Izrel nke na-enye ndị ya ike na ume.+Ka Chineke bụrụ onye a gọziri agọzi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji